< 전도서 10 >

1 죽은 파리가 향기름으로 악취가 나게 하는 것 같이 적은 우매가 지혜와 존귀로 패하게 하느니라
Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ. Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ.
2 지혜자의 마음은 오른편에 있고 우매자의 마음은 왼편에 있느니라
Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi, ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie.
3 우매자는 길에 행할 때에도 지혜가 결핍하여 각 사람에게 자기의 우매한 것을 말하느니라
Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya, nʼihi na o maghị ihe. Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu ọsịịsọ.
4 주권자가 네게 분을 일으키거든 너는 네 자리를 떠나지 말라 공순이 큰 허물을 경하게 하느니라
Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị, ahapụla ọnọdụ gị, nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ.
5 내가 해 아래서 한 가지 폐단 곧 주권자에게서 나는 허물인 듯한것을 보았노니
Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie.
6 우매자가 크게 높은 지위를 얻고 부자가 낮은 지위에 앉는도다
Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu, ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha.
7 또 보았노니 종들은 말을 타고 방백들은 종처럼 땅에 걸어 다니는도다
Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya, ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu.
8 함정을 파는 자는 거기 빠질 것이요 담을 허는 자는 뱀에게 물리리라
Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya! Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu.
9 돌을 떠내는 자는 그로 인하여 상할 것이요 나무를 쪼개는 자는 그로 인하여 위험을 당하리라
Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị. Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.
10 무딘 철 연장 날을 갈지 아니하면 힘이 더 드느니라 오직 지혜는 성공하기에 유익하니라
Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ, ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ, a ga-etinye ike karịa, ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi.
11 방술을 베풀기 전에 뱀에게 물렸으면 술객은 무용하니라
Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ, ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ.
12 지혜자의 입의 말은 은혜로우나 우매자의 입술은 자기를 삼키나니
Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara, ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi
13 그 입의 말의 시작은 우매요 끝은 광패니라
Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu, ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.
14 우매자는 말을 많이 하거니와 사람이 장래 일을 알지 못하나니 신후사를 알게 할 자가 누구이냐
Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu. Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ?
15 우매자들의 수고는 제각기 곤하게 할 뿐이라 저희는 성읍에 들어갈 줄도 알지 못함이니라
Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike, ha makwaghị ụzọ ijeru obodo.
16 왕은 어리고 대신들은 아침에 연락하는 이 나라여 화가 있도다
Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị, nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ.
17 왕은 귀족의 아들이요 대신들은 취하려 함이 아니라 기력을 보하려고 마땅한 때에 먹는 이 나라여 복이 있도다
Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ, nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike, ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke.
18 게으른즉 석가래가 퇴락하고 손이 풀어진즉 집이 새느니라
Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri; ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.
19 잔치는 희락을 위하여 베푸는 것이요 포도주는 생명을 기쁘게 하는 것이나 돈은 범사에 응용되느니라
Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị, mmanya na-enye obi ụtọ, ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile.
20 심중에라도 왕을 저주하지 말며 침방에서라도 부자를 저주하지 말라 공중의 새가 그 소리를 전하고 날짐승이 그 일을 전파할 것임이니라
Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị; maọbụ bụọ ọgaranya ọnụ nʼime ụlọ ndina gị, nʼihi na anụ ufe nọ nʼelu nwere ike buru okwu gị nwa nnụnụ nwere nku ga-akọ ihe i kwuru.

< 전도서 10 >