< 1 Bakonzi 11 >
1 Mokonzi Salomo abalaki mwana mwasi ya Faraon; kasi pembeni na ye, abalaki basi mosusu ebele ya bikolo ya bapaya: basi ya Moabi, ya Amoni, ya Edomi, ya Sidoni mpe ya Iti.
Ma eze Solomọn hụrụ ọtụtụ ndị inyom mba ọzọ nʼanya, tinyere nwa nwanyị Fero, ha bụ ndị inyom ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị Saịdọn na ndị Het.
2 Basi yango bawutaki na bikolo oyo, na tina na bango, Yawe alobaki na bana ya Isalaele: « Bosengeli te kobalana na bango, noki te bakopengwisa bino mpe bakotindika mitema na bino na kosambela banzambe na bango. » Nzokande, Salomo akangamaki na basi ya bikolo ya bapaya na bolingo makasi.
Ha bụ ndị sitere na mba ndị ahụ Onyenwe anyị gwara Izrel sị, “Unu na ha agaghị alụrịtakwa di na nwunye, nʼihi na ha aghaghị ime ka obi unu gbasoo chi niile ha.” Ma, nʼagbanyeghị nke a, Solomọn rapara ha nʼahụ nʼihi ịhụnanya.
3 Azalaki na basi nkama sambo oyo bazalaki bana ya bakonzi, mpe bamakangu nkama misato. Boye, basi na ye nyonso bapengwisaki ye.
Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya.
4 Tango Salomo akomaki mobange, basi na ye batindikaki motema na ye na kogumbamela banzambe mosusu; mpe atikaki kolinga Yawe, Nzambe na ye, na motema na ye mobimba ndenge ezalaki motema ya Davidi, tata na ye.
Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere.
5 Salomo akomaki kosambela ekeko ya Asitarite, nzambe mwasi ya bato ya Sidoni; Moloki, nzambe ya mbindo ya bato ya Amoni.
Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek, bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.
6 Boye, Salomo asalaki penza makambo mabe na miso ya Yawe mpe atambolaki na boyengebene te liboso ya Yawe ndenge Davidi, tata na ye, atambolaki.
Nʼụzọ dị otu a, Solomọn mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O soghị ụzọ Onyenwe anyị dịka nna ya Devid si mee nʼụbọchị niile nke ndụ ya.
7 Na ngomba oyo etalani na Yelusalemi, Salomo atongaki esambelo ya likolo ya ngomba mpo na Kemoshi, nzambe ya mbindo ya Moabi; mpe mpo na Moloki, nzambe ya mbindo ya bato ya Amoni.
Nʼelu ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem, Solomọn wuru ebe dị elu nye Kemosh, chi rụrụ arụ nke ndị Moab, wuokwara Molek chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.
8 Asalaki mpe bongo mpo na banzambe ya basi na ye nyonso ya bikolo ya bapaya mpo ete batumbelaka yango malasi mpe babonzelaka yango mbeka.
O mekwara otu ihe ahụ nye ndị nwunye ya niile si mba ọzọ, bụ ndị na-achụ aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, na-achụkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nye chi niile ha.
9 Yawe atombokelaki Salomo mpo ete motema na ye epengwaki mosika na Yawe, Nzambe ya Isalaele, oyo amimonisaki epai na ye mbala mibale.
Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide Solomọn, nʼihi na obi ya esitela nʼebe Onyenwe anyị Chineke Izrel nọ pụọ, bụ onye mere ka ọ hụ ya anya ugboro abụọ.
10 Nzokande, Yawe apekisaki Salomo kosambela banzambe mosusu; kasi Salomo atosaki te mitindo ya Yawe.
Ọ bụ ezie na o nyere Solomọn iwu ka ọ ghara ịgbaso chi ndị ọzọ, ma Solomọn erubeghị isi nʼiwu a Onyenwe anyị nyere.
11 Boye, Yawe alobaki na Salomo: « Lokola oponi kotambola bongo mpe obateli te boyokani na Ngai mpe mitindo oyo napesaki yo, nakobotola yo bokonzi mpe nakopesa yango na moko kati na basali na yo.
Ya mere, Onyenwe anyị gwara Solomọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, jụ idebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ m, nke m nyere gị idebe, aghaghị m isite nʼaka gị dọkapụ alaeze a, were ya nye otu nʼime ndị na-ejere gị ozi.
12 Nzokande, mpo na Davidi, tata na yo, nakosala yango te na tango oyo ozali nanu na bomoi; nakobotola yango nde na maboko ya mwana na yo ya mobali.
Ma nʼihi nna gị Devid agaghị m eme ihe ndị a mgbe ị dị ndụ. Aga m anapụ nwa gị nwoke alaeze Izrel.
