< 1 Samuele 10 >

1 Bongo Samuele azwaki molangi ya mafuta, asopaki yango na moto ya Saulo, ayambaki ye mpe alobaki: « Boni, Yawe apakoli yo mafuta te mpo ete ozala mokambi ya libula na Ye?
Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na Onyenwe anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya?
2 Sima na yo kotika ngai na mokolo ya lelo, okokutana na mibali mibale pembeni ya kunda ya Rasheli, na Tselitsa, na bandelo ya mokili ya Benjame. Bakoloba na yo: ‹ Ba-ane oyo okendeki koluka emonani. Mpe, sik’oyo, tata na yo atiki komitungisa na tina na yango, kasi akomi nde komitungisa mpo na bino. Azali komituna: ‘Nakosala nini mpo na mwana na ngai ya mobali.’ › »
Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?”’
3 Kolongwa wana, okokende mwa mosika kino okokoma na nzete monene ya Tabori epai wapi okokutana na mibali misato oyo bakozala komata epai ya Nzambe, na Beteli. Moko akomema bana misato ya ntaba; mosusu, biteni misato ya mapa; mpe mosusu, molangi ya vino.
“Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya.
4 Bakopesa yo mbote mpe bakokabela yo mapa mibale. Okozwa yango na maboko na bango.
Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha.
5 Sima na yango, okokende na Gibea ya Nzambe epai wapi bayangeli ya Filisitia bazali. Wana okopusana na engumba, okokutana na ngulupa ya basakoli kowuta na esambelo ya likolo ya ngomba. Liboso na bango, ekozala na babeti mandanda, bambunda ya mike, baflite mpe banzenze. Wana bakozala kobeta mindule, basakoli yango bakokoma kosakola.
“Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma.
6 Bongo Molimo na Yawe akokitela yo na nguya, okosakola elongo na bango, mpe okobongwana moto ya lolenge mosusu.
Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche.
7 Soki kaka omoni bilembo oyo kokokisama, wana sala na yo nyonso oyo okoki kosala mpo na yo moko, pamba te Nzambe azali elongo na yo.
Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.
8 Bongo okotambola liboso na ngai mpo na kokende na Giligali, mpe ngai nakokuta yo kuna mpo na kobonza bambeka ya kotumba mpe bambeka ya boyokani. Kasi osengeli kozela mikolo sambo kino naya kokuta yo; mpe nakoyebisa yo makambo oyo osengeli kosala.
“Ị ga-aga Gilgal chere m nʼebe ahụ abalị asaa, nʼihi na ana m abịa ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo. Aga m agwa gị ihe ị ga-eme mgbe m bịara.”
9 Tango kaka Saulo abalukaki mpo na kotika Samuele, Nzambe abongolaki motema ya Saulo, mpe bilembo nyonso ekokisamaki mokolo wana kaka.
Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe Samuel nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ.
10 Tango bakomaki na Gibea, ngulupa ya basakoli ekutanaki na ye; bongo Molimo ya Nzambe akitelaki ye na nguya, mpe akomaki kosakola kati na bango.
Mgbe ya na onye na-ejere ya ozi rutere Gibea, ndị amụma nọ nʼahịrị zutere ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼebe ọ dị ukwu, o sooro ha malite ibu amụma.
11 Tango bato nyonso oyo bayebi Saulo wuta kala bamonaki ye kosakola elongo na basakoli bamitunaki: « Likambo nini ekweyi na bomoi ya mwana mobali ya Kishi? Boni, Saulo mpe azali moko kati na basakoli? »
Mgbe ndị niile maara Sọl hụrụ ya ka o so ndị a na-ebu amụma, ha jụrụ onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị mere nwa Kish? Sọl, ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
12 Moko kati na bato oyo bazalaki wana alobaki: « Bongo nani azali motambolisi na bango? » Ezali ndenge wana nde ebandaki lisese oyo: « Saulo mpe azali moko kati na basakoli? »
Otu nʼime ndị bi nʼebe ahụ jụrụ sị, “Onye ka nna ha bụ?” Nke a bụ mmalite okwu ahụ a na-ekwu sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
13 Tango Saulo asilisaki kosakola, akendeki na esambelo ya likolo ya ngomba.
Mgbe Sọl buchara amụma, ọ rigooro gaa nʼebe ịchụ aja ahụ dị nʼelu ugwu.
14 Noko ya Saulo atunaki Saulo mpe mosali na ye: — Bokendeki wapi? Saulo azongisaki: — Tokendeki koluka ba-ane. Kasi lokola tomonaki yango te, yango wana tokendeki epai ya Samuele.
