< 2 Bakolinto 6 >

1 Lokola tozali basali elongo na Nzambe, tozali kolendisa bino ete bozwa ngolu ya Nzambe na pamba te;
Dịka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ nʼotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nʼefu.
2 pamba te Nzambe alobi: « Na tango ya malamu, nayanolaki yo; mpe na mokolo ya lobiko, nasungaki yo. » Nzokande, tango ya malamu ezali nde sik’oyo; mokolo ya lobiko ezali nde lelo.
Nʼihi na ọ na-ekwu, “Nʼoge m na-anara mmadụ nke ọma anụrụ m olu unu. Ọ bụkwa ụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Lee, ugbu a bụ oge a na-anabata mmadụ nke ọma, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.
3 Tobetisaka moto moko te mabaku, mpo ete mabe elobama te na tina na lotomo na biso.
Anyị etinyeghị ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ onye ọbụla ka ọ ghara iwetara ọrụ anyị ihe ịta ụta.
4 Kasi tomikumisaka nde lokola basali ya Nzambe, kati na makambo nyonso: na koyika mpiko makasi kati na minyoko, kozanga mpe pasi na motema;
Kama nʼime ihe niile, anyị na-agbalịsị ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachiobi na-edi nsogbu niile na mkpagbu niile na ahụhụ niile na-adakwasị anyị.
5 kati na kobetama, boloko mpe mobulu; kati na misala makasi, kozanga kolala mpe kokila bilei;
A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri,
6 kati na bopeto, boyebi, kokanga motema mpe boboto; kati na Molimo Mosantu mpe bolingo ya solo;
nʼime ịdị ọcha na ezi nghọta na ntachiobi nke anyị nwere, nʼinwe obiọma na ezi ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị na ya nʼime Mmụọ Nsọ,
7 kati na Liloba ya bosolo mpe nguya ya Nzambe; kati na bibundeli ya bosembo mpo na kobundisa monguna mpe komibatela;
sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe.
8 kati na lokumu mpe soni, kosakolama lokola bato malamu mpe lokola bato mabe. Mpe lisusu, kati na koyebana lokola bato oyo balobaka lokuta, nzokande tolobaka solo;
Ụfọdụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu.
9 koyebana lokola bato oyo bayebani te, nzokande toyebani makasi; koyebana lokola bakufi, nzokande tozali bato ya bomoi; koyebana lokola bato bakweyisama, nzokande baboma biso te;
Ụwa amaghị anyị, ma a maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe niile, ma lee anyị ka dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee anyị anwụghị.
10 koyebana lokola bato na mawa, nzokande tozalaka na esengo tango nyonso; koyebana lokola babola, nzokande tokomisaka bato ebele bazwi; koyebana lokola bato bakelela, nzokande tozali na nyonso.
Anyị na-anọ nʼihe mwute mgbe niile, ma lee ọṅụ juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọbụla, ma lee anyị nwere ihe niile.
11 Bandeko ya Kolinto, tolobi na bino na bosembo nyonso mpe na mitema ya kofungwama.
Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe niile dị anyị nʼobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu.
12 Tozali kobombela bino te bolingo na biso, kasi bino bozali kobombela biso oyo ya bino.
Anyị ji obi anyị niile hụ unu nʼanya, ma unu mechiri obi unu nʼebe anyị nọ.
13 Nazali koloba na bino lokola na bana na ngai ya bolingo: Bosala lokola biso! Bino mpe bofungolela biso mitema na bino!
Ugbu a, ana m ekwu dịka ana m agwa ụmụntakịrị. Na-emesonu anyị dịka anyị si emeso unu, meenụ ka obi unu saa mbara nʼebe anyị nọ.
14 Bosanganaka te na bato oyo bazangi kondima. Pamba te boyokani nini ezali kati na bosembo mpe mabe? Boni, pole ekoki solo kosangana na molili?
Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?
15 Klisto akoki solo koyokana na Satana? Eloko nini ekoki kosangisa mondimi elongo na moto oyo azangi kondima?
Ọ bụ nwekọ dị aṅaa dị na-agbata Kraịst na ekwensu? Gịnịkwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ?
16 Boyokani nini ekoki kozala kati na Tempelo ya Nzambe mpe banzambe ya bikeko? Pamba te biso tozali Ndako ya Nzambe na bomoi, kolanda maloba na Ye moko: « Nakovanda kati na bango mpe nakotambola elongo na bango. Nakozala Nzambe na bango, mpe bango bakozala bato na ngai. »
Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru, “M ga-ebi nʼime ha. Jegharịakwa nʼime ha. M ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”
17 Yango wana, « Bobima kati na bango mpe bokabwana na bango, elobi Nkolo; bosimba eloko moko te ya mbindo, mpe ngai nakoyamba bino. »
Ya mere, “Sinụ nʼetiti ha pụta. Nọpụkwanụ iche nʼebe ha nọ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka. Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.”
18 Mpe, « Nakozala Tata mpo na bino, mpe bino bokozala bana mibali mpe bana basi mpo na ngai, elobi Nkolo, Mokonzi ya mampinga. »
Ma, “Aga m abụrụ unu Nna, unu onwe unu ga-abụkwara m ụmụ m ndị ikom na ndị inyom. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”

< 2 Bakolinto 6 >