< 1 Samuele 11 >

1 Naashi, moto ya Amoni, ayaki kotonga molako na ye liboso ya Yabeshi ya Galadi. Mpe bato nyonso ya engumba Yabeshi balobaki na Naashi: — Sala boyokani elongo na biso, mpe tokokoma bawumbu na yo.
Nʼoge ahụ, Nahash, eze ndị Amọn, duuru ndị agha ya bilie imegide ndị Izrel bi nʼala Jebesh Gilead. Ma ndị Jebesh rịọrọ ya sị, “Ka anyị na gị gbaa ndụ, anyị ga-anọ nʼokpuru ọchịchị gị.”
2 Kasi Naashi, moto ya Amoni, azongisaki: — Nakoki kosala boyokani elongo na bino soki kaka bondimi ete natobola bino nyonso liso ya ngambo ya mobali. Na bongo, nakoyokisa Isalaele mobimba soni.
Ma Nahash, onye Amọn zara sị ha, “Mụ na unu ga-agba ndụ ma ọ bụrụ na unu ekwenye ka m ghụpụta anya aka nri nke onye ọbụla nʼime unu, si otu a wetara Izrel niile ihe nkọcha.”
3 Bampaka ya Yabeshi balobaki na ye: — Pesa biso mikolo sambo mpo ete totinda bantoma kati na mokili mobimba ya Isalaele; soki moto moko te ayei kobikisa biso, wana tokomikaba na maboko na yo.
Ndị okenye obodo Jebesh zara sị, “Nye anyị abalị asaa ka anyị ziga ndị ozi nʼala Izrel niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye kwere ịbịa zọpụta anyị, anyị ga-ewere onwe anyị nyefee gị nʼaka.”
4 Tango bantoma bakomaki na Gibea, engumba ya Saulo, mpe balobaki na bato makambo nyonso oyo ezalaki koleka, bato nyonso balelaki makasi.
Mgbe ndị ozi ha zipụrụ bịaruru Gibea, nke bụ obodo Sọl, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị a, ha niile dapụrụ nʼakwa.
5 Kaka na tango yango, Saulo awutaki na bilanga, sima na bangombe na ye. Atunaki: « Likambo nini ya mabe ekweyeli bato mpo ete balela boye? » Bayebisaki ye makambo nyonso oyo bato ya Yabeshi balobaki.
Ma nʼoge a, Sọl si nʼubi na-alọta, soro ụmụ ehi ya nʼazụ, ọ jụrụ, “Ọ bụ gịnị na-eme onye ọbụla? Gịnị mere na ha ji ebe akwa?” Ha kọọrọ ya ihe banyere ozi e si Jebesh zite.
6 Tango Saulo ayokaki maloba na bango, Molimo na Nzambe akitelaki ye na nguya mpe asilikaki makasi.
Mgbe Sọl nụrụ ozi a, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼike, iwe wekwara ya nke ukwuu.
7 Akamataki bangombe mibale, akataki yango na biteni mpe atindaki biteni yango na Isalaele mobimba na nzela ya bantoma. Bamemaki sango oyo: « Ezali boye nde bakosala bangombe ya moto nyonso oyo akolanda te Saulo mpe Samuele na bitumba. » Lokola somo makasi ya Yawe ekangaki bato ya Isalaele, batambolaki lokola moto moko.
Ọ kpụpụtara ehi abụọ bọkasịa ha, zipụ ndị ozi ka ha buru ha ga obodo niile dị nʼIzrel. Ozi ha ga-ezi ndị obodo ọbụla bụ nke a. “Ọ bụ ihe e mere ehi ndị a ka a ga-eme ehi onye ọbụla jụrụ iso Sọl na Samuel jee ọgụ.” Onyenwe anyị mere ka egwu jide ndị Izrel niile. Nʼihi ya, ha niile bịakwutere Sọl dịka otu mmadụ.
8 Saulo atangaki bango, na Bezeki; motango ezalaki: mibali ya Isalaele nkoto nkama misato, mpe mibali ya Yuda nkoto tuku misato.
Mgbe Sọl kpọkọtara ha na Bezek, ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel dị narị puku atọ, tinyekwara iri puku mmadụ atọ, ndị sitere na Juda.
9 Balobaki na bantoma oyo bawutaki na Yabeshi: « Bokende koloba na mibali ya Yabeshi ya Galadi: ‹ Bokokangolama lobi, na tango moyi ekongala makasi. › » Tango bantoma bakendeki mpe bapesaki sango yango epai ya bato ya Yabeshi, bato yango basepelaki makasi.
Ha gwara ndị zitere ozi ahụ okwu sị ha, “Zienụ ndị ikom Jebesh Gilead, ‘Echi, tupu anyanwụ achaa nʼuju ya, a ga-anapụta unu.’” Mgbe ndị ozi a gara zie ndị ikom Jebesh Gilead ozi a, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu.
10 Boye bato ya Yabeshi balobaki na bato ya Amoni: « Tokomikaba lobi na maboko na bino, mpe bokosala biso nyonso oyo bokomona ete ezali malamu. »
Ndị ikom Jebesh ziri ozi gwa ndị Amọn sị ha, “Echi, anyị ga-enye unu onwe anyị, ka unu mee anyị ihe masịrị unu.”
11 Mokolo oyo elandaki, Saulo akabolaki mibali na ye na masanga misato. Mpe liboso ete tongo etana, bakotaki na molako ya bato ya Amoni mpe babomaki bango kino na tango oyo moyi engalaki makasi. Bapanzaki bato oyo babikaki na lolenge oyo esalaki ete etikalaki ata na mibali mibale te kati na bango oyo bakobaki kozala esika moko.
Ma nʼụtụtụ echi, Sọl na ndị agha ya bịaruru. O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, buso ụmụ Amọn agha na mberede nʼisi ụtụtụ. O gbugidere ha ụtụtụ niile ruo mgbe anyanwụ chara nʼuju ya, chụsasịa ndị fọdụrụ nʼime ha. Nke a mere na o nweghị ebe a ga-ahụ ka ndị agha Amọn abụọ nọkọtara.
12 Bato balobaki na Samuele: — Wapi bato oyo bazalaki koloba: « Boni, Saulo akoyangela biso? » Bomemela biso bato yango mpo ete toboma bango.
Ndị Izrel niile bịakwutere Samuel jụọ ya sị, “Olee ndị ahụ sị na Sọl agaghị abụ eze anyị? Kpọpụtara anyị ha ka anyị gbuo ha!”
13 Kasi Saulo alobaki: — Moto moko te akokufa na mokolo ya lelo, pamba te Yawe akangoli Isalaele na mokolo ya lelo.
Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa, Onyenwe anyị anapụtala Izrel!”
14 Samuele alobaki na bato: — Boya! Tokende na Giligali mpo na kovandisa kuna bokonzi ya Saulo.
Samuel gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.”
15 Bato nyonso bakendeki na Giligali mpe batiaki kuna Saulo lokola mokonzi, na miso ya Yawe. Babonzaki kuna bambeka ya boyokani na miso ya Yawe, mpe Saulo elongo na mibali nyonso ya Isalaele basepelaki makasi.
Ya mere, mmadụ niile gara Gilgal. Na mmemme pụrụ iche, ha mere Sọl eze nʼihu Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja udo nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ. Ọṅụ jupụtakwara nʼobi Sọl na ndị Izrel niile.

< 1 Samuele 11 >