< Mareka 10 >
1 Jesu na asiya china chivaka ni kuyenda ku chikiriti cha Judeya niku chivaka mwishilya lyalwizi lwaJorodani, imi chinavuungi ni cheza kwaali hape. Ava kuvaluta hape, uvu hauvali mukwa wake.
Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼobodo ndị dị na mpaghara Judịa ma gafeekwa nʼofe Jọdan. Igwe mmadụ bịakwutekwara ya, ọzọ, dị ka o si emekwa, o ziri ha ihe.
2 Imi vafarisi chiveeza kwali kukumulika ni kuvuuza, Kuyelele ku mukwame ku kaana mwihyavwe?”
Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?”
3 Netava, “Chinzi chava milaeli Mushe?”
Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?”
4 “Chivati, “Mushe ava zuminini mukwame kuñola iñolo lye nkauhano nikumutanda.”
Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.”
5 “Ivaali kukukutuhala kwe nkulo zenu chingi avamiñoleli uwu mulao,” Jesu naati kuvali.
Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a.
6 Kono kumatangilo empupo, 'Ireeza avavapangi mukwame ni mwanakazi.'
Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’
7 Cheli ivaka mukwame kasiye vesi ni vanyina ni ku ñambatila kwa mwihyabwe,
‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya.
8 mi vovele kavave inyama imwiina. 'mukuti kavasili vovele, kono inyama imwiina.
Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ.
9 Kuzwaho Ireeza chavakopanyi hamwiina, ka kwina muntu yochihita hakati.”
Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”
10 Havaveena munzuvo, valutwana chiva muvuza hape ku amana nezi.
Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a.
11 Naati kuvali, “Yense yokana mwihyabwe niku sesa ungi mwanakazi uchita vusangu kwali.
Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya.
12 hakana mwihyabwe niku seswa kuungi mukwame, uchita vusangu.”
Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”
13 Chivaleeta vahwilezana vavo kwali kuti pona chova woondava, imi valutwana chivava kalimela.
Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o metụ ha aka, ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba.
14 Kono Jesu hachailemuha, kenaava taveli ni kucho kuvali, “Muzuminine vahwilezana kwiza kwangu, kanji mu vakanini, mukuti muvuso wa Ireeza waavo vaswana naavo.
Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, ọ sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a.
15 Chovusakusima niti kwenu, yense yasa satambuli muvuso wa Ireeza uvu muhwilezana cheniti kete naaka winjile.”
Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla nke na-agaghị anabata alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.”
16 Linu chahinda vahwilezana ni ku va kumbata mu mavoko akwe niku vafuyola chaku vika mayanza akwe havali.
Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha.
17 Imi hatanga lweendo lwakwe, mukwame chatilila kwali ni kukamufukama havusu bwakwe, ni kuvuza, “Muluti wina nenza, chinzi chinitamehete ku chita kuti niyole vuhalo vusamani?” (aiōnios )
Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” (aiōnios )
18 “Imi Jesu nati, “chinzi honisumpa wina nenza? Kakwina wina nenza, mbwita Ireeza yeyena.
Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.
19 Mwizi intaelo: kanji wihayi, kanji utendi vusangu, kanji wivi, kanji upaki mapa, kanji uchengeleli, kuteke isoo ni nyoko.”
Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’”
20 Mukwame nati, “Muluti, zonse izi zintu nibazikuteki kuzwa kubuhya bwangu.”
Ọ sịrị ya, “E, onye ozizi, Edebezuchaala m ha niile siterị na mgbe m bụ nwata.”
21 Jesu chikumulola ni kumusuna. Chati kwali, “Chintu chimwina chobulite. Utamehete kuwuza zonse zokwete ni kuziha kubahumanehi, imi kove ni chifumu chakwiwulu. Linu wize, nichilile.”
Jisọs lere ya anya, hụ ya nʼanya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ọ fọdụrụ naanị otu ihe ị ga-eme. Laa, ugbu a, ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nʼeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.”
22 Kono chevaka lyechi chiwambo, naboneka kuwilwa hahulu chazwaho ni kuyenda imi nayenda naswabite, mukuti abena chifumu chingi.
Mgbe ọ nụrụ okwu a, ihu ya gbarụrụ. O sitere nʼebe ahụ pụọ na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya nke nwere ọtụtụ akụnụba.
23 Jesu nalolalola nikucho varutwana vakwe, “Kukutu vuti ku vahumine kwinjila muvuso wa Ireeza!”
Jisọs legharịrị anya gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe rara ahụ na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze Chineke.”
24 Varutwana niva komokiswa kuziwambo zakwe. Imi Jesu navolela kucho kuvali, “Vahwile, ku ka vo vule kwi njile mu muvuso we Ireeza!
Okwu ya tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya, ma Jisọs gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị, ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ ịbanye nʼalaeze Chineke.
25 Ku huva kuti i kamere injile muliso lye ndonga, ku hita muntu wo muhumi kwi njila mu muvuso we Ireeza.”
Ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
26 Vava komokwa vukando ni kuwambisana, “Linu njeni yowola kuhazwa?”
Okwu a jubigara ha anya oke. Ha jụrịtara ibe ha sị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
27 Jesu chavalola ni kucho, “Nivantu kakuwoleki, kono isiñi niIreeza. Mukuti zonse zintu ziwoleka chaIreeza.”
Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.”
28 Pitolosi natanga kuwamba kwali, “Lole, tuvaka siyi zintu zonse ni kukwichilila.”
Pita malitere ịgwa ya sị, “Anyị ahapụla ihe niile soro gị!”
29 Jesu nati, “Chavusakusima nicho kwenu, kakwina waka siya inzubo, kamba vanaswisu, kamba vanakazana, kamba vanyina, kamba vesi, kamba vahwile, kamba inkanda, kachangu, nicheIvangeli,
Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a,
30 Yaseti natambule chamwandaa kuvuungi hahanu mweinu inkanda: mazuvo, ni vanaswisu, ni vanakazana, ni vanyina, ni vahwile, ni zivaka, chamasukuluka, ni munkanda ikeza, vuhalo vusamani. (aiōn , aiōnios )
nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ. (aiōn , aiōnios )
31 Kono vangi vahitile kavave va mamani-mani, ni vamamani-mani kuva matangilo.”
Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ọtụtụ ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”
32 Vavena mumugwagwa, kuya kwa Jerusalema, imi Jesu avena havunsu vwavo. Varutwana vava komoketwe, ni vavamwichilile vavatite. Linu Jesu nahinda vamana mayanza ovele nivovele kumbali hape nikutanga kuva wambila zete chiziwola kutendahala haho kwali.
Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya.
33 “Muvone, tukaya hesi kwa Jerusalema, imi Mwana Muntu kakahewe kuvapurisita vakulwana ni Vañoli.
Ọ sịrị, “Leenụ, anyị na-aga Jerusalem, ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ.
34 Kava munyanse hesi kulufu nikumuha kuVamachava. Kavamukuve, kumuswila, kumushupa, ni kumwihaya. Kono chikwahita mazuva otatwe kavuke.”
Ha ga-akwa ya emo, gbụsakwa ya ọnụ mmiri asụ, pịa ya ihe ma gbukwaa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie.”
35 Jakobo ni Johani, vaana swisu va Zevedia, chiveza kwali ni kumuti, “Muluti, tusaka kuti iwe ututendele zonse zitu kukumbila.”
Jemis na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere ya. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọbụla anyị rịọrọ.”
36 Chati kuvali, “Chinzi chimusaka kuti nimi tendele?”
Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
37 Chivati, “Tu zuminine kwikala nawe mwi kanya yako, umwi kuvulyo vwako ni umwi ku vunzohoto vwako.”
Ha sịrị ya, “Kwere ka otu onye nʼime anyị nọrọ nʼaka nri gị, onye nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼime ebube gị.”
38 Kono Jesu chavetava, “Ka mwizi chimukwete kukumbila. Muwola kunywa munkomoki yete ni nywe kamba kuva munkolovezo yete ni kolovezwe chayo?”
Ma Jisọs sịrị ha, “Unu amataghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ mụ onwe m ga-aṅụ maọbụ bụrụ ndị a ga-eme ụdị baptizim a ga-eme m?”
39 “Chivacho kwali, “Tuwola” Jesu nati kuvali, “Inkomoki yete ninywe, mumuinywe. imi ninkolovezo ini kolovezwe chayo, nanwe kamu ikolovezwe.
Ha zaghachiri ya, “Anyị pụrụ.” Jisọs sịrị ha, “Unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim nke a ga-eme m.
40 Imi njeni yete chiwikala kuvulyo vweyanza lyangu kamba ku vunzohoto vweyanza lyangu kahena njikwangu kuha, kono njikwavo avo vava ivikiilwe.”
Ma ịnọdụ nʼaka nri m maọbụ nʼaka ekpe m abụghị ihe dịrị m inye, kama ọnọdụ ndị a dịịrị ndị a kwadooro ha.”
41 Vamwi varutwana vena ikumi havazuwa ichi, chivataanga ku nyerererwa Jakovo ni Johani.
Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nụrụ nke a, iwe jupụtara ha obi nʼihi Jemis na Jọn.
42 Jesu chava sumpila kwali nikucho, “Mwizi avo vezibahele kuva vayendisi va Machava vava lyatilila, ni vantu va sepahala vavelekisa mulao mukando hewulu lyavo.
Ma Jisọs kpọkọtara ha niile sị ha, “Dị ka unu onwe unu maara, ndị eze nke ndị mba ọzọ, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha.
43 Kono ketenikuve bulyo mukati kenu. Yense yosaka kuva mukando mukati kenu uyelela kuva muhikana wenu,
Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama onye ọbụla chọrọ ịdị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.
44 ni yense yosaka kuva kuvusu mukati kenu uyelela kuva chikombwa chavonse.
Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu, ga-abụ ohu mmadụ niile.
45 Mukuti Mwana Muntu kena avakezi ku kutendelwa, kono kukutenda, ni kwiza kuha vuhalo bwakwe kulukulula vaangi.”
Nʼihi na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi. Kama ka o jee ozi ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”
46 Chiveza kwa Jeriko. Havali kuzwa mwa Jeriko ni varutwana vakwe ni chinavuungi, mwana wa Timea, Vatimeya, mukumbiiri wachivofu, Avekele kumbali ninzila.
Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara “nwa nwoke Timiọs”), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ.
47 Hazuwa kuti nji Jesu wa Nazareni, chatanga kuhuwa ni kuwamba, “Jesu, Mwana wa Dafita, nifwile inse!”
Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!”
48 Vaangi chiva kalimela chivofu chamumbila kuti atontole. Kono chahuwa kuekeza, “Mwana Dafita, ni fwile inse!”
Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere m ebere!”
49 Jesu chazimana ni kulaela kuti asumpwe. Chiva sumpa chivofu chamukwame, nivati “U kole, “Ziimane! U ku sumpa.”
Jisọs kwụsịrị kwuo sị, “Kpọọnụ ya.” Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, “Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, ọ na-akpọ gị.”
50 Cha sohela kuna inguvo yakwe, kulotoka, nikwiza kwa Jesu.
Ọ tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs.
51 Imi Jesu chamwitava nacho, “Chinzi chosaka kuti nikuchitile?” Chivofu cha mukwame chichati, “Muluti wangu, nisaka kuvolelwa kuvona kwangu.”
Jisọs sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Onye ìsì ahụ sịrị ya, “Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ.”
52 Imi Jesu nacho kwaali, “Kwiya. Itumero yako chiyakuhaza. “Hohyaho chawola kuvoona hape, nikumwichilila munzila.
Jisọs sịrị ya, “Laa, okwukwe gị azọpụtala gị.” Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.