< مەرقۆس 14 >
جەژنی پەسخە و فەتیرە دوو ڕۆژی مابوو، کاهینانی باڵا و مامۆستایانی تەورات دەگەڕان بە فێڵێک عیسا بگرن و بیکوژن، | 1 |
Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya.
گوتیان: «با لە جەژندا نەبێت، نەوەک ئاژاوە بکەوێتە ناو خەڵک.» | 2 |
Ma ha kwuru sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme a, ka ọgbaaghara ghara ịdị.”
کاتێک عیسا لە گوندی بێتعەنیا بوو، لە ماڵی شیمۆنە گول لەسەر خوان بوو، ژنێک هات بوتڵێکی ئەلەباستەریی بۆنی ناردینی بێگەردی گرانبەهای پێبوو، بوتڵەکەی شکاند و بەسەریدا ڕژاند. | 3 |
Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi.
بەڵام هەندێک تووڕە بوون و بە یەکتریان گوت: «بۆچی بۆنەکە ئاوا بەفیڕۆ درا؟ | 4 |
Ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị mere e jiri laa mmanụ otite nke a nʼiyi otu a?
دەکرا ئەم بۆنە بە زیاتر لە سێ سەد دینار بفرۆشرایە و بدرایە بە هەژاران.» جا سەرزەنشتی ژنەکەیان کرد. | 5 |
A gaara ere mmanụ otite a ihe karịrị narị denarị atọ, were ego e retara ya nye ndị ogbenye.” Ha baara ya mba nʼolu ike.
بەڵام عیسا فەرمووی: «وازی لێ بهێنن. بۆچی بێزاری دەکەن؟ شتێکی چاکی بۆ من کرد. | 6 |
Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ.
هەژاران هەمیشە لەگەڵتانن، کەی ویستتان دەتوانن چاکەیان لەگەڵ بکەن، بەڵام من هەمیشە لەلاتان نیم. | 7 |
Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya.
ئەوەی لە دەستی هات کردی، زوو جەستەی منی بۆ ناشتن چەورکرد. | 8 |
O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya.
ڕاستیتان پێ دەڵێم: لە هەر شوێنێکی جیهاندا ئەم مزگێنییە ڕابگەیەنرێت، وەک یادکردنەوەیەک باسی ئەوەش دەکرێت کە ئەم ژنە کردوویەتی.» | 9 |
Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla a ga-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, ọrụ a ọ rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe ọma a o mere.”
یەهوزای ئەسخەریوتی کە یەکێک بوو لە دوازدە قوتابییەکە، چوو بۆ لای کاهینانی باڵا تاکو عیسا بە گرتن بدات. | 10 |
Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ jekwuuru ndịisi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara ya nye ha nʼaka.
کاتێک گوێیان لێبوو، دڵخۆش بوون و بەڵێنیان پێیدا زیوی بدەنێ. جا لە هەلێک دەگەڕا تاکو عیسا بە گرتن بدات. | 11 |
Mgbe ha nụrụ nke a, ha ṅụrịrị ọṅụ kwee ya nkwa inye ya ego. Site nʼụbọchị ahụ, o bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara ya nye ha.
لە یەکەم ڕۆژی جەژنی فەتیرەدا، کە بەرخی پەسخەیان سەردەبڕی، قوتابییەکانی لە عیسایان پرسی: «دەتەوێ بچینە کوێ ئامادەکاری بکەین، تاکو نانی پەسخە بخۆیت؟» | 12 |
Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?”
ئەویش دووان لە قوتابییەکانی نارد و پێی فەرموون: «بڕۆنە ناو شار، پیاوێک تووشتان دەبێت گۆزەیەک ئاوی هەڵگرتووە، دوای بکەون. | 13 |
O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya.
