< 사무엘상 31 >

1 블레셋 사람이 이스라엘을 치매 이스라엘 사람들이 블레셋 사람앞에서 도망하여 길보아 산에서 엎드러져 죽으니라
Nʼoge a, ndị Filistia lụsoro ndị Izrel agha, ndị Izrel si nʼihu ha gbaa ọsọ, ma ọtụtụ nʼime ha nwụrụ nʼugwu Gilboa.
2 블레셋 사람들이 사울과 그 아들들을 쫓아 미쳐서 사울의 아들 요나단과 아비나답과 말기수아를 죽이니라
Ndị Filistia ji ike chụso Sọl na ụmụ ya. Ha gburu ụmụ ya ndị ikom, Jonatan, Abinadab na Malkishua.
3 사울이 패전하매 활 쏘는 자가 따라 미치니 사울이 그 활 쏘는 자를 인하여 중상한지라
Agha ahụ siri ike nke ukwuu megide Sọl, mgbe ndị na-agba ụta chụkwutere ya ha merụrụ ya ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.
4 그가 병기 든 자에게 이르되 `네 칼을 빼어 나를 찌르라 할례없는 자들이 와서 나를 찌르고 모욕할까 두려워하노라' 하나 병기 든 자가 심히 두려워하여 즐겨 행치 아니하는지라 이에 사울이 자기 칼을 취하고 그 위에 엎드러지매
Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.” Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya.
5 병기 든 자가 사울의 죽음을 보고 자기도 자기 칼 위에 엎드러져 그와 함께 죽으니라
Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, soro Sọl nwụọ.
6 사울과 그 세 아들과 병기 든 자와 그의 모든 사람이 다 그 날에 함께 죽었더라
Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ, onye na-ebu ihe agha ya na ndị agha ya niile, nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ.
7 골짜기 저편에 있는 이스라엘 사람과 요단 건너편에 있는 자들이 이스라엘 사람들의 도망한 것과 사울과 그 아들들의 죽었음을 보고 성읍들을 버리고 도망하매 블레셋 사람들이 이르러 거기 거하니라
Mgbe ndị Izrel nọ nʼofe ọzọ nke ndagwurugwu, na ndị nọ nʼofe Jọdan, hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.
8 그 이튿날 블레셋 사람들이 죽은 자를 벗기러 왔다가 사울과 그 세 아들이 길보아산에서 죽은 것을 보고
Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom atọ ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa.
9 사울의 머리를 베고 그 갑옷을 벗기고 자기들의 신당과 백성에게 전파하기 위하여 그것을 블레셋 사람의 땅 사방에 보내고
Ha bipụrụ Sọl isi, yipụkwa ya ihe agha ya. Ha zipụkwara ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nʼụlọ arụsị ha nakwa nʼetiti ndị ha niile.
10 그 갑옷은 아스다롯의 집에 두고 그 시체는 벧산 성벽에 못박으매
Ha tinyere ihe agha Sọl nʼụlọ Ashtọret, kpọgidekwa ozu ya nʼaja ụlọ mgbidi obodo Bet-Shan.
11 길르앗 야베스 거민들이 블레셋 사람들의 사울에게 행한 일을 듣고
Mgbe ndị obodo Jebesh Gilead nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl,
12 모든 장사가 일어나 밤새도록 가서 사울과 그 아들들의 시체를 벧산 성벽에서 취하여 가지고 야베스에 돌아와서 거기서 불사르고
ndị ikom ha niile bụ ndị dimkpa, gara njem ogologo abalị ahụ niile jeruo Bet-Shan. Ha sitere nʼelu mgbidi obodo Bet-Shan tọda ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom buru ha laa Jebesh ebe ha nọ kpọọ ozu ha ọkụ.
13 그 뼈를 가져다가 야베스 에셀나무 아래 장사하고 칠일을 금식하였더라
Ha liri ọkpụkpụ ha nʼokpuru osisi Tamarisk dị na Jebesh, buo ọnụ ụbọchị asaa.

< 사무엘상 31 >