< Psalmorum 12 >

1 in finem pro octava psalmus David salvum me fac Domine quoniam defecit sanctus quoniam deminutae sunt veritates a filiis hominum
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma nke Devid. Onyenwe anyị, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla! Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ.
2 vana locuti sunt unusquisque ad proximum suum labia dolosa in corde et corde locuti sunt
O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya. Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ, maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha.
3 disperdat Dominus universa labia dolosa linguam magniloquam
Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.
4 qui dixerunt linguam nostram magnificabimus labia nostra a nobis sunt quis noster dominus est
Ndị na-asị, “Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri; egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?”
5 propter miseriam inopum et gemitum pauperum nunc exsurgam dicit Dominus ponam in salutari fiducialiter agam in eo
“Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude, aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.”
6 eloquia Domini eloquia casta argentum igne examinatum probatum terrae purgatum septuplum
Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke, ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ, nke a nụchara ugboro asaa.
7 tu Domine servabis nos et custodies nos a generatione hac et in aeternum
O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi.
8 in circuitu impii ambulant secundum altitudinem tuam multiplicasti filios hominum
Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.

< Psalmorum 12 >