< 2 Samuele 23 >

1 Tala maloba ya suka ya Davidi: Maloba ya Davidi, mwana mobali ya Izayi, moto oyo atombolama na bokonzi, mopakolami ya Nzambe ya Jakobi, moyembi malamu ya banzembo ya Isalaele:
Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru: “Okwu pụrụ iche si nʼọnụ Devid, nwa Jesi, ihe si nʼọnụ nwoke ahụ Chineke Onye kachasị ihe niile elu buliri elu. Nwoke ahụ onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ, onye bụ ọka nʼịbụ abụ nʼala Izrel.
2 « Molimo na Yawe alobi na nzela na ngai, atie maloba na Ye na monoko na ngai.
“Mmụọ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ m, okwu ya dịkwa m nʼire.
3 Nzambe oyo azali Libanga ya Isalaele ayebisi ngai: ‹ Mokonzi oyo akambaka bato kati na bosembo mpe botosi epai ya Nzambe,
Chineke Izrel kwuru okwu, Oke nkume Izrel sịrị m, ‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume, mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke.
4 azali lokola pole ya tongo, tango moyi ebimaka mpe engalaka makasi lokola nde mapata ezali te, lokola kongenga ya sima na mvula oyo ebimisaka matiti na mokili. ›
Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị. Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’
5 Ezali bongo te mpo na libota na ngai liboso ya Nzambe, pamba te asalaki boyokani ya libela elongo na ngai, boyokani oyo esalema malamu na makambo nyonso, mpe oyo Ye moko abatelaka? Tango nyonso mpe na makambo nyonso, apesaki ngai elonga mpe akokisaki posa ya motema na ngai.
“Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ. Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya, Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile. Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke. Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile.
6 Kasi bato nyonso ya kilikili bazali lokola nzete ya nzube oyo babwakaka mosika; basimbaka yango te na maboko pamba.
Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu, nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta.
7 Moto oyo alingi kosimba yango asengeli kosalela ebende to libaya ya likonga; batumbaka yango kaka na esika oyo ezali. »
Onye ọbụla metụrụ ogwu aka, bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe. A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.”
8 Tala bakombo ya basoda ya mpiko ya Davidi: Yoshebi-Bashebeti, moto ya Takimoni: azalaki mokonzi ya limpinga ya basoda misato ya mpiko, abomaki na likonga bato nkama mwambe na etumba moko.
Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere: Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
9 Molandi na ye ezalaki Eleazari, mwana mobali ya Dodo, moto ya Aoyi: azalaki moko kati na limpinga ya basoda misato ya mpiko oyo, elongo na Davidi, babundisaki bato ya Filisitia oyo basanganaki mpo na bitumba, wana bana ya Isalaele bazalaki kokima na likolo ya bangomba.
Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha. Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ,
10 Kasi ye ayikaki mpiko kati na bitumba mpe abomaki bato ya Filisitia kino alembaki, mpe loboko na ye etikaki mopanga te. Yawe apesaki bango elonga monene na mokolo wana. Mampinga bazongaki epai ya Eleazari kaka mpo na kokamata biloko ya bato oyo bakufaki.
ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. Onyenwe anyị nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ.
11 Sima na ye, Shama, mwana mobali ya Age, moto ya Arari. Tango bato ya Filisitia basanganaki na Leyi epai wapi ezalaki na elanga moko etonda na misili, basoda ya Isalaele bakimaki liboso na bango.
Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ.
12 Kasi Shama atelemaki na kati-kati ya elanga, abundelaki yango mpe abomaki bato ya Filisitia. Yawe apesaki bango elonga monene.
Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
13 Mokolo moko, na ebandeli ya eleko ya kobuka bambuma, wana basoda ya bato ya Filisitia batongaki molako na bango kati na lubwaku ya Refayimi, basoda misato kati na basoda tuku misato ya mpiko bayaki epai ya Davidi, na ebombamelo ya mabanga ya Adulami.
Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
14 Na tango yango, Davidi azalaki kati na ebombamelo moko batonga makasi, mpe basoda ya Filisitia bazalaki na Beteleemi.
Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha Filistia dị na Betlehem.
15 Mbala moko, Davidi ayokaki posa ya mayi mpe alobaki: « Nani akomemela ngai mayi ya libulu oyo ezali pene ya ekuke ya Beteleemi mpo ete namela? »
Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”
16 Basoda nyonso misato ya mpiko bakotaki na mayele kati na molako ya bato ya Filisitia, batokaki mayi na libulu oyo ezali pene ya ekuke ya Beteleemi mpe bamemaki yango epai ya Davidi. Kasi Davidi aboyaki komela mayi yango; asopaki yango na mabele lokola likabo ya masanga mpo na Yawe.
Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.
17 Alobaki: « Tika ete Yawe apesa ngai etumbu soki nameli mayi oyo, pamba te ezali lokola makila ya bato oyo bandimaki kokende kokufa mpo na ngai. » Boye, Davidi aboyaki komela mayi yango. Yango nde misala ya kokamwa oyo basoda misato ya mpiko basalaki.
