< 사도행전 18 >
1 이후에 바울이 아덴을 떠나 고린도에 이르러
Ka nke a mechara, Pọl hapụrụ Atens gaa Kọrint.
2 아굴라라 하는 본도에서 난 유대인 하나를 만나니 글라우디오가 모든 유대인을 명하여 로마에서 떠나라 한고로 그가 그 아내 브리스길라와 함께 이달리야로부터 새로 온지라 바울이 그들에게 가매
Nʼebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nʼobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwunye ya Prisila sitere Itali Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nʼobodo Rom. Pọl gara hụ ha,
3 업이 같으므로 함께 거하여 일을 하니 그 업은 장막을 만드는 것이더라
nʼihi na ha na-arụ otu ọrụ, o binyere ha, sokwara ha rụkọọ ọrụ nʼihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu.
4 안식일마다 바울이 회당에서 강론하고 유대인과 헬라인을 권면하니라
Ụbọchị izuike niile, ọ na-arụ ụka nʼụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere.
5 실라와 디모데가 마게도냐로서 내려오매 바울이 하나님의 말씀에 붙잡혀 유대인들에게 예수는 그리스도라 밝히 증거하니
Mgbe Saịlas na Timoti sitere na Masidonia bịa, Pọl tinyere oge ya niile ikwusa okwu na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
6 저희가 대적하여 훼방하거늘 바울이 옷을 떨어 가로되 `너희 피가 너희 머리로 돌아갈 것이요 나는 깨끗하니라 이 후에는 이방인에게로 가리라' 하고
Mgbe ọbụla ha megidere ya ma kparịa ya, ọ na-efecha uwe ya, sị ha, “Ọbara unu dị unu nʼisi, aka m dị ọcha. Malite ugbu a, aga m agakwuru ndị mba ọzọ.”
7 거기서 옮겨 하나님을 공경하는 디도 유스도라 하는 사람의 집에 들어가니 그 집이 회당 옆이라
O siri nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Taịtọs Jọstus, onye na-asọpụrụ na-efekwa Chineke ofufe. Ụlọ ya dị nso nʼụlọ nzukọ ndị Juu.
8 또 회당장 그리스보가 온 집으로 더불어 주를 믿으며 수다한 고린도 사람도 듣고 믿어 세례를 받더라
Krispọs onyeisi nʼụlọ nzukọ ahụ na ezinaụlọ ya niile kweere nʼOnyenwe anyị. Ọtụtụ ndị ọzọ bi na Kọrint nụrụ okwu ahụ, kwere, e mee ha baptizim.
9 밤에 주께서 환상 가운데 바울에게 말씀하시되 두려워하지 말며 잠잠하지 말고 말하라
Onyenwe anyị gwara Pọl nʼọhụ nʼotu abalị sị, “Atụla egwu, kwusie okwu ike, emechikwala ọnụ gị.
10 내가 너와 함께 있으매 아무 사람도 너를 대적하여 해롭게 할 자가 없을 것이니 이는 이 성중에 내 백성이 많음이라 하시더라
Nʼihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a.”
11 일년 육 개월을 유하며 그들 가운데서 하나님의 말씀을 가르치니라
Ọ nọgidere ebe ahụ otu afọ na ọkara. Ọ na-ezikwa ndị mmadụ okwu Chineke.
12 갈리오가 아가야 총독 되었을 때에 유대인이 일제히 일어나 바울을 대적하여 재판 자리로 데리고 와서
Mgbe Galio malitere ịchị achị nʼobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nʼikpeazụ, ha dupụtara ya, gaa nʼụlọikpe.
13 말하되 `이 사람이 율법을 어기어 하나님을 공경하라고 사람들을 권한다' 하거늘
Ha sịrị, “Nwoke a na-amanye ndị mmadụ ka ha na-ekpere Chineke nʼụzọ megidere iwu.”
14 바울이 입을 열고자 할 때에 갈리오가 유대인들에게 이르되 `너희 유대인들아 만일 무슨 부정한 일이나 괴악한 행동이었으면 내가 너희 말을 들어주는 것이 가하거니와
Ma mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu, Galio sịrị ndị Juu ahụ, “Agaara m enwe ndidi gee unu ntị ma ọ bụrụ na okwu a gbasara mmejọ mmadụ mejọrọ ibe ya, maọbụ arụ mmadụ mere megide obodo.
15 만일 문제가 언어와 명칭과 너희 법에 관한 것이면 너희가 스스로 처리하라 나는 이러한 일에 재판장 되기를 원치 아니하노라' 하고
Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere okwu na aha dị iche iche nakwa iwu unu, gaanụ dozie ya nʼonwe unu. Agaghị m abụ onye ikpe okwu ihe ndị dị otu a.”
O sitere nʼime ụlọ ikpe ya chụpụ ha.
17 모든 사람이 회당장 소스데네를 잡아 재판 자리 앞에서 때리되 갈리오가 이 일을 상관치 아니하니라
Ha jidere Sostenis, onye bụ onyeisi ụlọ nzukọ ahụ tie ya ihe nke ukwuu nʼọnụ ụzọ ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio emeghị dịka ọ maara ihe na-eme nʼebe ahụ.
18 바울은 더 여러 날 유하다가 형제들을 작별하고 배 타고 수리아로 떠나갈 새 브리스길라와 아굴라도 함께 하더라 바울이 일찍 서원이 있으므로 겐그레아에서 머리를 깎았더라
Mgbe ọ nọsịrị nʼebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, Pọl sịrị ndị kwere ekwe nọ nʼebe ahụ ka ha nọdụnụ nke ọma, ma si nʼebe ahụ banye nʼụgbọ mmiri ruo Siria. Prisila na Akwila sokwaara ya gaa. Nʼobodo a na-akpọ Senkria, ọ kpụchara agịrị isi ya, nʼihi nkwa o kwere.
19 에베소에 와서 저희를 거기 머물러 두고 자기는 회당에 들어가서 유대인들과 변론하니
Mgbe ha rutere Efesọs, ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ, ma o bu ụzọ banye nʼụlọ nzukọ ebe ya na ndị Juu nwere mkparịta ụka.
20 여러 사람이 더 오래 있기를 청하되 허락치 아니하고
Ma mgbe ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụkwuoro ha ogologo oge, ọ kweghị.
21 작별하여 가로되 `만일 하나님의 뜻이면 너희에게 돌아오리라' 하고 배를 타고 에베소를 떠나
Mgbe ọ na-ahapụ, ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na Chineke kwe, aga m alọghachikwute unu ọzọ.” Emesịa ọ banyere nʼụgbọ hapụ Efesọs.
22 가이사랴에서 상륙하여 올라가 교회의 안부를 물은 후에 안디옥으로 내려가서
Mgbe ọ kwụsịrị na Sizaria, ọ gara leta chọọchị dị nʼebe ahụ kelee ha. Emesịa, ọ gara nʼihu ruo Antiọk.
23 얼마 있다가 떠나 갈라디아와 브루기아 땅을 차례로 다니며 모든 제자를 굳게 하니라
Mgbe ọ nọsịrị nwa oge nta nʼebe ahụ, ọ sitere nʼebe ahụ pụọ jegharịa nʼakụkụ obodo Galeshịa na Frigia na-agba ndị na-eso ụzọ ahụ ume.
24 알렉산드리아에서 난 아볼로라 하는 유대인이 에베소에 이르니 이 사람은 학문이 많고 성경에 능한 자라
Ma otu nwoke onye Juu, aha ya bụ Apọlọs, onye Alegzandria bịara na Efesọs. Ọ bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere nʼAkwụkwọ Nsọ nke ọma.
25 그가 일찍 주의 도를 배워 열심으로 예수에 관한 것을 자세히 말하며 가르치나 요한의 세례만 알 따름이라
Nwoke a natara ozizi banyere ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nʼịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ naanị ihe gbasara baptizim Jọn mere.
26 그가 회당에서 담대히 말하기를 시작하거늘 브리스길라와 아굴라가 듣고 데려다가 하나님의 도를 더 자세히 풀어 이르더라
Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nʼụlọ nzukọ. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya, duru ya gaa nʼụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe niile banyere ụzọ Chineke.
27 아볼로가 아가야로 건너가고자 하니 형제들이 저를 장려하며 제자들에게 편지하여 영접하라 하였더니 저가 가매 은혜로 말미암아 믿은 자들에게 많은 유익을 주니
Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ.
28 이는 성경으로써 예수는 그리스도라고 증거하여 공중 앞에서 유력하게 유대인의 말을 이김일러라
Nʼihi na nʼihu ndị mmadụ niile, o guzoro kwuo okwu megide ozizi ọjọọ na ịrụ ụka niile nke ndị Juu. O gosiri ha site nʼakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Kraịst ahụ.