< Insinulo 21 >

1 Linu chinabona iwulu ihya ni nikanda inhya, mukuti iwulu lyetanzi ni inkanda lyetanzi zibamani, imi kana kubasina iwate.
Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa.
2 Chinabona muleneñi, Jerusalema muhya, kuti chilizwa mukati kewulu kuzwa kwe Ireeza, yolibakanya sina museswa yolilotuseza muhyabwe.
Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya.
3 Nibazuwi inzwi inkando lizwa hachihuna licho, “Bone! Chibaka chabwikalo bwa Ireeza chinakubantu, imi mwahale nabo. Kababe bantu bakwe, imi Ireeza iyemwine kabenabo imi kabe Ireeza wabo.
Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha.
4 Kasinde zisonzi zonse mumenso abo, imi kese nikube nifu, kapa kubilayela, kapa kulila, kapa kuchiswa. Zintu zakale zibahiti.
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.”
5 Yabakele hachihuna chati, “Bone! Nipanga zintu zonse buhya,” Nati, “Ñole izi hansi kakuli aa manzwi asakusima ni buniti.”
Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”
6 Chati kwangu, “Izi zintu chizamana! Njime wetanzi ni wamamani mani, wa matanginzo ni wa mamaninizo. Yofwile innyotwa kanimuhe chakunywa nikusena chaliha kuzwa muchisima chamenzi abuhalo.
Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye.
7 Yetanazunde kayole izi zintu, imi Kanibe Ireeza wakwe, imi kabe mwan'a ngu.
Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m.
8 Kono kumapyeha, betumelo inini, basenahabekele, behayi, basangu, balozi bachikwame, balapela maswaniso, imi nimasawana bonse, chibaka chabo kachibe chiziba chamulilo umbukuka wo bumbe. Njokuti njefu lyabubeli.” (Limnē Pyr g3041 g4442)
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.” (Limnē Pyr g3041 g4442)
9 Limwi kumañiloi atenda iyanza in obele chilyeza kwangu, limwi libakukwete tuhambwe twizwile inziyezi zikwana iyanza nitobele, imi chati, “Wize kunu. Munikutondeze museswa, mwihyabwe we Mbelele.”
Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.”
10 Linu chanitwala Muluhuho helundu inkando liwumbukite imi nikunitondeza muleneñi uchenete wa Jerusalema niukazwa kwiwulu kwe Ireeza kwiza hansi.
O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata.
11 Jerusalema ibene ikanya ya Ireeza, imi iseli lyateni libenya sina ibwe lyabutokwa, sina ibwe lyajaspe libelela sina kristal.
O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal.
12 Ubikitwe mulukwakwa lukando lule kwina milyango ikwana ikumi ni yobele, ni mañiloi akwana ikumi niwobele. Imi hamilwango habañoletwe mazina abana ba Isilaele akwana ikumi ni wobele.
Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu.
Ọnụ ụzọ ama atọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, atọ dị nʼakụkụ ugwu, atọ dị nʼakụkụ ndịda, ebe atọ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
14 Imota lya muleneñi libena mitomo, ina ikumi ni milyango yobele, imi kwili kubena mazina ene ikumi ni obele abalutwana bena ikumi ni bobele be Imbelele.
Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.
15 Yabawambi name abena inkoli yakupimisa ibatendwa chegauda kupimisa Muleneñi, milyango ni mamota ateni.
Onye ahụ na-agwa m okwu ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nʼaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ama ya, na mgbidi ya.
16 Muleneñi ubazalitwa chenkona zone; bule bwateni bubali kulikanelela ni mubufuhi bwateni, Abapimi muleneñi chenkoli yakupimisa, zikiti zina ikumi ni zobele mubule (bule bwao, zibalikuswana).
Nʼobodo ahụ, enweghị otu akụkụ nʼime akụkụ anọ nke mgbidi ya karịrị ibe ya. Ogologo ya na obodobo ya ha otu. O ji ihe ọtụtụ tụọ ya, ogologo ya na obodobo nakwa ịdị elu ya ha, ọtụtụ ya dị puku kilomita abụọ na narị kilomita abụọ.