لەکوێ چووە ژوورەوە، بە خاوەن ماڵەکە بڵێن:”مامۆستا دەفەرموێ: کوا دیوەخانەکەم تاکو لەگەڵ قوتابییەکانم نانی پەسخەی تێدا بخۆم؟“ | 14 |
Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga?
ئەویش لە نهۆمی سەرەوە ژوورێکی گەورەتان پیشان دەدات، ڕاخراوە و ئامادە کراوە، لەوێ بۆمانی ئامادە بکەن.» | 15 |
Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.”
قوتابییەکان ڕۆیشتن و هاتنە شار، هەموو شتێکیان دۆزییەوە، هەروەک عیسا پێی فەرمووبوون. ئینجا نانی پەسخەیان ئامادە کرد. | 16 |
Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ.
کە ئێوارە داهات، عیسا لەگەڵ دوازدە قوتابییەکە هات. | 17 |
Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa.
پاڵیاندابووەوە نانیان دەخوارد، عیسا فەرمووی: «ڕاستیتان پێ دەڵێم، یەکێکتان وا لەگەڵم دەخوات، بە گرتنم دەدات.» | 18 |
Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!”
خەم دایگرتن و یەک لەدوای یەک گوتیان: «خۆ ئەو کەسە من نیم؟» | 19 |
Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?”
پێی فەرموون: «یەکێکە لەم دوازدەیە، ئەوەی لەگەڵم دەستی لەناو قاپەکەیە. | 20 |
Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere.
کوڕی مرۆڤ دەبێت وەک ئەوەی لەبارەیەوە نووسراوە بڕوات، بەڵام قوڕبەسەر ئەوەی کوڕی مرۆڤ بە گرتن دەدات! باشتر بوو بۆ ئەو کەسە هەر لەدایک نەبووایە.» | 21 |
Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
کاتێک نانیان دەخوارد، عیسا نانێکی هەڵگرت، سوپاسی خودای کرد و لەتی کرد، پێیدان و فەرمووی: «وەریبگرن، ئەمە جەستەی منە.» | 22 |
Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.”
ئینجا جامێکی هەڵگرت و سوپاسی خودای کرد، پێیدان و هەموو لێیان خواردەوە. | 23 |
Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ.
پێی فەرموون: «ئەمە خوێنی منە، خوێنی پەیمانەکەیە کە لە پێناوی خەڵکێکی زۆر دەڕژێت. | 24 |
Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ.
ڕاستیتان پێ دەڵێم: ئیتر لە بەرهەمی مێو ناخۆمەوە، هەتا ئەو ڕۆژە دێت کە سەر لە نوێ لە شانشینی خودا دەیخۆمەوە.» | 25 |
Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.”
ئینجا گۆرانیی ڕۆحییان گوت و چوون بۆ دەرەوەی شار بۆ کێوی زەیتوون. | 26 |
Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
عیسا پێی فەرموون: «هەمووتان پشتم تێ دەکەن، چونکە نووسراوە: «[لە شوانەکە دەدەم، مەڕەکان پەرت دەبن.] | 27 |
Jisọs sịrị ha, “Unu niile ga-agbahapụ m, nʼihi na e dere ya otu a sị, “‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.’
بەڵام دوای هەستانەوەم، پێشتان دەکەوم بۆ جەلیل.» | 28 |
Ma mgbe e mesịrị ka m si nʼọnwụ bilie, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.”
پەترۆس پێی گوت: «ئەگەر هەموو پشتت لێ بکەن، من پشتت لێ ناکەم.» | 29 |
Pita kwuru, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị, agaghị m eme otu a.”
عیسا پێی فەرموو: «ڕاستیت پێ دەڵێم: تۆ ئەمڕۆ، هەر ئەمشەو، پێش ئەوەی دوو جار کەڵەشێر بخوێنێت، سێ جار نکۆڵی لە ناسینی من دەکەیت.» | 30 |
Jisọs sịrị ya, “Ịgwa gị eziokwu, nʼụbọchị taa, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
بەڵام پەترۆس زیاتر پێداگری کرد و گوتی: «ئەگەر لەگەڵیشت بمرم، نکۆڵیت لێ ناکەم.» هەموو وایان گوت. | 31 |
O kwusịrị ike sị, “Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta, aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha niile kwuru.
