< 2 Bakonzi 7 >

1 Elize alobaki: — Boyoka Liloba na Yawe! Tala makambo oyo Yawe alobi: « Lobi, na tango oyo, na ekuke ya Samari, bakoteka bakilo zomi na mibale ya farine na motuya ya mbongo moko ya ebende ya palata, mpe bakilo tuku mibale ya orje na motuya kaka wana. »
Ịlaisha zara sị ya, “Nụrụ okwu Onyenwe anyị. Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Nʼoge dịka mgbe a echi, a ga-ere otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, rekwaa akpa nta ọka balị abụọ otu shekel nʼọnụ ụzọ ama obodo Sameria.”
2 Mokonzi ya basoda, oyo mokonzi ya Isalaele azalaki kotiela motema alobaki na moto na Nzambe: — Tala, ata soki Yawe afungoli maninisa ya Lola, likambo ya boye ekoki penza kosalema? Elize azongisaki: — Okomona yango na miso na yo, kasi okolia yango te.
Ọchịagha ahụ, nke eze na-adabere nʼaka ya, sịrị onye nke Chineke, “Lee, a sịkwarị na Onyenwe anyị emeghee oghere idee nke eluigwe, nke a ọ pụrụ ime?” Ma Ịlaisha zara ya, “Ị ga-eji anya gị abụọ hụ ya, ma ị gaghị eri site nʼime ya.”
3 Na ekuke ya engumba, ezalaki na bato minei na maba. Bazalaki kolobana bango na bango: « Mpo na nini totikala awa kino tokokufa?
Nʼoge a, e nwere ndị ekpenta anọ nọ nʼezi mgbidi gbara Sameria gburugburu, nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka anyị nọ nʼebe a na-eme? Ọ bụ ka anyị nọrọ nʼebe a tutu anyị anwụọ?
4 Soki tolobi: ‹ Tokota na engumba, › nzala makasi ezali kuna, tokokufa. Soki mpe totikali awa, tokokufa kaka. Boye, tika ete tokende na molako ya bato ya Siri mpe tomipesa epai na bango. Soki bayambi biso, tobiki; kasi soki babomi biso, tokufi kaka. »
Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Anyị ga-abanye nʼime obodo,’ ụnwụ dị nʼebe ahụ, anyị ga-anwụkwa. Ọ bụrụkwanụ na anyị anọgide nʼebe a anyị ga-anwụ. Ya mere ka anyị gafeenụ banye nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram, were onwe anyị nyefee ha nʼaka. Ọ bụrụ na ha edebe anyị ndụ, anyị ga-adị ndụ, ọ bụrụ na ha egbuo anyị, anyị ga-anwụkwa.”
5 Na pokwa, batelemaki mpe bakendeki na molako ya bato ya Siri. Tango bakomaki na mondelo ya molako, bamonaki ata moto moko te,
Nʼoge uhuruchi, ha biliri gaa nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram. Mgbe ha bịarutere nʼọnụ ụlọ ikwu ahụ, o nwekwaghị onye nọ nʼebe ahụ,
6 pamba te Nkolo asalaki ete bato ya Siri bayoka lokito ya bashar, ya bampunda mpe ya mampinga minene ya basoda kino balobanaki bango na bango: « Tala, mokonzi ya Isalaele azwi mokonzi ya bato ya Iti mpe mokonzi ya bato ya Ejipito mpo na koya kobundisa biso. »
nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ndị Aram nụ ụzụ ụgbọ agha na nke ịnyịnya, na nke usuu ndị agha. Nke a mere ka onye ọbụla gwa ibe ya sị, “Lee, eze ndị Izrel egoola ndị agha ndị Het, na ndị eze Ijipt ibuso anyị agha.”
7 Boye batelemaki mpe bakimaki na pokwa, basundolaki bandako na bango ya kapo, bampunda na bango mpe ba-ane na bango. Batikaki molako ndenge ezalaki mpo na kobikisa bomoi na bango.
Ha biliri gbapụ ọsọ nʼabalị ahụ, hapụ ụlọ ikwu ha niile, na ịnyịnya ha niile, na ịnyịnya ibu ha niile, na ihe niile otu o si dịrị, ma gbapụ ọsọ ndụ.
