< Job 7 >

1 militia est vita hominis super terram et sicut dies mercennarii dies eius
“Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba? Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?
2 sicut servus desiderat umbram et sicut mercennarius praestolatur finem operis sui
Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada, maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,
3 sic et ego habui menses vacuos et noctes laboriosas enumeravi mihi
otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.
4 si dormiero dico quando consurgam et rursum expectabo vesperam et replebor doloribus usque ad tenebras
Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.
5 induta est caro mea putredine et sordibus pulveris cutis mea aruit et contracta est
Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.
6 dies mei velocius transierunt quam a texente tela succiditur et consumpti sunt absque ulla spe
“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.
7 memento quia ventus est vita mea et non revertetur oculus meus ut videat bona
O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume; anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.
8 nec aspiciet me visus hominis oculi tui in me et non subsistam
Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ; unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.
9 sicut consumitur nubes et pertransit sic qui descenderit ad inferos non ascendet (Sheol h7585)
Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa. (Sheol h7585)
10 nec revertetur ultra in domum suam neque cognoscet eum amplius locus eius
E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ; ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.
11 quapropter et ego non parcam ori meo loquar in tribulatione spiritus mei confabulabor cum amaritudine animae meae
“Ya mere agaghị m emechi ọnụ; aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ. Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.
12 numquid mare sum ego aut cetus quia circumdedisti me carcere
A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri, nke mere i ji eche m nche?
13 si dixero consolabitur me lectulus meus et relevabor loquens mecum in strato meo
Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi, maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,
14 terrebis me per somnia et per visiones horrore concuties
nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,
15 quam ob rem elegit suspendium anima mea et mortem ossa mea
ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ, karịa inwe ụdị ahụ m nke a.
16 desperavi nequaquam ultra iam vivam parce mihi nihil enim sunt dies mei
Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi. Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.
17 quid est homo quia magnificas eum aut quia ponis erga eum cor tuum
“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe, i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,
18 visitas eum diluculo et subito probas illum
i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile, ma na-anwale ya mgbe mgbe?
19 usquequo non parces mihi nec dimittis me ut gluttiam salivam meam
Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ, maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?
20 peccavi quid faciam tibi o custos hominum quare posuisti me contrarium tibi et factus sum mihimet ipsi gravis
Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị, gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme? Gịnị mere i ji elekwasị m anya? Abụrụla m ibu arọ nye gị?
21 cur non tolles peccatum meum et quare non auferes iniquitatem meam ecce nunc in pulvere dormiam et si mane me quaesieris non subsistam
Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m, ma bupụ mmehie m? Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ. Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”

< Job 7 >