Mgbe nwanne nna ya hụrụ Sọl, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee ebe ị gara?” Sọl zara ya sị, “Anyị gara ịchọ ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ma anyị achọtaghị ha, nʼihi ya anyị gara nʼebe onye amụma a na-akpọ Samuel ịjụta ase ebe ha nọ.”
15 Noko ya Saulo alobaki lisusu: — Nabondeli yo, yebisa ngai makambo oyo Samuele alobaki na bino.
Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe Samuel gwara gị.”
16 Saulo azongiselaki noko na ye: — Ayebisaki biso ete ba-ane ekomonana solo. Kasi Saulo ayebisaki noko na ye te makambo oyo Samuele alobaki na ye na tina na bokonzi.
Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka Samuel siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla.
17 Samuele abengisaki, na Mitsipa, bato ya Isalaele liboso ya Yawe
Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa, ka ha bịa zute Onyenwe anyị.
18 mpe alobaki na bango: « Tala makambo oyo Yawe, Nzambe ya Isalaele, alobi: ‹ Ngai moko nde nabimisaki Isalaele wuta na Ejipito mpe nakangolaki bino na maboko ya bato ya Ejipito mpe ya bokonzi nyonso oyo ezalaki konyokola bino. ›
Ọ gwara ha sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala Ijipt kpọpụta Izrel ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị Ijipt, na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’
19 Kasi, na mokolo ya lelo, bobwaki Nzambe na bino, oyo abikisaka bino na pasi na bino nyonso mpe na minyoko na bino. Mpe bolobi na Ye: ‹ Ponela biso mokonzi oyo akokamba biso! › Lokola ezali bongo, botelema sik’oyo bino moko liboso ya Yawe kolanda bikolo mpe bituka na bino. »
Ma ugbu a, unu ajụla Chineke unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ Ugbu a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu Onyenwe anyị dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.”
20 Samuele abengaki ekolo moko na moko ya Isalaele, mpe ekolo ya Benjame eponamaki.
Samuel mere ka ebo Izrel niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza mara ebo Benjamin.
21 Abengaki etuka moko na moko ya ekolo ya Benjame, mpe etuka ya Matiri eponamaki. Na suka, ezalaki Saulo, mwana mobali ya Kishi, nde aponamaki. Kasi tango balukaki ye, bamonaki ye te.
O mere ka ebo Benjamin bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ Matri. Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa Kish. Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya.
22 Boye, batunaki lisusu Yawe: — Boni, ezali lisusu na moto oyo ayaki awa? Yawe azongisaki: — Iyo! Botala ye wana, abombami kati na biloko.
Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?” Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.”
23 Bapotaki mbangu mpo na kobimisa ye, mpe batelemisaki ye kati na bato; mpe emonanaki ete aleki bato nyonso na molayi.
Ha gbaara gaa nʼebe ahụ kpọpụta ya. Mgbe ọ pụtara guzoro nʼetiti ha, ha hụrụ na o toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi.
24 Bongo Samuele alobaki na bato nyonso: — Botala moto oyo Yawe aponi! Kati na bato nyonso, moko te akokani na ye. Bato bazongisaki na koganga: — Tika ete mokonzi awumela na bomoi!
Samuel gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ Onyenwe anyị họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼIzrel!” Mgbe ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!”
25 Samuele alimbolelaki bato makambo oyo etali bokonzi, akomaki yango na buku mpe atiaki liboso ya Yawe. Sima na yango, azongisaki bato, moto na moto na ndako na ye.
Ọzọkwa, Samuel gwara ndị Izrel ihe bụ ọrụ eze, na ihe ruuru ya. O dekwara ihe ndị a nʼakwụkwọ, debe akwụkwọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Emesịa, Samuel mechiri nzukọ ahụ. Onye ọbụla laghachikwara nʼụlọ ya.
26 Saulo mpe azongaki na ndako na ye, na Gibea, elongo na bilombe mibali oyo Nzambe asimbaki mitema na bango mpo ete balanda ye.
Mgbe Sọl laghachiri nʼobodo ya, bụ Gibea, ndị ikom ndị Chineke metụrụ aka nʼobi sooro ya.
27 Kasi ezalaki na ndambo ya bato ya kilikili oyo bazalaki koloba: « Moto oyo akokoka kobikisa biso ndenge nini? » Batiolaki ye mpe bapesaki ye ata kado moko te. Kasi Saulo avandaki kimia.
Ma ụfọdụ ndị efulefu jọgburu onwe ha kwuru sị, “Olee otu nwoke a ga-esi zọpụta anyị?” Ha lelịrị ya anya, jụkwa iwetara ya onyinye ịnata ihuọma. Ma Sọl gbachitere ha nkịtị.

< 1 Samuele 10 >