13 Kasi nakobotola ye bokonzi nyonso te; nakotikela ye etuka moko mpo na Davidi, mowumbu na Ngai, mpe mpo na Yelusalemi, engumba oyo napona. »
Ma agaghị m anapụcha ya alaeze Izrel niile, kama aga m eme ka ọ bụrụ eze otu ebo Izrel, nʼihi Devid, na nʼihi Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m.”
14 Yawe abimisaki monguna moko mpo na kobundisa Salomo: Adadi, moto ya Edomi, mwana kati na libota ya bokonzi ya Edomi.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka onye iro bilie megide Solomọn. Onye a bụ Hadad onye Edọm, onye sikwa nʼezinaụlọ ndị eze Edọm.
15 Na kala, na tango oyo Davidi abundisaki mokili ya Edomi, Joabi mokonzi ya mampinga, oyo akendeki mpo na kokunda bibembe, abomaki mibali nyonso ya Edomi.
Nʼoge gara aga, mgbe Devid na-ebuso ndị Edọm agha, Joab, onyeisi ndị agha, onye gara ili ndị agha e gburu egbu, tigburu ndị ikom niile nọ nʼEdọm.
16 Joabi mpe bato nyonso ya Isalaele batikalaki kuna basanza motoba kino tango basilisaki koboma mibali nyonso ya Edomi.
Joab na ndị agha Izrel niile nọgidere nʼebe ahụ ọnwa isii, tutu ruo mgbe ha gbuchapụrụ ndị ikom niile nọ nʼEdọm.
17 Kasi Adadi oyo azalaki nanu elenge na tango wana akimaki na Ejipito elongo na ndambo ya bato ya Edomi oyo bazalaki basali ya tata na ye.
Ma Hadad, onye bụ nwantakịrị nʼoge ahụ, gbapụrụ ọsọ gbaga Ijipt, ya na ụfọdụ ndịisi ọchịchị Edọm, ndị jeere nna ya ozi.
18 Balongwaki na Madiani mpe bakendeki na Parani. Wuta na Parani, bazwaki bato mpe bakendeki elongo na bango na Ejipito epai ya Faraon, mokonzi ya Ejipito. Faraon apesaki Adadi ndako, eteni ya mabele mpe bilei.
Ha sitere nʼala Midia gaa Paran. Site na Paran, ha duuru ụfọdụ ndị mmadụ, ndị sooro ha gaa Ijipt, jekwuru Fero eze Ijipt, onye nyere Hadad ụlọ obibi na ala, nyekwa ya ihe oriri.
19 Lokola Faraon asepelaki na Adadi mingi, abalisaki ye semeki na ye ya mwasi, ndeko mwasi ya Takipenesi, mwasi ya mokonzi.
Hadad hụtara amara nʼihu Fero, nke mere na ọ kpọnyere ya nwanne nwanyị Tapenes bụ nwunye eze ka ọ bụrụ nwunye ya.
20 Ndeko mwasi ya Takipenesi abotelaki Adadi mwana moko ya mobali mpe apesaki ye kombo « Genubati. » Takipenesi abokolaki ye kati na ndako ya Faraon. Genubati avandaki kuna elongo na bana ya Faraon.
Nwanne Tapenes mụtara ya nwa nwoke aha ya bụ Genubat, onye Tapenes zụlitere nʼụlọeze. Genubat biri nʼetiti ụmụ Fero.
21 Wana Adadi azalaki na Ejipito, ayokaki ete Davidi mpe Joabi, mokonzi ya mampinga, bakufi. Boye, Adadi alobaki na Faraon: — Pesa ngai nzela ete nazonga na mokili na ngai.
Mgbe Hadad nọ nʼIjipt, ọ nụrụ na Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ na Joab ọchịagha ndị agha anwụọkwala, ọ rịọrọ Fero arịrịọ ka o kwenye ka ọ laghachi nʼEdọm.
22 Faraon atunaki ye: — Ozangi eloko nini awa mpo ete oluka kozonga na mokili na yo? Adadi azongisaki: — Eloko moko te. Kasi tika ngai ete nakende kaka.
Fero jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji chọọ ịla? O nwere ihe ị chọrọ nke ị na-adịghị enweta nʼebe a?” Hadad zara sị ya, “O nweghị ihe kọrọ m, kama kwere ka m laghachi.”
23 Nzambe abimisaki monguna mosusu mpo na kobundisa Salomo; kombo na ye: Rezoni. Rezoni Azalaki mwana mobali ya Eliyada, oyo akimaki nkolo na ye, Adadezeri, mokonzi ya Tsoba.