پاشان چوونە شوێنێک پێی دەگوترا گەتسیمانی، بە قوتابییەکانی فەرموو: «لێرە دانیشن تاکو نوێژ دەکەم.» | 32 |
Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.”
ئەوسا پەترۆس و یاقوب و یۆحەنای لەگەڵ خۆی برد، هەستی بە دڵگرانی و دڵتەنگی دەکرد. | 33 |
Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri.
پێی فەرموون: «زۆر دڵتەنگم، خەریکە بمرم، لێرە بمێننەوە و ئێشک بگرن.» | 34 |
Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.”
کەمێک دوورکەوتەوە و خۆی خستە سەر زەوی، نوێژی کرد تاکو ئەگەر بکرێت کاتەکەی بەسەردا تێبپەڕێت. | 35 |
Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya.
فەرمووی: «بابە! باوکە، هەموو شتێک بۆ تۆ دەبێت، ئەم جامەم لەسەر لاببە، بەڵام نەک بە خواستی من، بەڵکو بە خواستی تۆ.» | 36 |
O kwuru sị, “Abba, Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”
گەڕایەوە بینی نوستوون، بە پەترۆسی فەرموو: «شیمۆن نوستوویت؟ نەتتوانی کاتژمێرێک ئێشک بگریت؟ | 37 |
Ọ bịara hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Saimọn, ị na-arahụ ụra? Ọ bụ na ị nweghị ike iche nche otu awa?
ئێشک بگرن و نوێژ بکەن، تاکو نەکەونە ناو تاقیکردنەوەوە. ڕۆح چالاکە بەڵام جەستە لاوازە.» | 38 |
Nọrọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa. Mmụọ dị ike ma anụ ahụ adịghị ike.”
دیسان ڕۆیشتەوە و نوێژی کرد، هەمان وتەی دووبارە کردەوە. | 39 |
Ọ pụkwara ọzọ, gaa kpee ekpere, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
کاتێک کە دووبارە گەڕایەوە، بینی نوستوون، چونکە چاویان قورس ببوو، نەیانزانی چۆن وەڵامی بدەنەوە. | 40 |
Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ nke ukwuu. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya.
سێیەم جار گەڕایەوە، پێی فەرموون: «هێشتا نوستوون و پشوو دەدەن؟ بەسە! کاتەکە هاتووە. ئەوەتا کوڕی مرۆڤ دەدرێتە دەست گوناهباران. | 41 |
Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra na-ezukwa ike? O zuola! Oge awa ahụ abịala. Lee, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie.
هەستن با بڕۆین، ئەوەتا ئەوەی بە گرتنم دەدات نزیک بووەوە.» | 42 |
Bilienụ! Ka anyị gawa! Lee, onye na-arara m nye nọ nso.”
کاتێک هێشتا عیسا قسەی دەکرد، لەناکاو یەهوزا گەیشت کە یەکێک بوو لە دوازدە قوتابییەکە. کۆمەڵە خەڵکێکی لەگەڵ بوو لەلایەن کاهینانی باڵا و مامۆستایانی تەورات و پیرانەوە نێردرابوون، شمشێر و داریان پێبوو. | 43 |
Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ batara, ya na igwe mmadụ, ndị ji mma agha na mkpọ. Ọ bụ ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu, na ndị ode akwụkwọ, na ndị okenye ndị Juu zitere ha.
