< 1 Yoane 5 >

1 Moto nyonso oyo andimaka ete Yesu azali Klisto azali mwana na Nzambe, mpe moto nyonso oyo alingaka Tata alingaka mpe Mwana na Ye.
Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya.
2 Tala ndenge nini toyebaka ete tolingaka bana na Nzambe: ezali na nzela ya kolinga Nzambe mpe ya kotosa mibeko na Ye.
Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile.
3 Pamba te kolinga Nzambe ezali: kotosa mibeko na Ye. Mpe mibeko na Ye ezali pasi te,
Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ.
4 pamba te mwana nyonso ya Nzambe alongaka mokili, mpe elonga oyo elongaki mokili ezali: kondima na biso.
Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị.
5 Nani oyo alongaka mokili? Ezali kaka moto oyo andimaka ete Yesu azali Mwana na Nzambe.
Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
6 Yesu-Klisto azali Ye oyo ayaki na nzela ya mayi mpe makila; ayaki na nzela ya mayi kaka te, kasi na nzela ya mayi mpe makila. Mpe ezali Molimo nde atatoli bongo, pamba te Molimo azali solo.
Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu.
7 Nzokande, batatoli bazali misato:
Nʼihi na ha dị atọ gbara akaebe:
8 Molimo, mayi mpe makila; mpe bango misato balobaka ndenge moko.
Mmụọ Nsọ, na mmiri na ọbara, ha atọ kwekọrịtara.
9 Tondimaka matatoli ya bato, kasi litatoli ya Nzambe eleki motuya, pamba te yango nde Nzambe apesa na tina na Mwana na Ye.
Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
10 Moto oyo andimelaka Mwana na Nzambe azali na litatoli yango kati na motema na ye; moto oyo andimelaka Nzambe te akomisi Nzambe mokosi, pamba te andimaka te litatoli oyo Nzambe apesa na tina na Mwana na Ye.
Onye ọbụla kweere nʼỌkpara Chineke nwere ọgbụgba ama a nʼobi ya. Ma onye ọbụla na-ekwereghị na Chineke emeela ya ka ọ bụrụ onye ụgha, nʼihi na o kwereghị nʼama ahụ Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
11 Mpe litatoli yango ezali: Nzambe apesa biso bomoi ya seko, mpe bomoi yango ezali kati na Mwana na Ye. (aiōnios g166)
Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. (aiōnios g166)
12 Moto oyo azali na Mwana azali na bomoi, kasi moto oyo azangi Mwana na Nzambe azangi mpe bomoi.
Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.
13 Bino oyo bondimelaka Kombo ya Mwana na Nzambe, nakomeli bino makambo oyo mpo boyeba ete bozali na bomoi ya seko. (aiōnios g166)
Ana m edere unu ihe ndị a unu ndị kweere nʼaha Ọkpara Chineke, ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
14 Mpe tala elikya oyo tozali na yango liboso ya Nzambe: soki tosengi eloko kolanda mokano na Ye, ayoki biso.
Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị.
15 Mpe soki toyebi ete ayoki biso, toyebi lisusu ete tozali na eloko oyo tosengi epai na Ye.
Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.
16 Soki omoni ndeko na yo kosala lisumu oyo ememaka na kufa te, osengeli kobondela mpo na ye, mpe Nzambe akopesa ye bomoi. Nazali koloba nde na tina na bato oyo basalaka lisumu oyo ememaka na kufa te. Kasi ezali na lisumu oyo ememaka na kufa; ezali te na tina na lisumu yango nde nazali kosenga na bino kobondela.
Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ.
17 Solo, lisumu ezali: kobuka mobeko; kasi ezali na lisumu oyo ememaka na kufa te.
Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ.
18 Toyebi ete moto nyonso oyo abotami na bomoi ya bonzambe akobaka te kosala lisumu; Ye moko Mwana na Nzambe abatelaka ye, mpe Satana akoki kosala ye mabe te.
Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka.
19 Toyebi ete tozali bana na Nzambe, mpe ete mokili mobimba ezali na se ya bokonzi ya Satana.
Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ.
20 Toyebi lisusu ete Mwana na Nzambe asila koya mpe apesa biso bososoli mpo ete tokoka koyeba Ye oyo azali solo. Mpe tozali kati na Ye oyo azali solo, na nzela ya kozala kati na Yesu-Klisto, Mwana na Ye. Mwana azali Ye moko Nzambe ya solo mpe bomoi ya seko. (aiōnios g166)
Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
21 Bana na ngai, bomibatelaka mosika na banzambe ya bikeko.
Ụmụ m, wezuganụ onwe unu site nʼarụsị niile.

< 1 Yoane 5 >