Nwoke ọzọ Chineke mere ka ọ bụrụ onye iro Solomọn bụ Rezon nwa Eliada, onye gbapụrụ site nʼaka nna ya ukwu bụ Hadadeza, eze Zoba.
24 Rezoni asangisaki mibali pene na ye mpe akomaki mokambi ya lisanga ya batomboki tango Davidi abomaki mampinga ya Tsoba. Bongo batomboki bakendeki na Damasi epai wapi bavandaki mpe bakomaki kokonza.
Devid lara ndị agha Zoba nʼiyi, Rezon chịkọtara ndị ikom gbara ya gburugburu, ghọọ onyendu ha, ndị nnupu isi a gara Damaskọs biri nʼebe ahụ, na-achịkwa nʼebe ahụ.
25 Rezoni azalaki monguna ya Isalaele na tango nyonso oyo Salomo azalaki na bokonzi. Wana Adadi azalaki kotia Isalaele mobulu, Rezoni akomaki mokonzi ya Siri mpe akomaki kokanela Isalaele.
Ogologo ụbọchị niile nke ndụ Solomọn, Rezon bụ onye iro Izrel, tinyekwara nsogbu nke Hadad wetaara Izrel. Rezon bụ eze ndị Aram, bụrụkwa onye na-emegide Izrel.
26 Jeroboami, mwana mobali ya Nebati, moto ya Efrayimi ya Tsereda, moko kati na basali ya Salomo, atombokelaki mokonzi. Mama na ye azalaki mwasi akufisa mobali, mpe kombo na ye: Tseruya.
Jeroboam nwa Nebat, onye Ifrem nke Zereda, otu nʼime ndị ozi Solomọn, biliri megide eze. Nne ya bụ Zerua, nwanyị di ya nwụrụ anwụ.
27 Tala ndenge atombokelaki mokonzi: na tango oyo Salomo azalaki kotonga Milo mpe kokanga madusu ya mir ya engumba ya Davidi, tata na ye,
Nke a bụ akụkọ banyere otu o siri bilie imegide eze: Solomọn wugharịrị Milo, wuziekwa ntipu dị na mgbidi obodo Devid bụ nna ya.
28 Jeroboami azalaki elenge mobali ya makasi mpe ya mpiko; lokola Salomo amonaki ndenge elenge mobali oyo azalaki kosala mosala na ye malamu, atiaki ye motambolisi misala nyonso ya makasi mpo na libota ya Jozefi.
Ugbu a Jeroboam, nʼonwe ya, bụ dimkpa. Mgbe Solomọn hụrụ otu nwokorobịa a si arụzi ọrụ ya nke ọma, o mere ya onye nlekọta ndị ọrụ niile si nʼezinaụlọ Josef.
29 Mokolo moko, wana Jeroboami azalaki kobima na Yelusalemi, Ayiya, mosakoli ya Silo, akutanaki na ye na nzela mpe alataki kazaka ya sika. Bazalaki kaka bango mibale na libanda ya mboka, kati na esobe.
Ma otu ụbọchị, mgbe Jeroboam si Jerusalem na-apụ, o zutere Ahija onye amụma, onye Shilo, nʼụzọ, ebe o yi uwe ọhụrụ. Ọ bụkwa naanị ha abụọ nọ nʼọhịa mgbe ahụ.
30 Ayiya azwaki kazaka na ye ya sika oyo alataki, akataki yango na biteni zomi na mibale
Mgbe ahụ, Ahija yipụrụ uwe ọhụrụ nke o yi nʼahụ dọwasịa ya ụzọ iri na abụọ.
31 mpe alobaki na Jeroboami: « Kamata biteni zomi mpo na yo, pamba te tala makambo oyo Yawe, Nzambe ya Isalaele, alobi: ‹ Nakobotola bokonzi na maboko ya Salomo mpe nakopesa yo bikolo zomi.
Mgbe ahụ, ọ gwara Jeroboam sị, “Chịrị iberibe iri nye onwe gị, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Lee, aga m anapụ Solomọn alaeze a, ma aga m enyekwa gị ebo iri nʼime ha.
32 Kasi mpo na Davidi, mowumbu na Ngai, mpe mpo na engumba Yelusalemi oyo napona kati na mabota nyonso ya Isalaele, Salomo akozwa kaka libota moko.
Ma aga m ahapụrụ ya otu ebo, nʼihi ohu m Devid na nʼihi Jerusalem obodo m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel.
