< Ii Samuelis 20 >

1 Accidit quoque ut ibi esset vir Belial, nomine Seba, filius Bochri, vir Iemineus: et cecinit buccina, et ait: Non est nobis pars in David, neque hereditas in filio Isai: revertere in tabernacula tua Israel.
Mgbe ahụ, otu onye okwu na ụka, aha ya bụ Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin nọ nʼebe ahụ nʼoge a. Ọ fụrụ opi ike ya tie mkpu sị, “Anyị enweghị oke nʼime Devid, anyị enwekwaghị ihe nketa nʼime nwa Jesi. Ndị Izrel, onye ọbụla laa nʼụlọ ikwu ya!”
2 Et separatus est omnis Israel a David, secutusque est Seba filium Bochri: viri autem Iuda adhaeserunt regi suo a Iordane usque Ierusalem.
Ya mere, ndị ikom Izrel niile tụgharịrị hapụ Devid, soro Sheba nwa Bikri. Ma ndị ikom Juda nọgidere soro eze ha site na Jọdan ruo Jerusalem.
3 Cumque venisset rex in domum suam in Ierusalem, tulit decem mulieres concubinas, quas dereliquerat ad custodiendam domum, et tradidit eas in custodiam, alimenta eis praebens: et non est ingressus ad eas, sed erant clausae usque in diem mortis suae in viduitate viventes.
Mgbe Devid lọghachitere nʼụlọ ya na Jerusalem. O nyere iwu ka ndị iko ya nwanyị iri ndị ahụ ọ hapụrụ ilekọta ụlọ, ndị ahụ ha na Absalọm dinara, nọrọ nʼụlọ dị iche, ebe a nọ na-eche ha nche. Eze abakwurughị ha ọzọ. Ha bụ ndị emechibidoro ụzọ, ha na-ebi ndụ dịka ndị di ha nwụrụ anwụ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ha.
4 Dixit autem rex Amasae: Convoca mihi omnes viros Iuda in diem tertium, et tu adesto praesens.
Mgbe ahụ, eze gwara Amasa okwu sị, “Kpokọta ndị agha Juda ka ha bịakwute m nʼime abalị atọ. Gị onwe gị kwa ga-eso ha bịa nʼoge ahụ.”
5 Abiit ergo Amasa ut convocaret Iudam, et moratus est extra placitum quod ei constituerat rex.
Amasa pụrụ jee ịkpọkọta ndị Juda; ma o were ya ọtụtụ oge karịa abalị atọ.
6 Ait autem David ad Abisai: Nunc magis afflicturus est nos Seba filius Bochri quam Absalom: tolle igitur servos domini tui, et persequere eum, ne forte inveniat civitates munitas, et effugiat nos.
Devid sịrị Abishai, “Lee nwoke a bụ Sheba nwa Bikri na-aga ime ihe ọjọọ ga-adị njọ karịa nke Absalọm mere. Chịrị ndị agha nna gị ukwu chụso ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-achọta obodo e wusiri ike gbaba, ebe anyị na-apụghị inweta ya.”
7 Egressi sunt ergo cum eo viri Ioab, Cerethi quoque et Phelethi: et omnes robusti exierunt de Ierusalem ad persequendum Seba filium Bochri.
Ya mere ndị agha Joab, na ndị Keret na Pelet, na ndị niile bụ dike na dimkpa nʼagha pụrụ nʼikike ọchịchị Abishai. Ha si Jerusalem pụọ ịchụso Sheba nwa Bikri.
8 Cumque illi essent iuxta lapidem grandem, qui est in Gabaon, Amasa veniens occurrit eis. Porro Ioab vestitus erat tunica stricta ad mensuram habitus sui, et desuper accinctus gladio dependente usque ad ilia, in vagina, qui fabricatus levi motu egredi poterat, et percutere.
Mgbe ha rutere nʼoke nkume ahụ dị na Gibiọn, Amasa pụtara izute ha. Joab yi uwe agha ya nʼoge a; ọ fanyekwara mma agha ya nʼọbọ nʼukwu ya. Mgbe ọ gara nʼihu, mma ahụ si nʼọbọ ya dapụta.
9 Dixit itaque Ioab ad Amasam: Salve mi frater. Et tenuit manu dextera mentum Amasae, quasi osculans eum.
Joab kelere Amasa sị ya, “Kedụ ka ị dị nwanna m.” Mgbe ahụ, Joab ji aka nri ya jide Amasa nʼahụọnụ isutu ya ọnụ,
10 Porro Amasa non observavit gladium, quem habebat Ioab, qui percussit eum in latere, et effudit intestina eius in terram, nec secundum vulnus apposuit. Ioab autem, et Abisai frater eius persecuti sunt Seba filium Bochri.
Amasa elezighị anya hụ na mma agha nta dị nʼaka Joab. Joab mabanyere ya nʼime afọ Amasa, mee ka mgbịrị afọ ya sọsikwaa nʼala. Ọ maghị ya mma ahụ ugboro abụọ, nʼihi na otu ugboro ahụ mere ka Amasa nwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụsoro Sheba nwa Bikri nʼazụ.
11 Interea quidam viri, cum stetissent iuxta cadaver Amasae, de sociis Ioab, dixerunt: Ecce qui esse voluit pro Ioab comes David.
Mgbe ahụ, otu nʼime ndị agha Joab guzo nʼakụkụ Amasa sị, “Onye ọbụla dịnyeere Joab na Devid ya bịa soro Joab nʼazụ.”