Ọ sịrị, “Ya bụrụ m ihe arụ, Onyenwe anyị, na m ga-eme nke a. Nke a ọ bụghị ọbara ndị ikom a, ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
18 Abishayi, ndeko mobali ya Joabi mpe mwana mobali ya Tseruya, azalaki mokonzi ya basoda misato ya mpiko. Abundisaki bato nkama misato na likonga na ye mpe abomaki bango. Boye, kati na bango misato, ye nde akendeki sango koleka.
Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.
19 Kati na basoda misato ya mpiko, ye nde azwaki lokumu koleka mpe akomaki mokonzi na bango, kasi akokanaki te na basoda misato ya limpinga ya liboso.
Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
20 Benaya, moto ya mboka Kabitseli mpe mwana mobali ya Yeoyada, azalaki soda ya mpiko mpe asalaki makambo ebele ya kokamwa: abomaki bilombe mibale ya Moabi; mpe na mokolo ya mvula ya pembe, akitaki na libulu moko ya mayi mpe abomaki kuna nkosi.
Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.
21 Ye mpe moto abomaki mbinga mobali moko ya Ejipito, oyo asimbaki likonga na loboko na ye. Abundisaki moto yango ya Ejipito na lingenda, abotolaki ye likonga oyo azalaki na yango na loboko mpe abomaki ye na likonga na ye moko.
O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya
22 Yango nde misala ya kokamwa oyo Benaya, mwana mobali ya Yeoyada, asalaki. Ye mpe akendeki sango kati na basoda misato ya mpiko ya lisanga ya mibale.
Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ.
23 Kati na basoda tuku misato ya mpiko, ye nde azalaki na lokumu monene koleka, kasi akokanaki te na basoda misato ya mpiko ya limpinga ya liboso. Mpe Davidi akomisaki ye mokonzi ya bakengeli na ye.
A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
24 Kati na lisanga ya bato tuku misato, ezalaki mpe na: Asaeli, ndeko mobali ya Joabi; Elanani, mwana mobali ya Dodo, moto ya Beteleemi;
Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ: Asahel, nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo, onye Betlehem
25 Shama mpe Elika, bato ya Arodi;
Shama, onye Harod, Elika, onye Harod,
26 Eletsi, moto ya Peleti; Ira, mwana mobali ya Ikeshi, moto ya Tekoa;
Helez onye Palti, Ira, nwa Ikesh, onye Tekoa,
27 Abiezeri, moto ya Anatoti; Mebunayi, moto ya Usha;
Abieza, onye Anatot, Mebunai, onye Husha,
28 Tsalimoni, moto ya Aoyi; Maarayi, moto ya Netofa;
Zalmon, onye Ahohi, Maharai, onye Netofa,
29 Elebi, mwana mobali ya Baana, moto ya Netofa; Itayi, mwana mobali ya Ribayi, moto ya Gibea ya libota ya Benjame;
Heled, nwa Baana, onye Netofa, Itai, nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin,
30 Benaya, moto ya Piratoni; Idayi, moto ya mabwaku ya Gashi;
Benaya, onye Piraton, Hidaị, nke si nʼakụkụ iyi dị na Gaash,
31 Abi-Aliboni, moto ya Beti-Ariba; Azimaveti, moto ya Baarumi;
Abi-Albon, onye Arba, Azmavet, onye Bahurim
32 Eliaba, moto ya Shaaliboni; Bana mibali ya Yasheni; Jonatan,
Eliaba, onye Shaalbon, Ụmụ Jashen, Jonatan
33 Shama, moto ya Arari; Ayami, mwana mobali ya Sharari, moto ya Arari;
nwa Shama, onye Hara Ahiam, nwa Shara nke Hara,
34 Elifeleti, mwana mobali ya Aasibayi, mwana mobali ya Maakati; Eliami, mwana mobali ya Ayitofeli, moto ya Gilo;
Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka, Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo,
35 Etsirayi, moto ya Karimeli; Paarayi, moto ya Arabi;
Hezro, onye Kamel, Paraị, onye Aaba,
36 Yigali, mwana mobali ya Natan, moto ya Tsoba; Bani, moto ya Gadi;
Igal nwa Netan, onye Zoba, nwa Hagri,
37 Tseleki, moto ya Amoni; Naarayi, moto ya Beyeroti, oyo azalaki komema bibundeli ya Joabi, mwana mobali ya Tseruya;
Zelek, onye Amọn, Naharai, onye Beerọt, onye na-ebu ihe agha Joab nwa Zeruaya,
38 Ira mpe Garebi, bato ya Yeteri;
Ira, onye Itra, Gareb, onye Itra
39 mpe Iri, moto ya Iti. Na kosangisa, bango nyonso bazalaki tuku misato na sambo.
na Ụraya, onye Het. Ha niile dị iri ndị ikom atọ na asaa.

< 2 Samuele 23 >