< 1 Bakonzi 9 >

1 Sima na Salomo kosilisa kotonga Tempelo ya Yawe, ndako ya mokonzi mpe kosala nyonso oyo azalaki na yango posa,
Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, rụzukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime,
2 Yawe abimelaki Salomo na mbala ya mibale, ndenge kaka abimelaki ye na mbala ya liboso, na Gabaoni.
Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya nke ugboro abụọ dịka o mere ka ọ hụ ya anya na Gibiọn.
3 Yawe alobaki na ye: « Nayoki losambo mpe libondeli na yo, oyo osali liboso na Ngai; nabulisi Tempelo oyo otongi mpo ete natia Kombo na Ngai kati na yango mpo na libela. Miso mpe motema na Ngai ekobanda kozala kuna tango nyonso.
Onyenwe anyị sịrị ya, “Anụla m ekpere gị, na arịrịọ gị, nke ị rịọrọ nʼihu m. Edoola m ụlọnsọ a nke i wuru nsọ, site nʼitinye Aha m nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anya m na obi m abụọ ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.
4 Mpo na yo, soki okotambola liboso na Ngai ndenge Davidi, tata na yo, atambolaki na motema malamu mpe na motema ya sembo; soki okosala nyonso oyo natindaki yo mpe okobatela mibeko mpe malako na Ngai,
“Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị jiri obi zuruoke na omume ziri ezi, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile,
5 nakolendisa mpo na libela kiti na yo ya bokonzi kati na Isalaele, ndenge nalobaki yango epai ya Davidi, tata na yo: ‹ Okotikalaka kozanga te moto oyo akokitana na kiti ya bokonzi ya Isalaele. ›
mgbe ahụ, aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dịka m kwere nna gị Devid nkwa, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze Izrel.’
6 Kasi soki yo mpe bana na yo ya mibali bopengwi mosika na Ngai; soki botosi te mibeko mpe malako na Ngai, oyo natie liboso na bino; soki bokeyi kosalela banzambe mosusu mpe kofukamela yango,
“Ma ọ bụrụ na unu, maọbụ ụmụ ụmụ unu alaghachi azụ, site nʼebe m nọ, jụ idebe iwu na ụkpụrụ niile bụ nke m nyere unu, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe na ịkpọ isiala nye ha,
7 nakolongola Isalaele kati na mabele oyo napesaki ye, nakobwaka mosika ya elongi na Ngai Tempelo oyo nabulisi mpo na Kombo na Ngai, mpe Isalaele akokoma eloko ya kotiola mpe ya soni kati na bikolo nyonso.
mgbe ahụ, aga m esite nʼala ahụ nke m nyere ha wezuga Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m. Izrel ga-aghọ ihe eji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile.
8 Atako Tempelo oyo ezali sik’oyo kitoko penza, kasi bato nyonso oyo bakoleka pembeni na yango bakokamwa mpe bakoloba: ‹ Mpo na nini Yawe asali makambo ya boye na mokili oyo mpe na Tempelo oyo? ›
Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya. Ha ga-emi ọnụ, sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’
9 Bakoyanola: ‹ Ezali mpo ete basundolaki Yawe, Nzambe ya batata na bango, oyo abimisaki bango na Ejipito mpe bamipesaki na banzambe mosusu, bafukamelaki mpe basalelaki yango; yango wana Yawe ayeisi likolo na bango pasi oyo nyonso. › »
Ndị mmadụ ga-aza, ‘Nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke ha azụ, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’”
10 Sima na mibu tuku mibale oyo Salomo asalaki mpo na kotonga Tempelo ya Yawe mpe ndako na ye moko,
Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọ abụọ ndị a, ya bụ ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze.
11 akabelaki Irami, mokonzi ya Tiri, bingumba tuku mibale kati na Galile, pamba te Irami asungaki Salomo na nyonso oyo azalaki na yango na bosenga: mabaya ya sedele, ya sipele mpe wolo.
Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya.
12 Irami abimaki wuta na Tiri, mokili na ye, mpo na kotala bingumba oyo Salomo akabelaki ye, kasi asepelaki na yango te.
Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya.
13 Alobaki: « Ndeko na ngai, bingumba nini oyo opesi ngai? » Yango wana abengaki bingumba yango mokili ya Kabuli, kombo oyo etikala kino lelo.
Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul, aha ọ na-aza ruo taa.
14 Nzokande, Irami apesaki Salomo bakilo nkoto misato na nkama mitano ya wolo.
Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ.
15 Salomo asalisaki bana ya Isalaele misala makasi mpo na kotonga Tempelo ya Yawe, ndako na ye moko, Milo, mir ya Yelusalemi, Atsori, Megido mpe Gezeri.
Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza.
16 Faraon, mokonzi ya Ejipito, amataki na Gezeri, abotolaki yango na maboko ya bato ya Kanana oyo bazalaki kovanda kuna, abomaki bango, atumbaki engumba yango na moto mpe akabaki yango epai ya mwana na ye ya mwasi oyo akomaki mwasi ya Salomo.
Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ.
17 Yango wana Salomo atongaki lisusu Beti-Oroni ya likolo mpe Beti-Oroni ya se,
Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon,
18 Baalati mpe Tamari kati na esobe ya mokili,
Baalat na Tadmọ nke dị nʼọzara nʼime ala ya.
19 bingumba nyonso epai wapi azalaki kobomba biloko na ye, bingumba epai wapi azalaki kobomba bashar mpe bampunda na ye. Salomo atongaki lisusu nyonso oyo azalaki na yango posa kati na Yelusalemi, kati na Libani mpe kati na mokili nyonso oyo azalaki kokamba.
O wukwara ọtụtụ obodo ebe nchịkọba ihe, obodo ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.
20 Batikali nyonso kati na bato ya Amori, ya Iti, ya Perizi, ya Evi mpe ya Yebusi, ba-oyo bazalaki bana ya Isalaele te,
Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Amọrait, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị ahụ abụghị ndị Izrel),
21 ba-oyo bana na bango batikalaki kati na mokili oyo bana ya Isalaele babebisaki, Salomo azwaki bango mpo na misala makasi ya bawumbu, kino na mokolo ya lelo.
ndị ụmụ ụmụ ha niile fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-enweghị ike egbuchapụ, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa.
22 Kasi Salomo akomisaki te bana ya Isalaele bawumbu mpo na kosala misala makasi na ye, pamba te bazalaki bato ya bitumba, bakalaka na ye ya lokumu, bakalaka na ye, bakonzi ya basoda na ye, bakonzi ya bashar na ye mpe ya basoda na ye, oyo batambolisaka bashar.
Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu. Kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ọrụ nʼọchịchị, ndịisi ndị ọchịagha, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya.
23 Tala motango ya bakalaka ya lokumu oyo batindamaki mpo na kokamba bato oyo bazalaki kosala misala ya Salomo: bakalaka nkama mitano na tuku mitano.
Ndị a bụkwa ndịisi na-ahụ ihe banyere ọrụ niile nke Solomọn ji nʼaka. Ndị Izrel dị narị ise na iri ise, ka e mere ndịisi na-elekọta ndị ọrụ Solomọn.
24 Sima na mwana mwasi ya Faraon kolongwa na engumba ya Davidi mpo na kokende na ndako oyo Salomo atongelaki ye, Salomo atongaki Milo.
Emesịa, ada Fero sitere nʼobodo Devid pụta gbagoo nʼụlọeze nke Solomọn wuuru ya. Solomọn wukwara ebe mpụta nke ụlọ ahụ.
25 Mbala misato kati na mobu, Salomo azalaki kobonza bambeka ya kotumba mpe bambeka ya boyokani na likolo ya etumbelo oyo atongaki mpo na Yawe; azalaki mpe kotumba malasi ya ansa na likolo ya etumbelo oyo ezalaki liboso ya Yawe. Ezalaki bongo nde misala ezalaki kokokisama kati na Tempelo ya Yawe.
Ugboro atọ nʼafọ, ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye Onyenwe anyị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu Onyenwe anyị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
26 Mokonzi Salomo asalisaki masuwa ebele na engumba Etsioni-Geberi oyo ezali pene ya Eyiloti, pembeni ya ebale monene ya Barozo, kati na mokili ya Edomi.
Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba, bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm.
27 Irami atindaki na masuwa yango basali na ye, bato oyo bayebaki kotambolisa malamu masuwa kati na ebale monene; bazalaki elongo na basali ya Salomo.
Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a.
28 Bakendeki na Ofiri epai wapi bazwaki bakilo nkoto zomi na mibale ya wolo oyo bamemaki epai ya mokonzi Salomo.
Ha nyaara ụgbọ gaa Ọfịa, site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na anọ na narị abụọ na asatọ.

< 1 Bakonzi 9 >