33 Nakosala bongo, pamba te basundolaki Ngai mpe bagumbamelaki Asitarite, nzambe mwasi ya bato ya Sidoni; Kemoshi, nzambe ya bato ya Moabi; mpe Moloki, nzambe ya bato ya Amoni, batambolaki te na banzela na Ngai mpo na kosala makambo ya sembo na miso na Ngai, kobatela malako mpe mibeko na Ngai, ndenge Davidi, tata ya Salomo, asalaki.
Nʼihi na ha ahapụla m malite ịkpọ isiala nye Ashtọret, chi nwanyị ndị Saịdọn; na nyekwa Kemosh, chi ndị Moab; na nye Molek, chi ụmụ Amọn. Ha agbasoghị ụzọ m, ha emekwaghị ihe ndị ahụ m gụrụ dịka ezi ihe. Ha edebeghị iwu m na ụkpụrụ m niile dịka Devid nna Solomọn mere.
34 Kasi nakobotola te bokonzi nyonso na maboko ya Salomo, nakotika ye nanu kokonza na mikolo nyonso oyo akozala na bomoi, mpo na Davidi, mowumbu na Ngai, oyo naponaki mpe abatelaki mitindo mpe malako na Ngai.
“‘Ma agaghị m anapụ alaeze ya ugbu a, nʼihi ohu m Devid, onye m họpụtara, na onye mere ihe tọrọ m ụtọ. Aga m ahapụ Solomọn ka ọ nọgide dịka eze ụbọchị ndụ ya niile.
35 Kasi nakobotola bokonzi na maboko ya mwana na ye ya mobali mpe nakopesa yo mabota zomi.
Ma aga m anapụ alaeze ya site nʼaka nwa ya, nye gị ebo iri.
36 Nakopesa libota moko epai ya mwana na ye ya mobali mpo ete Davidi, mowumbu na Ngai, azala tango nyonso na mokitani liboso na Ngai kati na Yelusalemi, engumba oyo napona mpo na kotia Kombo na Ngai kati na yango.
Nwa ya ka m ga-enye otu ebo, nʼihi na achọrọ m ka Devid ohu m nọgide ịbụ eze Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m, ebe m mere ka Aha m dịrị.
37 Kasi mpo na yo, Jeroboami, nakozwa yo, mpe okokonza nyonso oyo motema na yo ekolinga mpe okozala mokonzi ya Isalaele.
Ma otu ọ dị, gị ka m ga-ewere. Ị ga-abụkwa onye ga-achị ebe ahụ niile obi gị chọrọ; i ga-abụ eze Izrel.
38 Soki osali nyonso oyo Ngai nazali kotinda yo, soki otamboli na banzela na Ngai mpe osali makambo ya sembo na miso na Ngai, na kobatelaka mibeko mpe malako na Ngai ndenge Davidi, mowumbu na Ngai, asalaki, wana nakozala na yo elongo, nakosala ete bokonzi kati na libota na yo elendisama ndenge nasalaki epai ya Davidi, mpe nakopesa yo Isalaele.
Ọ bụrụ na i gee ntị mee ihe niile m ga-enye gị nʼiwu, jekwa ije nʼirubere m isi, mee ihe ziri ezi nʼanya m, site nʼidebe ụkpụrụ niile na iwu niile, dịka ohu m Devid mere, aga m anọnyere gị. Aga m ewuru gị ụlọ ga-adịgide dịka m siri wuoro Devid. Aga m enyekwa gị Izrel.
39 Na bongo, nakoyokisa ndako ya Davidi soni, kasi mpo na libela te. › »
Aga m eweda agbụrụ Devid nʼihi ihe a, ma ha agaghị abụ ndị e wedara nʼala ruo ebighị ebi.’”
40 Salomo alukaki koboma Jeroboami, kasi Jeroboami akimaki na Ejipito epai ya Shishaki, mokonzi ya Ejipito, avandaki kuna kino na kufa ya Salomo.
Solomọn gbalịrị igbu Jeroboam, ma Jeroboam gbaara ọsọ gbakwuru eze Shishak nke Ijipt. Ọ nọkwara nʼIjipt ruo mgbe Solomọn nwụrụ.
41 Makambo mosusu oyo etali bokonzi ya Salomo, misala na ye nyonso mpe bwanya na ye, ekomama kati na buku ya misala ya Salomo.
Ma banyere ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, nke bụ, ihe niile o mere na amamihe o gosipụtara, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Solomọn?
42 Salomo akonzaki Isalaele mobimba mibu tuku minei, na Yelusalemi.
Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem.
43 Sima na yango, Salomo akendeki kokutana na bakoko na ye, mpe bakundaki ye kati na engumba ya Davidi, tata na ye. Mwana na ye, Roboami, akitanaki na ye na bokonzi.
O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya, ghọkwara eze nʼọnọdụ nna ya.