< Proverbiorum 24 >
1 Ne æmuleris viros malos, nec desideres esse cum eis:
Ekwosola ndị ajọ omume ekworo, ka ihe banyere ha ghara ịtọ gị ụtọ.
2 quia rapinas meditatur mens eorum, et fraudes labia eorum loquuntur.
Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike, egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara.
3 Sapientia ædificabitur domus, et prudentia roborabitur.
Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.
4 In doctrina replebuntur cellaria, universa substantia pretiosa et pulcherrima.
Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya, bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa.
5 Vir sapiens fortis est, et vir doctus robustus et validus:
Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike, ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha.
6 quia cum dispositione initur bellum, et erit salus ubi multa consilia sunt.
Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ, nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị.
7 Excelsa stulto sapientia; in porta non aperiet os suum.
Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu, ha gaghị asaghe ọnụ ha nʼọgbakọ ọnụ ụzọ ama.
8 Qui cogitat mala facere stultus vocabitur:
Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ
9 cogitatio stulti peccatum est, et abominatio hominum detractor.
Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie, ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị.
10 Si desperaveris lassus in die angustiæ, imminuetur fortitudo tua.
Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu, ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị.
11 Erue eos qui ducuntur ad mortem, et qui trahuntur ad interitum, liberare ne cesses.
Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ. Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi.
12 Si dixeris: Vires non suppetunt; qui inspector est cordis ipse intelligit: et servatorem animæ tuæ nihil fallit, reddetque homini juxta opera sua.
Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,” ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya? Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya? Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị?
13 Comede, fili mi, mel, quia bonum est, et favum dulcissimum gutturi tuo.
Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.
14 Sic et doctrina sapientiæ animæ tuæ: quam cum inveneris, habebis in novissimis spem, et spes tua non peribit.
Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ. Ọ bụrụ na i chọta ya i nwere olileanya nke ga-adịgide.
15 Ne insidieris, et quæras impietatem in domo justi, neque vastes requiem ejus.
Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume. A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya.
16 Septies enim cadet justus, et resurget: impii autem corruent in malum.
Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ. Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.
17 Cum ceciderit inimicus tuus ne gaudeas, et in ruina ejus ne exsultet cor tuum:
Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu. Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara.
18 ne forte videat Dominus, et displiceat ei, et auferat ab eo iram suam.
Nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ iwe iwe nʼihi ya megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ.
19 Ne contendas cum pessimis, nec æmuleris impios:
Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ.
20 quoniam non habent futurorum spem mali, et lucerna impiorum extinguetur.
Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume.
21 Time Dominum, fili mi, et regem, et cum detractoribus non commiscearis:
Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.
22 quoniam repente consurget perditio eorum, et ruinam utriusque quis novit?
Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?
23 Hæc quoque sapientibus. Cognoscere personam in judicio non est bonum.
Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma.
24 Qui dicunt impio: Justus es: maledicent eis populi, et detestabuntur eos tribus.
Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,” ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe.
25 Qui arguunt eum laudabuntur, et super ipsos veniet benedictio.
Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma, ha ga-anatakwa ezi ngọzị.
26 Labia deosculabitur qui recta verba respondet.
Ọsịsa ziri ezi bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.
27 Præpara foris opus tuum, et diligenter exerce agrum tuum, ut postea ædifices domum tuam.
Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi. Dozie ala ubi gị. Emesịa wuoro onwe gị ụlọ.
28 Ne sis testis frustra contra proximum tuum, nec lactes quemquam labiis tuis.
Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu. Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ?
29 Ne dicas: Quomodo fecit mihi, sic faciam ei; reddam unicuique secundum opus suum.
Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.”
30 Per agrum hominis pigri transivi, et per vineam viri stulti:
Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche,
31 et ecce totum repleverant urticæ, et operuerant superficiem ejus spinæ, et maceria lapidum destructa erat.
hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala.
32 Quod cum vidissem, posui in corde meo, et exemplo didici disciplinam.
Elegharịrị m ya anya site na ya mụta otu ihe a:
33 Parum, inquam, dormies, modicum dormitabis; pauxillum manus conseres ut quiescas:
Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike
34 et veniet tibi quasi cursor egestas, et mendicitas quasi vir armatus.
ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.