< Psalmi 67 >

1 Dziesma dziedātāju vadonim, dziedama uz koklēm. Lai Dievs par mums apžēlojās un mūs svētī, lai Viņš apgaismo Savu vaigu pār mums! (Sela)
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, (Sela)
2 Ka virs zemes Tavs ceļš top zināms, starp visiem pagāniem Tava pestīšana.
Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.
3 Tev, Dievs, pateicās ļaudis, Tev pateicās visi ļaudis.
Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
4 Tautas priecājās un gavilē, ka Tu ar taisnību tiesā ļaudis un vadi tautas zemes virsū.
Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. (Sela)
5 Tev, Dievs, pateicās ļaudis, Tev pateicās visi ļaudis.
Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
6 Zeme izdod savus augļus; Dievs, mūsu Dievs, svētī mūs!
Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.
7 Svēti mūs, Dievs, un visi zemes gali lai Viņu bīstas!
Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.

< Psalmi 67 >