17 Abapimi bulyo ni mota lyateni, bukima bwamakiyibbu ena 144 chamupimino wabuntu (Ili ichita chipimo cheñiloi hape).
Ọ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ, dịka ihe ọtụtụ nke mmụọ ozi ahụ si gụpụta.
18 Imota libazakwa chajaspe ni muleneñi chegauda ineine, ni gilasi ibelela.
Ihe e ji rụọ mgbidi ya bụ nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa, jiri ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwu dịka enyo dị ọcha rụọ obodo ahụ.
19 Mitomo yamamota abakabiswe chamabwe amifuta yonse. Chetanzi ibali jaspa, chabubeli ibali safiro, chabutatu ibali kalesedo, chabune ibali emeralda,
E ji nkume niile dị oke ọnụahịa chọọ ntọala mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala nke mbụ, bụ nkume a na-akpọ jaspa, ntọala nke abụọ, nkume a na-akpọ safaia, ntọala nke atọ, nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ, nkume a na-akpọ emeralụdụ,
20 Chikwana iyanza ibali sardlusi, chikwana iyanza ni chimwina ibali sardiyo, chikwana iyanza ni zobele ibali krisolito, chikwana iyanza ni zotatwe ibali berilo, chikwana iyanza ni zone ibali topazo, chikwana ikumi ibali krizoprazo, chikwana ikumi ni chimwina ibali jasinto, mi chikwana ikumi ni zobele ibali ametisto.
nke ise, nkume a na-akpọ ọniks, nke isii, nkume a na-akpọ kanelian, nke asaa, nkume a na-akpọ krisolaịt, nke asatọ, nkume a na-akpọ beril, nke itoolu, nkume a na-akpọ topaazi, nke iri, nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu, nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ, nkume a na-akpọ ametisiti.
21 Ziyazo zamilyango zibena ikumi ni zobele zibali zalipelela; umwi ni umwi wamilyango ubapangiwa hepelela yonke. Mikwakwa yamuleneñi ibali yagauda yineyine, sina igilazi ibelela.
Ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ bụ pieal iri na abụọ, ọnụ ụzọ ama ọbụla ka e ji otu nkume pieal rụọ nʼotu nʼotu. Ihe e ji rụọ okporoụzọ dị nʼobodo ahụ bụ naanị ọlaedo a nụchara anụcha ọbụla, nke dị ọcha dịka enyo e hichaziri nke ọma.
22 Kananibaboni itempele mumuleneñi, chokuti Simwine Ireeza wina Maata Wonse ni Mbelele bekele mwitempele.
O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere.
23 Muleneñi kakubena intokwahalo yezuba kapa mwezi ili kutu kubenye mukuti ikanyaye Ireeza ibamuniki hateni, mi ilambi lyate imbelele.
Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ.
24 Mishobo kayiwambe cheli iseli lyowuna muleneñi. Malena bahansi kabalete chifumu chabo muwuli. Mushobo wete upuluswe kawuwambe cheseli lyowuna muleneñi.
Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya.
25 Minyango yateni keti niyiyale mukati kezuba, mi ketenikube masiku kwateni.
A naghị emechi ọnụ ụzọ ama obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị niile nʼihi abalị ọbụla adịghịkwa nʼebe ahụ.
26 Kabalete mwateni chifumu chabo ni tompo yakumisho yabo,
Ebube na nsọpụrụ nke mba niile ka a ga-ewebata nʼime ya.
27 mikakwina chisajololi cheti nichinjile mwateni. Kapa zumwi ni zumwi yotenda chintu chonse chiswabisa kapa chichenga yeti nenjile, kono haisi abo bamazina añoletwe muMbuka ye Mbelele ya Buhalo.
Ọ dịkwaghị ihe ọbụla rụrụ arụ ga-abata nʼime ya. Otu a kwa, ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, maọbụ onye ụgha ga-abata nʼime ya, kama ọ bụ naanị ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ.

< Insinulo 21 >