12 Amasa autem conspersus sanguine, iacebat in media via. Vidit hoc quidam vir quod subsisteret omnis populus ad videndum eum, et amovit Amasam de via in agrum, operuitque eum vestimento, ne subsisterent transeuntes propter eum.
Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa.
13 Amoto ergo illo de via, transibat omnis vir sequens Ioab ad persequendum Seba filium Bochri.
Mgbe e bupụsịrị ozu Amasa nʼụzọ, ndị agha niile sooro Joab gaa ijide Sheba, nwa Bikri.
14 Porro ille transierat per omnes tribus Israel usque in Abelam, et Bethmaacha: omnesque viri electi congregati fuerant ad eum.
Sheba gabigara ebo niile nke Izrel ruo Ebel-Bet-Maaka, gabigakwa oke ala ndị Bikri, bụ ndị zukọtara soro ya.
15 Venerunt itaque et oppugnabant eum in Abela, et in Bethmaacha, et circumdederunt munitionibus civitatem, et obsessa est urbs: omnis autem turba, quae erat cum Ioab, moliebatur destruere muros.
Ndị agha Joab bịara gbochie ya na Ebel-Bet-Maaka. Ha wuru ihe mgbochi ruo obodo ahụ, nọbichie mgbidi dị ya gburugburu. Ebe ha nọ na-akụ mgbidi ahụ ihe, ka ha kwatuo ya.
16 Et exclamavit mulier sapiens de civitate: Audite, audite, dicite Ioab: Appropinqua huc, et loquar tecum.
Otu nwanyị maara ihe si nʼobodo ahụ kpọọ oku sị, “Geenụ m ntị, geenụ m ntị, gwanụ Joab ka ọ bịa nʼebe a. Achọrọ m ịgwa ya okwu.”
17 Qui cum accessisset ad eam, ait illi: Tu es Ioab? Et ille respondit: Ego. Ad quem sic locuta est: Audi sermones ancillae tuae. Qui respondit: Audio.
Joab pụtara gaa ya nso. Nwanyị ahụ jụrụ sị, “Ọ bụ gị bụ Joab?” Ọ zara sị, “E, ọ bụ m.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya, “Gee ntị, ka i nụ ihe ohu gị nwere ikwu.” Joab sịrị ya, “Ana m ege ntị.”
18 Rursumque illa, Sermo, inquit, dicebatur in veteri proverbio: Qui interrogant, interrogent in Abela: et sic proficiebant.
Ọ gara nʼihu sị, “Nʼoge ochie a na-ekwu sị, ‘Gaa jụta ase nʼEbel,’ nʼụzọ dị otu a ka ha si ekwubi okwu.
19 Nonne ego sum quae respondeo veritatem in Israel, et tu quaeris subvertere civitatem, et evertere matrem in Israel? Quare praecipitas hereditatem Domini?
Anyị bụ ndị udo na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼIzrel. I na-achọ ibibi obodo bụ nne nʼIzrel. Gịnị mere i ji chọọ iloda ihe nketa nke Onyenwe anyị?”
20 Respondensque Ioab, ait: Absit, absit hoc a me: non praecipito, neque demolior.
Joab zara sị, “Mba! Ọ bụghị uche m ịla obodo a nʼiyi.
21 Non sic se habet res, sed homo de monte Ephraim Seba, filius Bochri cognomine, levavit manum suam contra regem David: tradite illum solum, et recedemus a civitate. Et ait mulier ad Ioab: Ecce caput eius mittetur ad te per murum.
Ọ bụghị otu a ka okwu ahụ dị. Otu nwoke a na-akpọ Sheba nwa Bikri, nke si nʼobodo ugwu Ifrem e weliela aka ya imegide eze, bụ Devid. Nyefee nwoke a ọsịịsọ nʼaka m, aga m esi nʼobodo a pụọ.” Nwanyị ahụ sịrị Joab, “A ga-atụpụtara gị isi ya site na mgbidi.”
22 Ingressa est ergo ad omnem populum, et locuta est eis sapienter: qui abscissum caput Sebae filii Bochri proiecerunt ad Ioab. et ille cecinit tuba, et recesserunt ab urbe, unusquisque in tabernacula sua: Ioab autem reversus est Ierusalem ad regem.
Nwanyị ahụ ji ndụmọdụ nke amamihe ya gakwuru ndị obodo. Ha bipụrụ Sheba nwa Bikri isi, tụpụtara ya Joab. Ya mere na ọ fụrụ opi ike ya, ndị ikom ya sitere nʼobodo ahụ lasaa, onye ọbụla lara nʼụlọ nke ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem.
23 Fuit ergo Ioab super omnem exercitum Israel: Banaias autem filius Ioiadae super Cerethaeos et Phelethaeos.
Ọ bụ Joab ka e mere onyeisi agha na-achị ndị agha niile nke Izrel. Benaya nwa Jehoiada bụ onye na-achịkọta ndị Keret na ndị Pelet na-eche eze nche.
24 Aduram vero super tributa: porro Iosaphat filius Ahilud, a commentariis.
Adoniram na-ahụ maka ihe banyere ndị ọrụ mmanye. Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta ihe niile na-eme nʼobodo.
25 Siva autem, scriba: Sadoc vero et Abiathar, sacerdotes.
Sheva bụ ode akwụkwọ eze, Zadọk na Abịata bụ ndị nchụaja.
26 Ira autem Iairites erat sacerdos David.
Ira, onye si nʼobodo Jaịa, bụ onye nchụaja eze Devid.

< Ii Samuelis 20 >