ئەوەی بە گرتنی دەدا نیشانەیەکی پێدابوون، گوتبووی: «ئەوەی ماچی دەکەم، ئەوە خۆیەتی، بیگرن و بە پاسەوانییەوە بیبەن.» | 44 |
Ma onye na-arara ya nye, nyere ha rịị ihe ịrịbama sị, “Onye ahụ nke m ga-esutu ọnụ bụ ya; jidenụ ya, kpụrụnụ ya gawa, ma jidesiekwanụ ya ike.”
هەرکە یەهوزا گەیشت، چوو بۆ لای عیسا و گوتی: «ڕابی!» و ماچی کرد. | 45 |
Ngwangwa o jekwuuru Jisọs, sị ya, “Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
ئیتر دەستبەسەریان کرد و گرتییان. | 46 |
Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike.
بەڵام یەکێک لە ئامادەبووان، شمشێرەکەی هەڵکێشا، لە خزمەتکاری سەرۆکی کاهینانی دا و گوێی بڕی. | 47 |
Ma otu onye nʼime ndị guzo nʼebe ahụ, mịpụtara mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya.
عیساش پێی فەرموون: «ئایا من کەسێکی یاخیبووم کە بە کوتەک و شمشێرەوە هاتوون بمگرن؟ | 48 |
Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m?
ڕۆژانە لە حەوشەکانی پەرستگا لەگەڵتان بووم خەریکی فێرکردن بووم، نەتانگرتم، بەڵام دەبێت نووسراوە پیرۆزەکان بێنە دی.» | 49 |
Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.”
ئینجا هەموو بەجێیان هێشت و ڕایانکرد. | 50 |
Mgbe ahụ, ha niile hapụrụ ya gbalaga.
گەنجێک دوای عیسا کەوت کە تەنها بە پارچە کەتانێک ڕووتییەکەی داپۆشیبوو. کاتێک گرتیان، | 51 |
Ọ dị otu nwokorobịa na-eso ya, ọ ji naanị akwa ọcha linin kpuchie onwe ya. Mgbe ha jidere ya,
کەتانەکەی بەجێهێشت و بە ڕووتی ڕایکرد. | 52 |
ọ hapụụrụ ha akwa ọcha linin ya, gbara ọtọ gbalaga.
عیسایان بردە لای سەرۆکی کاهینان، هەموو کاهینانی باڵا و پیران و مامۆستایانی تەورات کۆبوونەوە. | 53 |
Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ.
پەترۆسیش دووربەدوور تاکو ناو حەوشەی ماڵی سەرۆکی کاهینان دوای کەوت، لەگەڵ خزمەتکاران لەبەردەم ئاگر دانیشتبوو خۆی گەرم دەکردەوە. | 54 |
Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ.
کاهینانی باڵا و هەموو ئەندامانی ئەنجومەنی باڵای جولەکە بەدوای شایەتییەک دەگەڕان لەسەر عیسا تاکو سزای کوشتنی بەسەردا بدەن، بەڵام دەستیان نەکەوت. | 55 |
Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara.
کەسانێکی زۆر بە درۆ شایەتییان لەسەری دا، بەڵام شایەتییەکانیان یەکیان نەدەگرتەوە. | 56 |
Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu.
هەندێک هەستان و بە درۆ شایەتییان لەسەری دا و گوتیان: | 57 |
Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị,
«گوێمان لێی بوو دەیگوت:”ئەم پەرستگایەی دەستکردی مرۆڤە دەیڕووخێنم، بە سێ ڕۆژ یەکێکی دیکە بنیاد دەنێم کە دەستکردی مرۆڤ نەبێت.“» | 58 |
“Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’”
لەمەشدا شایەتییەکەیان کۆک نەبوو. | 59 |
Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu.
سەرۆکی کاهینانیش لەناوەڕاست ڕاوەستا و لە عیسای پرسی: «هیچ وەڵام نادەیتەوە؟ ئەم پیاوانە چ شایەتییەکت لەسەر دەدەن؟» | 60 |
Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?”
