< Jesajas 4 >
1 Un septiņas sievas sagrābs vienu vīru tanī dienā un sacīs: mēs ēdīsim savu pašu maizi un ģērbsimies ar savām pašu drēbēm, lai mēs tikai topam nosauktas pēc tava vārda, - atņem mūsu negodu.
Nʼoge ahụ, ndị ikom ole na ole ga-afọdụ ndụ. Nke a ga-eme ka ndị inyom asaa na-azọ otu nwoke. Ha ga-abịakwute ya sị ya “Kwere ka anyị niile bụrụ ndị nwunye gị! Anyị ga-akpara onwe anyị nri, zụọra onwe anyị akwa. Naanị kwere ka anyị na-aza aha gị, ka a ghara ịkọ anyị ọnụ.”
2 Tanī dienā Tā Kunga Atvase būs par glītumu un par godu, un tas zemes Auglis par augstumu un krāšņumu Israēla izglābtiem.
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka Alaka Onyenwe anyị mabiga mma oke, ma nwekwa ebube dị ukwuu. Ndị fọdụrụ ndụ nʼIzrel ga-enweta ihe ubi ga-enye ha ọṅụ, na nke ga-ewetara ha obi nganga na mmụọ ịnya isi.
3 Un Ciānas atlikušie un Jeruzālemes atlicinātie taps nosaukti Viņam svēti, ikkatrs, kas Jeruzālemē rakstīts uz dzīvību.
Ndị ahapụrụ na Zayọn, ndị nọ na Jerusalem ka a ga-akpọ ndị dị nsọ, bụ ndị ahụ niile e dere aha ha nʼetiti ndị bi nʼime Jerusalem.
4 Kad Tas Kungs nomazgās Ciānas meitu sārņus un Jeruzālemes asinsvainas izdeldēs no viņas vidus caur sodības Garu un caur uguns Garu.
Onyenwe anyị ga-asachapụ unyi niile nke ndị inyom Zayọn, ọ ga-asachapụkwa ọbara niile dị na Jerusalem site na mmụọ nke ikpe, na mmụọ nke ọkụ.
5 Un Tas Kungs radīs pār visu Ciānas kalna vietu un pār viņas svētku sapulcēm padebesi dienā un dūmus un uguns liesmas spožumu naktī; jo pār visu godību būs apsegs.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-ewuru ugwu Zayọn niile na ndị niile zukọrọ nʼebe ahụ ndo ga-ekpuchi ha niile. Ihe ọ ga-eji mee ndo a bụ igwe ojii na anwụrụ ọkụ nke ga-adịrị ha nʼehihie, na ọkụ na-enwu enwu, nke ga-adịrị ha nʼabalị. Ebube ahụ ga-abụ ihe mkpuchi nye ha.
6 Un būs telts par pavēni dienā pret karstumu un par glābšanu un par patvērumu pret plūdiem un lietu.
Ọ ga-abụrụ ha ebe mgbaba na ndo ime ka okpomọkụ nke ehihie hapụ ịchagbu ha. Ọ ga-abụkwara ha ebe izere ndụ, na ebe nzuzo pụọ nʼoke ifufe na mmiri.