< 욥기 21 >

1 욥이 대답하여 가로되
Mgbe ahụ, Job zara sị:
2 너희는 내 말을 자세히 들으라 이것이 너희의 위로가 될 것이니 라
“Gee ntị nke ọma nʼokwu m; ka nke a bụrụ nkasiobi ị ga-enye m.
3 나를 용납하여 말하게 하라 내가 말한 후에 또 조롱할지니라
Nwee ndidi ka m kwuchaa okwu m, mgbe m kwuchara, gaa nʼihu ịkwa m emo.
4 나의 원망이 사람을 향하여 하는 것이냐 내가 어찌 초급하지 아니하겠느냐
“Ọ bụ mmadụ ka m na-ekpesara? Gịnị ka m ga-eji ghara ịbụ onye na-enweghị ndidi?
5 너희는 나를 보아라 놀라라 손으로 입을 가리우라
Lee m anya ka ahụ maa gị jijiji; were aka gị kpuchie ọnụ gị.
6 내가 추억하기만 하여도 답답하고 두려움이 내 몸을 잡는구나
Mgbe m chere echiche maka nke a, egwu tụrụ m meekwa ka ahụ m maa jijiji.
7 어찌하여 악인이 살고 수를 누리고 세력이 강하냐
Gịnị mere ndị ajọ omume ji enwe ndụ ogologo, ghọọ okenye, baakwa ụba nʼịdị ike?
8 씨가 그들의 앞에서 그들과 함께 굳게 서고 자손이 그들의 목전 에서 그러하구나
Ha na-ahụ ụmụ ka ha na-akwụsike ike gburugburu ha, ụmụ ha ka ha ji anya ha ahụ.
9 그 집이 평안하여 두려움이 없고 하나님의 매가 그 위에 임하지 아니하며
Ha na-ebi ndụ udo nʼezinaụlọ ha na-atụghị egwu na ihe ọjọọ ọbụla ga-adakwasị ha; mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha.
10 그 수소는 영락없이 새끼를 배게 하고 그 암소는 새끼를 낳고 낙태하지 않는구나
Oke ehi ha na-agba nne ehi ha na-esepụghị aka; nne ehi ha na-amụ ụmụ, ha adịghị ekwo ime.
11 그들은 아이들을 내어보냄이 양 떼 같고 그 자녀들은 춤추는구나
Ha na-ezipụ ụmụ ha dịka igwe atụrụ; ụmụntakịrị ha na-etegharị egwu.
12 그들이 소고와 수금으로 노래하고 피리 불어 즐기며
Ha na-abụ abụ nʼụda egwu otiti na ụbọ akwara; ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda nke ọja.
13 그날을 형통하게 지내다가 경각간에 음부에 내려가느니라 (Sheol h7585)
Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu, ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo. (Sheol h7585)
14 그러할지라도 그들은 하나님께 말하기를 우리를 떠나소서 우리가 주의 도리 알기를 즐겨하지 아니하나이다
Ma ndị a na-asị Chineke, ‘Hapụ anyị aka, ọ dịghị anyị mkpa ịmata ụzọ gị.
15 전능자가 누구기에 우리가 섬기며 우리가 그에게 기도한들 무슨 이익을 얻으랴 하는구나
Onye ka Onye pụrụ ime ihe niile bụ, anyị ga-eji jeere ya ozi? Uru gịnị ka ịrịọ ya arịrịọ ga-abara anyị?’
16 그들의 복록이 그들의 손으로 말미암은 것이 아니니라 악인의 계획은 나와 판이하니라
Ma ọganihu ha adịghị nʼaka ha ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
17 악인의 등불이 꺼짐이나 재앙이 그들에게 임함이나 하나님이 진노하사 그들을 곤고케 하심이나
“Ma ugboro ole ka a na-emenyụ ọkụ oriọna nke ndị na-emebi iwu? Ugboro ole ka nhụju anya na-adakwasị ha, bụ nke Chineke kenyere ha nʼiwe ya?
18 그들이 바람 앞에 검불 같이, 폭풍에 불려가는 겨같이 되는 일이 몇번이나 있었느냐
Ugboro ole ka ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ nʼihu ikuku, maọbụ dịka igbugbo ọka nke ikuku siri ike na-efesasị?
19 하나님이 그의 죄악을 쌓아 두셨다가 그 자손에게 갚으신다 하거니와 그 몸에 갚으셔서 그로 깨닫게 하셔야 할 것이라
A na-asị, ‘Chineke na-akpakọtara ụmụ ha ntaramahụhụ nke njehie ha.’ Ka a kwụghachi ha ya, ka ha nwee ike mata ya.
20 자기의 멸망을 자기의 눈으로 보게 하시며 전능자의 진노를 마시게 하셔야 할 것이니라
Ka anya ha hụ mbibi nke onwe ya, ka ha ṅụọ ọnụma nke Onye pụrụ ime ihe niile dịka mmiri.
21 그의 달 수가 진하면 자기 집에 대하여 무슨 관계가 있겠느냐
Gịnị gbasara ha banyere ezinaụlọ ha hapụrụ mgbe ọnwa ndị e kenyere ya bịara na ngwụcha?
22 그러나 하나님은 높은 자들을 심판하시나니 누가 능히 하나님께 지식을 가르치겠느냐
“Ọ dị onye pụrụ izi Chineke ihe ọmụma, ebe ọ bụ ya na-ekpe ndị kachasị elu ikpe?
23 어떤 사람은 죽도록 기운이 충실하여 평강하며 안일하고
Otu onye na-anwụ mgbe o jupụtara nʼike na ume, mgbe ọ nọ na nchekwa na udo,
24 그 그릇에는 젖이 가득하며 그 골수는 윤택하였고
mgbe ahụ ya bụ nke eji ezi nri zụọ nke ọma, ọkpụkpụ ya jupụtakwara nʼụmị.
25 어떤 사람은 죽도록 마음에 고통하고 복을 맛보지 못하였어도
Onye ọzọ na-anwụ nʼihe ilu nke mkpụrụobi, nʼihi na o nweghị mgbe o riri ezi ihe ọbụla.
26 이 둘이 일반으로 흙 속에 눕고 그 위에 구더기가 덮이는구나
Nke ọbụla nʼime ha dina nʼakụkụ ibe ya nʼime aja, ikpuru kpuchikwara ha abụọ.
27 내가 너희의 생각을 알고 너희가 나를 해하려는 궤휼도 아노라
“Amaara m nke ọma ihe bụ echiche unu na nzube unu ji emegide m.
28 너희의 말이 왕후의 집이 어디 있으며 악인의 거하던 장막이 어디 있느뇨 하는구나
Unu ga-ajụ m ajụjụ sị, ‘Ugbu a, ole ụlọ oke mmadụ ahụ. Ụlọ ikwu ndị ahụ ebe ndị na-emebi iwu biiri?’
29 너희가 길 가는 사람들에게 묻지 아니하였느냐 그들의 증거를 알지 못하느냐
Ọ bụ na unu ajụbeghị ndị njem ajụjụ? Ọ bụ na unu ejighị ihe ha kọrọ mere ihe,
30 악인은 남기워서 멸망의 날을 기다리움이 되고 멸망의 날을 맞으러 끌려 나감이 된다 하느니라
na a na-echebe ndị ọjọọ pụọ nʼụbọchị nhụju anya, na a na-anapụta ha site nʼụbọchị oke iwe?
31 누가 능히 그의 행위를 면박하며 누가 능히 그의 소위를 보응하랴마는
Onye na-atụ ha mmehie ha nʼihu? Onye kwa na-akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere?
32 그를 무덤으로 메어 가고 사람이 그 무덤을 지키리라
A na-eburu ha gaa nʼili, a na-echekwa ili ha nche.
33 그는 골짜기의 흙덩이를 달게 여기고 그 앞선 자가 무수함 같이 모든 사람이 그 뒤를 좇으리라
Aja dị na ndagwurugwu na-atọ ha ụtọ; Mmadụ niile na-eso ha nʼazụ, na ọtụtụ a na-apụghị ịgụta ọnụ na-ebu ha ụzọ nʼaga.
34 이러한즉 너희의 위로가 헛되지 아니하냐 너희의 대답은 거짓 뿐이니라
“Ya mere, olee otu unu ga-esi were okwu na-enweghị isi kasịe m obi? Ọ dịghị ihe fọdụrụ nʼọsịịsa unu ma ọ bụghị naanị okwu ụgha.”

< 욥기 21 >