< Mateu 4 >
1 Lyahanu Jesu ca kashiwa ku luhuho lu jolola kuya mwi halaupa ku ku likiwa kwa Jabulusi.
Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.
2 Halinyima zilyo mazuva ena makumi one ni masiku ena makumi one, ca fwa inzala.
Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
3 Muliki neza kuwamba kwali, “Haiva u mwana we Ireza, u laele aa mabwe a sanduke zilyo”
Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.”
4 Mi Jesu ne tava cati kwali, “ku ñoletwe, 'Muntu kete na hale ca zilyo vulyo, kono ni ca liinzwi li zwa mukaholo ka Ireza'”
Ma Jisọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịchaka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’”
5 Linu Javulisi ca mu hinda kumu twala he wulu lwa muzako ujolola uva ketiwa we nkereke mulelele,
Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu,
6 Ni ku mu wamvila kuti, “Haiva njewe u mwana wa Ireza, uwile hansi kakuli ku ñoletwe, ka laele mañeloi akwe mu aku vavalele, mu aku nyamune mu mayanza nji kuti itende lyako kanji li gunkiwa ibwe
sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’”
7 Jesu nati kwali, “Hape u ñoletwe, Kanji u liki infumwako Ireza.
Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’”
8 “Hape Javulusi na mu hinda kumu twala he lundu lilumbite, ni kumu tondeza mileneñi ina munkanda yonse ni nkanya yayo.
Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.
9 Nati kwali, “Zonse izi zintu kani zikuhe, ci wa wila hansi ca mazwi. uni fukamine uni lapele”
Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.”
10 Linu Jesu ca muta, “U zwe aha Javulusi! kakuli ku ñoletwe, “U fukamine Ireza i nfumwako, imi u seveleze iye yeke”
Ma Jisọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’”
11 Javulusi ca musiya; mi mañeloi ci eza kwa Jesu, ci a mu seveleza.
Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi.
12 Haho linu Jesu ca zuwa kuti Joani avva suminwa, na vola kwa Galilea;
Mgbe Jisọs nụrụ na e tinyela Jọn nʼụlọ mkpọrọ, ọ pụrụ gaa Galili.
13 Ca kuula kwa Nazareta ku ka zaka kwa Kapenauma, i wanika kumbali ni wate lya Galilea, mu cilalo ca Zevuloni ni Nafitali.
Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm, bụ obodo dị nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nʼoke ala Zebụlọn na Naftalị.
14 Izi ziva pangahali kwi zuziliza ci polofita ca Isaya ha vati,
Nʼụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sịrị,
15 “Inkanda ya Zavuloni ni nkanda ya Nafitali i vambene ni wate, mwi shilwa lwa Jodani, Galilea ya vantu vasena vavezi Ireza;
“Ala Zebụlọn na ala Naftalị, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ,
16 Vantu va vena mwififi, va va voni iseli ikando; linu va vena munkanda yefu ni mumu nzunde walyo, vava ñaatwilwa iseli”
ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.”
17 Kuzwa iyo nako Jesu na tanga ku kutaza nati, “Mu vake, mukuti mubuso wa kwiwulu ci wina hafuhi”
Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”
18 Havali kwa vwenda ku mbali ye wate lwa Galilea, ca vona vakwame vovele vana va muntu yenke, Simone yo sumpwa Pitolosi, ni Andriyasi mwancakwe, ci va sohela tunyandi twavo mwi wate, kakuli vavali vandui.
Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ.
19 Jesu cati ku vali, “mwize, municilile, imi muni mi pange vayamvi va vantu”
Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
20 Haho niva siya tunyandi twavo, kumwi cilila.
Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya.
21 Jesu hvvali kwa vu yenda vulyo ca vona vovele vamwi, Jakovo mwana wa Zebediya, ni Joani mwancakwe, va vena mu cisepe ni Zevediya ishavo, ni va onga tunyandi twavo. ca va sumpa;
Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha,
22 Haho civa siya cisepe ni shavo, kumwi cilila.
ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.
23 Jesu na yenda mwa Galilea yonse, na ka ruta vantu mumasinagoge avo, nava wambila ivangeli ya muvuso, na hoza matuku onse ni vuhole vonse vuvena ku vantu.
Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ.
24 Intava zakwe ci za ka zuweka kwa Siriya yonse; ni kwa letwa kwali valwala vonse malwalo a cincana cincana, ni va katazehete, ni va vena inhuho imbi, ni vava li ku liwa kuzuminina, ni vava li ku zuminina luñañali; Jesu ca va hoza.
Akụkọ banyere ya gbasara jezuo akụkụ Siria niile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha niile.
25 Vungi vwavo vu a kuzwa kwa Galilea, ni kwa Dekapolisi, ni kwa Jelusalema, ni kwa Judeya, ni mwishilwa lya Joludani, ci vwa mwi cilila.
Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs, Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya.