< 전도서 5 >
1 너는 하나님의 전에 들어갈 때에 네 발을 삼갈지어다 가까이 하여 말씀을 듣는 것이 우매자의 제사 드리는 것보다 나으니 저희는 악을 행하면서도 깨닫지 못함이니라
Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ.
2 너는 하나님 앞에서 함부로 입을 열지 말며 급한 마음으로 말을 내지 말라 하나님은 하늘에 계시고 너는 땅에 있음이니라 그런즉 마땅히 말을 적게 할 것이라
Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị, maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu. Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe ma naanị nʼụwa ka ị nọ, nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole.
3 일이 많으면 꿈이 생기고 말이 많으면 우매자의 소리가 나타나느니라
Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ, otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ.
4 네가 하나님께 서원하였거든 갚기를 더디게 말라 하나님은 우매자를 기뻐하지 아니하시나니 서원한 것을 갚으라
Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke.
5 서원하고 갚지 아니하는 것보다 서원하지 아니하는 것이 나으니
Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya.
6 네 입으로 네 육체를 범죄케 말라 사자 앞에서 내가 서원한 것이 실수라고 말하지 말라 어찌 하나님으로 네 말소리를 진노하사 네 손으로 한 것을 멸하시게 하랴
Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị?
7 꿈이 많으면 헛된 것이 많고 말이 많아도 그러하니 오직 너는 하나님을 경외할지니라
Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke.
8 너는 어느 도에서든지 빈민을 학대하는 것과 공의를 박멸하는 것을 볼지라도 그것을 이상히 여기지 말라 높은 자보다 더 높은 자가 감찰하고 그들보다 더 높은 자들이 있음이니라
Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu ndị ogbenye, na-anapụkwa ha ihe ruru ha site nʼikpe ikpe na-ezighị ezi na mpaghara obodo a na-achị achị, ya ejula gị anya, nʼihi na onyeisi ọbụla nwere onye na-atụrụ ya. Ndịisi na-atụ iwu nwekwara ndị kachasị ha elu. Otu a kwa, ọ dịkwa ndị dị elu karịa ha.
9 땅의 이익은 뭇 사람을 위하여 있나니 왕도 밭의 소산을 받느니라
Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru.
10 은을 사랑하는 자는 은으로 만족함이 없고 풍부를 사랑하는 자는 소득으로 만족함이 없나니 이것도 헛되도다
Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ. Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla. Nke a bụkwa ihe efu.
11 재산이 더하면 먹는 자도 더하나니 그 소유주가 눈으로 보는 외에 무엇이 유익하랴
Akụ na-abawanye, ndị na-eri ya na-abawanyekwa. Olee uru ha bara nye onyenwe ha karịa iji anya ya abụọ na-ele ha?
12 노동자는 먹는 것이 많든지 적든지 잠을 달게 자거니와 부자는 배부름으로 자지 못하느니라
Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma, ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu, ma oke iriju afọ onye ọgaranya anaghị ekwe ya rahụ ụra.
13 내가 해 아래서 큰 폐단되는 것을 보았나니 곧 소유주가 재물을 자기에게 해 되도록 지키는 것이라
Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ, mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu,
14 그 재물이 재난을 인하여 패하나니 비록 아들은 낳았으나 그 손에 아무 것도 없느니라
ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ, o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa.
15 저가 모태에서 벌거벗고 나왔은즉 그 나온 대로 돌아가고 수고하여 얻은 것을 아무 것도 손에 가지고 가지 못하리니
Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa, otu a ka anyị ga-esi hapụ ya. O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ.
16 이것도 폐단이라 어떻게 왔든지 그대로 가리니 바람을 잡으려는 수고가 저에게 무엇이 유익하랴
Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi. Mmadụ na-ala dịka o siri bịa. Gịnị bụ uru ya, mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe?
17 일평생을 어두운 데서 먹으며 번뇌와 병과 분노가 저에게 있느니라
Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị, site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe.
18 사람이 하나님의 주신 바 그 일평생에 먹고 마시며 해 아래서 수고하는 모든 수고 중에서 낙을 누리는 것이 선하고 아름다움을 내가 보았나니 이것이 그의 분복이로다
Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya.
19 어떤 사람에게든지 하나님이 재물과 부요를 주사 능히 누리게 하시며 분복을 받아 수고함으로 즐거워하게 하신 것은 하나님의 선물이라
Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.
20 저는 그 생명의 날을 깊이 관념치 아니하리니 이는 하나님이 저의 마음의 기뻐하는 것으로 응하심이라
Ebe ọ bụ na Chineke enyela ya obi ụtọ, ụbọchị ndụ ya ekwesighị iwetara ya oke echiche.