< 시편 130 >

1 (성전에 올라가는 노래) 여호와여, 내가 깊은 데서 주께 부르짖었나이다
Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa.
2 주여, 내 소리를 들으시며 나의 간구하는 소리에 귀를 기울이소서
Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara.
3 여호와여, 주께서 죄악을 감찰하실진대 주여, 누가 서리이까
O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo?
4 그러나 사유하심이 주께 있음은 주를 경외케 하심이니이다
Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi.
5 나 곧 내 영혼이 여호와를 기다리며 내가 그 말씀을 바라는도다
Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.
6 파숫군이 아침을 기다림보다 내 영혼이 주를 더 기다리나니 참으로 파숫군의 아침을 기다림보다 더하도다
Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.
7 이스라엘아 여호와를 바랄지어다! 여호와께는 인자하심과 풍성한 구속이 있음이라
Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa.
8 저가 이스라엘을 그 모든 죄악에서 구속하시리로다
Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel site na mmehie ya niile.

< 시편 130 >