8 Bato na maba bakomaki na mondelo ya molako, bakotaki na ndako moko ya kapo, baliaki mpe bamelaki. Bongo bamemaki palata, wolo, bilamba, mpe bakendeki kobomba yango. Sima, bazongaki, bakotaki na ndako mosusu ya kapo, bazwaki kuna biloko mpe bakendeki lisusu kobomba yango.
Mgbe ndị ekpenta ahụ rutere ogige ndị agha ndị Siria, ha banyere nʼime otu ụlọ rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ dị nʼime ya. Ha chịịrị ọlaọcha na ọlaedo na uwe ọma niile dị nʼime ya gaa zoo ha. Ọzọkwa, ha lọghachiri banye nʼụlọ ọzọ kwakọrọ ụfọdụ ihe dị nʼime ya gaa zoo.
9 Bongo balobanaki bango na bango: « Tozali kosala malamu te: Mokolo ya lelo ezali mokolo ya sango malamu, mpe tozali kobomba sango yango mpo na biso moko! Soki tozeli kino lobi na tongo, tokozwa etumbu. Tokende sik’oyo kopesa sango na ndako ya mokonzi. »
Ma mgbe ahụ ha sịrịtara onwe ha, “Ihe anyị na-eme ezighị ezi. Taa bụ ụbọchị oziọma, ma lee ka anyị na-agba nkịtị. Ọ bụrụ na anyị echere ruo ìhè ụtụtụ, a ga-achọpụta ajọọ omume anyị. Ugbu a bịanụ, ka anyị gaa gwa ndị nọ nʼụlọeze, ihe anyị hụrụ.”
10 Boye bakendeki, babelelaki epai ya bakengeli bikuke ya engumba mpe bayebisaki bango: « Tokotaki na molako ya bato ya Siri, moto ata moko te azali kuna, toyoki ata mongongo ya moto te; etikali kaka bampunda mpe ba-ane bakanga, mpe bandako ya kapo basundola. »
Ya mere, ha gara kpọkuo ndị nche ọnụ ụzọ obodo ahụ, gwa ha sị, “Anyị banyere nʼogige ndị agha Aram, o nweghị mmadụ ọbụla nọ nʼebe ahụ, ọ dịghị olu mmadụ anyị nụrụ nʼebe ahụ, naanị ịnyịnya na ịnyịnya ibu elibere nʼosisi, na ụlọ ikwu ha a hapụrụ dịka ha dị.”
11 Bakengeli ekuke ya engumba babengaki moto moko kati na engumba mpo na kokomisa sango na ndako ya mokonzi.
Ndị na-eche nche tiri mkpu kọọrọ ndị nọ nʼụlọeze ihe mere.
12 Mokonzi alamukaki na butu mpe alobaki na bakalaka na ye: — Tika ete nayebisa bino makambo oyo bato ya Siri basali biso. Bayebi solo ete tozali kokufa nzala, yango wana batiki milako na bango mpo na kokende kobombama na zamba. Balobani bango na bango: « Bakobima solo, mpe tokokanga bango ya bomoi, bongo tokokota na engumba. »
Eze biliri nʼabalị ahụ gwa ndịisi ọrụ ya sị, “Ka m gwa unu ihe ndị Aram mere anyị. Ha maara na anyị nọ nʼoke agụụ, nʼihi ya, ha akpacharala anya hapụ ọmụma ụlọ ikwu ha gaa zoo onwe ha nʼime ọhịa. Echiche ha bụ, ‘Ndị a ga-apụtarịrị, mgbe ahụ, anyị ga-ejide ha na ndụ, banyekwa nʼime obodo ha.’”
13 Moko kati na bakalaka na ye azongisaki: — Bongisa ndambo ya mibali mpo ete bazwa bampunda mitano kati na oyo etikali kati na engumba. Tokobungisa ata eloko moko te, pamba te suka na bango ekozala ndenge moko na oyo ya bana nyonso ya Isalaele oyo batikali na engumba. Boye totinda bango kaka mpo toyeba makambo oyo ewuti kosalema.
Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.”
14 Boye baponaki bashar mibale elongo na bampunda na yango, mpe mokonzi atindaki yango mpo na koluka mampinga ya bato ya Siri. Apesaki mitindo na batambolisi na yango: « Bokende mpe botala! »
Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.”
15 Balandaki bilembo ya makolo ya bato ya Siri kino na ebale Yordani, mpe bamonaki ete nzela nyonso etondaki na bilamba mpe bibundeli oyo basoda ya Siri babwakaki tango bakimaki na mbalakata. Bongo bantoma bazongaki mpe bapesaki sango epai ya mokonzi.
Ha sogidere ha ruo nʼosimiri Jọdan. Nʼakụkụ ụzọ niile jupụtara nʼuwe na ngwa agha ndị agha Aram tufuru mgbe ha na-eme ngwangwa. Ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri bịa kọọrọ eze ihe ha hụrụ.
16 Bongo bato ya Samari babimaki mpe bazwaki na makasi biloko kati na molako ya bato ya Siri. Boye bakomaki koteka bakilo zomi ya farine na motuya ya mbongo moko ya ebende ya palata, mpe bakilo tuku mibale ya orje na motuya ya mbongo moko ya ebende ya palata, ndenge kaka Yawe alobaki.
Ndị Izrel niile pụrụ gaa kwakọrọ ihe dị nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Aram. Nke bụ na e rere otu akpa nta ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma otu shekel, rekwaa akpa ọka balị abụọ otu shekel dịka Onyenwe anyị si kwuo.
17 Mokonzi ya Isalaele aponaki mokonzi ya basoda, oyo mokonzi agumbamaka mpo na loboko na ye, mpo na kokengela ekuke ya engumba, kasi bato banyataki ye mpe akufaki kolanda makambo oyo moto na Nzambe asakolaki tango mokonzi ayaki na ndako na ye.
Eze họpụtara ọchịagha ahụ, nke ọ na-adabere nʼaka ya, nye ya ọrụ ilekọta ọnụ ụzọ obodo ahụ. Ma ndị si nʼobodo na-enupụta nuturu ya, zọọ ya ụkwụ, zọgbuo ya mgbe ha na-agbapụta. Ọ nwụrụ dịka Ịlaisha onye nke Chineke kwuru mgbe eze bịakwutere ya ụnyaahụ, ijide ya.
18 Makambo oyo esalemaki ndenge moto na Nzambe alobaki na mokonzi: « Lobi, na tango oyo, bakoteka na ekuke ya Samari bakilo zomi ya farine na motuya ya mbongo moko ya ebende ya palata, mpe bakilo tuku mibale ya orje na motuya kaka wana. »
Ihe niile mezuru dịka onye nke Chineke gwara eze okwu sị ya, “A ga-ere akpa nta ọka balị abụọ otu shekel na otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, nʼọnụ ụzọ ama Sameria.”
19 Mokonzi ya basoda, oyo mokonzi agumbamaka mpo na loboko na ye, alobaki na moto na Nzambe: — Tala, ata soki Yawe afungoli maninisa ya Lola, likambo ya boye ekoki penza kosalema? Mpe Elize, moto na Nzambe, azongisaki: — Okomona yango na miso, kasi okolia yango te.
Nʼoge ahụ, ọchịagha ahụ na-ejere eze ozi zara sị ya, “Ihe dị otu a agaghị eme, ọ bụladị na Onyenwe anyị emeghee eluigwe mee ka nri zoo, nke a ọ ga-eme?” Ma onye nke Chineke zara ya, “Ị ga-eji anya gị hụ ya, ma ị gaghị eso rie ya.”
20 Makambo yango esalemaki ndenge kaka elobamaki na tina na ye: bato banyataki ye na ekuke ya engumba, mpe akufaki.
Ọ bụkwa otu a ka o si mee, nʼihi na ndị mmadụ zọgburu ya nʼụkwụ nʼọnụ ụzọ ama, ebe ọ nọ nwụọ.

< 2 Bakonzi 7 >