بەڵام عیسا بێدەنگ مایەوە و هیچ وەڵامی نەدایەوە. دیسان سەرۆکی کاهینان لێی پرسی و پێی گوت: «ئایا تۆ مەسیحەکەی، کوڕی خودای پیرۆز؟» | 61 |
Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla. Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?”
عیسا فەرمووی: «من ئەوم. لە داهاتووش دەبینن کوڕی مرۆڤ لە دەستەڕاستی خودای توانادار دادەنیشێت و بەسەر هەوری ئاسمانەوە دێتەوە.» | 62 |
Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
سەرۆکی کاهینان جلەکانی خۆی دادڕی و گوتی: «ئیتر چ پێویستیمان بە شایەت هەیە؟ | 63 |
Onyeisi nchụaja dọwara uwe ya kwuo sị, “Gịnị mere anyị ji achọ ndị akaebe ọzọ?
خۆ گوێتان لە کفرەکە بوو، ڕاتان چییە؟» هەموو بڕیاریان دا کە شایانی مردنە. | 64 |
Unu anụla okwu nkwulu si ya nʼọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha niile mara ya ikpe sị, “O kwesiri ka ọ nwụọ!”
هەندێک کەوتنە تف لێکردنی، دەم و چاویان داپۆشی و لێیان دەدا، پێیان دەگوت: «ئەگەر پێغەمبەریت، بزانە کێ بوو لێیدایت؟» پاسەوانەکانیش گرتییان و دایانە بەر زللە. | 65 |
Mgbe ahụ ụfọdụ bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri asọ, jiri akwa kechie ya anya, tiekwa ya aka na-asị, “Buo amụma!” Ndị nche kpụpụtara ya tiekwa ya ihe.
پەترۆس لە خوارەوە لە حەوشەکە بوو، یەکێک لە کارەکەرانی سەرۆکی کاهینان هات. | 66 |
Dịka Pita nọ nʼobi ahụ, otu nʼime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịara nso ebe ọ nọ.
پەترۆسی بینی خۆی گەرم دەکاتەوە، تێیڕوانی و گوتی: «تۆش لەگەڵ عیسای ناسیرەیی بوویت.» | 67 |
Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o leziri ya anya nke ọma, sị, “Ị bụ otu nʼime ndị na-eso Jisọs onye Nazaret ahụ.”
بەڵام پەترۆس نکۆڵیی کرد و گوتی: «نازانم، تێناگەم چی دەڵێی.» چووە داڵانەکە. ئینجا کەڵەشێر خوێندی. | 68 |
Ma ọ gọrọ agọ sị, “Amaghị m, maọbụ ghọtakwa ihe ị na-ekwu.” Ma ọ pụrụ gaa nʼụzọ e si abata. Mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa.
کارەکەرەکە بینییەوە، بەوانەی گوتەوە کە لەوێدا ڕاوەستابوون: «ئەمەش لەوانە.» | 69 |
Mgbe nwaagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nʼime ha.”
دیسان نکۆڵیی کرد. پاش کەمێک ئەوانەی لەوێدا ڕاوەستابوون، بە پەترۆسیان گوت: «بە ڕاستی تۆ لەوانیت، چونکە تۆش جەلیلیت.» | 70 |
Ma ọ gọkwara agọ ọzọ. Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ otu nʼime ha, nʼihi na ị bụ onye Galili.”
دەستی کرد بە نەفرەتکردن و سوێندخواردن و گوتی: «ئەم کابرایەی باسی دەکەن نایناسم.» | 71 |
Mgbe ahụ o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi na-asị, “Amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.”
دەستبەجێ کەڵەشێر بۆ دووەم جار خوێندی، پەترۆسیش قسەکەی عیسای بیرکەوتەوە کە پێی فەرمووبوو: «پێش ئەوەی دوو جار کەڵەشێر بخوێنێت، سێ جار نکۆڵیم لێ دەکەیت.» خۆی پێ نەگیرا و گریا. | 72 |
Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa.