< 사도행전 15 >
1 어떤 사람들이 유대로부터 내려와서 형제들을 가르치되 `너희가 모세의 법대로 할례를 받지 아니하면 능히 구원을 얻지 못하리라' 하니
Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.”
2 바울과 바나바와 저희 사이에 적지 아니한 다툼과 변론이 일어난지라 형제들이 이 문제에 대하여 바울과 바나바와 및 그 중에 몇사람을 예루살렘에 있는 사도와 장로들에게 보내기로 작정하니
Ha na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpebiri ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndịisi ndị ọzọ soro gaa Jerusalem hụ ndị ozi na ndị okenye nke nzukọ maka okwu a.
3 저희가 교회의 전송을 받고 베니게와 사마리아로 다녀가며 이방인들의 주께 돌아온 일을 말하여 형제들을 다 크게 기쁘게 하더라
Nzukọ ahụ zipụrụ ha nʼụzọ ha, mgbe ha sitere Fonisia na Sameria na-agafe, ha kọrọ otu ndị mba ọzọ siri chegharịa. Nke a wetara ndị niile kwere ekwe oke ọṅụ dị ukwuu.
4 예루살렘에 이르러 교회와 사도와 장로들에게 영접을 받고 하나님이 자기들과 함께 계셔 행하신 모든 일을 말하매
Mgbe ha bịaruru Jerusalem, nzukọ, ndị ozi na ndị okenye nabatara ha, ha kọkwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee.
5 바리새파 중에 믿는 어떤 사람들이 일어나 말하되 `이방인에게 할례주고 모세의 율법을 지키라 명하는 것이 마땅하다' 하니라
Ma ụfọdụ ndị kwere ekwe si nʼotu ndị Farisii biliri na-ekwu sị, “Na ọ dị mkpa ka e bie ha ugwu ma gwakwa ha ka ha dobe iwu Mosis.”
Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye zukọtara itule okwu a.
7 많은 변론이 있은 후에 베드로가 일어나 말하되 `형제들아, 너희도 알거니와 하나님이 이방인들로 내 입에서 복음의 말씀을 들어 믿게 하시려고 오래 전부터 너희 가운데서 나를 택하시고
Mgbe ha nọ tulegide okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu niile maara na site na mbụ Chineke họpụtara m site nʼetiti unu, ka m zisaa oziọma ahụ nye ndị mba ọzọ ka ha nụrụ, ma kwerekwa.
8 또 마음을 아시는 하나님이 우리에게와 같이 저희에게도 성령을 주어 증거하시고
Chineke a, onye maara obi mmadụ niile gbaara ha akaebe site nʼinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dịka anyị si nata ya na mbụ.
9 믿음으로 저희 마음을 깨끗이 하사 저희나 우리나 분간치 아니하셨느니라
O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe.
10 그런데 지금 너희가 어찌하여 하나님을 시험하여 우리 조상과 우리도 능히 메지 못하던 멍에를 제자들의 목에 두려느냐
Ugbu a, gịnị mere unu ji anwa Chineke ọnwụnwa site na-itinye nʼolu ndị na-eso ụzọ ya ibu arọ nke anyị maọbụ nna nna anyị ha na-enweghị ike ịdọkpụ?
11 우리가 저희와 동일하게 주 예수의 은혜로 구원 받는 줄을 믿노라' 하니라
Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.”
12 온 무리가 가만히 있어 바나바와 바울이 하나님이 자기들로 말미암아 이방인 중에서 행하신 표적과 기사 고하는 것을 듣더니
Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ.
13 말을 마치매 야고보가 대답하여 가로되 `형제들아 내 말을 들으라
Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị.
14 하나님이 처음으로 이방인 중에서 자기 이름을 위할 백성을 취하시려고 저희를 권고하신 것을 시므온이 고하였으니
Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya.
15 선지자들의 말씀이 이와 합하도다 기록된 바
Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya,
16 이 후에 내가 돌아와서 다윗의 무너진 장막을 다시 지으며 또 그 퇴락한 것을 다시 지어 일으키리니
“‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie,
17 이는 그 남은 사람들과 내 이름으로 일컬음을 받는 모든 이방인들로 주를 찾게 하려 함이라 하셨으니
ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị, ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’
18 즉 예로부터 이것을 알게 하시는 주의 말씀이라 함과 같으니라 (aiōn )
Nke a amaara site na mgbe ochie. (aiōn )
19 그러므로 내 의견에는 이방인중에서 하나님께로 돌아 오는 자들을 괴롭게 말고
“Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke,
20 다만 우상의 더러운 것과 음행과 목매어 죽인 것과 피를 멀리하라고 편지하는 것이 가하니
kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara.
21 이는 예로부터 각 성에서 모세를 전하는 자가 있어 안식일마다 회당에서 그 글을 읽음이니라' 하더라
Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu nʼobodo niile. A na-agụkwa ya nʼụlọ nzukọ nʼụbọchị izuike niile.”
22 이에 사도와 장로와 온 교회가 그 중에서 사람을 택하여 바울과 바나바와 함께 안디옥으로 보내기를 가결하니 곧 형제 중에 인도자인 바사바라 하는 유다와 실라더라
Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye, ha na nzukọ niile, kpebiri ka a họpụta ndị ikom a ga-eziga Antiọk ha na Pọl na Banabas. Ha họpụtara Judas onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị ndu so nʼetiti ụmụnna.
23 그 편에 편지를 부쳐 이르되 `사도와 장로된 형제들은 안디옥과 수리아와 길리기아에 있는 이방인 형제들에게 문안하노라
Ha nyekwara ha nʼakwụkwọ ozi dị otu a, Akwụkwọ a sitere nʼaka ndị ozi, na ndị okenye ndị bụ ụmụnna unu. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere bụ ndị nọ nʼAntiọk, Siria na Silisia. Ekele.
24 들은즉 우리 가운데서 어떤 사람들이 우리의 시킨 것도 없이 나가서 말로 너희를 괴롭게 하고 마음을 혹하게 한다 하기로
E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị otu anyị ebuterela unu nsogbu na ọgbaaghara, mee ka obi lọọ unu mmiri, na-emebi mkpụrụobi unu. Ma nʼezie, ha anataghị ike nʼaka anyị ime nke a.
25 사람을 택하여 우리 주 예수 그리스도의 이름을 위하여 생명을 아끼지 아니하는 자인 우리의 사랑하는 바나바와 바울과 함께 너희에게 보내기를 일치 가결하였노라
Nʼihi nke a, anyị zukọrọ, sitekwa nʼotu obi kpebie ịhọpụta ụfọdụ ndị ikom na izitere unu ha, ha na ndị anyị hụrụ nʼanya, bụ Pọl na Banabas,
ndị ikom werela ndụ ha tụnye nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
27 그리하여 유다와 실라를 보내니 저희도 이 일을 말로 전하리라
Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ndị ga-akọwara unu nʼihu nʼihu, ihe anyị dere nʼakwụkwọ a.
28 성령과 우리는 이 요긴한 것들 외에 아무 짐도 너희에게 지우지 아니하는 것이 가한 줄 알았노니
Nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi nʼanya Mmụọ Nsọ na nʼanya anyị kwa, na o kwesighị ka anyị bokwasị unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa.
29 우상의 제물과 피와 목매어 죽인 것과 음행을 멀리 할지니라 이에 스스로 삼가면 잘되리라 평안함을 원하노라' 하였더라
Ma o kwesiri ka unu hapụ iri ihe ọbụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri anụ ọbụla a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nʼịkwa iko. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a, unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma.
30 저희가 작별하고 안디옥에 내려가 무리를 모은 후에 편지를 전하니
Ya mere, e zipụrụ ha, ha jeruokwa Antiọk. Mgbe ha kpọkọrọ nzukọ ahụ, ha nyere ha akwụkwọ ozi ahụ.
Mgbe ndị otu ọgbakọ ahụ gụsịrị ya, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu nʼihi agbamume ha natara.
32 유다와 실라도 선지자라 여러말로 형제를 권면하여 굳게 하고
Judas na Saịlas, ndị ha onwe ha bụ ndị amụma, kwuru ọtụtụ okwu, iji gbaa ha ume na ime ka okwukwe ndị kwere ekwe guzosie ike.
33 얼마 있다가 평안히 가라는 전송을 형제들에게 받고 자기를 보내던 사람들에게로 돌아가되
Mgbe ha nọnyesịrị ha nwa oge nta, ndị kwere ekwe ji ngọzị nke udo zilaga ha ka ha laghachikwuru ndị zitere ha.
Ma ọ masịrị Saịlas ịnọtukwu nʼebe ahụ.
35 바울과 바나바는 안디옥에서 유하여 다수한 다른 사람들과 함께 주의 말씀을 가르치며 전파하니라
Pọl na Banabas nọgidere nʼAntiọk, ebe ha na ndị ọzọ kuziri ihe ma kwusakwa okwu Onyenwe anyị.
36 수일 후에 바울이 바나바더러 말하되 `우리가 주의 말씀을 전한 각 성으로 다시 가서 형제들이 어떠한가 방문하자' 하니
Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.”
37 바나바는 마가라 하는 요한도 데리고 가고자 하나
Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa.
38 바울은 밤빌리아에서 자기들을 떠나 한가지로 일하러 가지 아니한 자를 데리고 가는 것이 옳지않다 하여
Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha.
39 서로 심히 다투어 피차 갈라서니 바나바는 마가를 데리고 배 타고 구브로로 가고
Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs.
40 바울은 실라를 택한 후에 형제들에게 주의 은혜에 부탁함을 받고 떠나
Ma Pọl họọrọ Saịlas, kpọrọ ya gawa njem, mgbe ụmụnna kpesịrị ha ekpere raara ha nye nʼamara Onyenwe anyị.
41 수리아와 길리기아로 다녀가며 교회들을 굳게 하니라
O jegharịrị nʼime obodo Siria na Silisia na-agba nzukọ nọ nʼebe ahụ ume.