< 사무엘상 25 >

1 사무엘이 죽으매 온 이스라엘 무리가 모여 그를 애곡하며 라마 그의 집에서 그를 장사한지라 다윗이 일어나 바란 광야로 내려가니라
Emesịa Samuel nwụrụ. Izrel niile chịkọtara onwe ha ọnụ zukọta ruo ụjụ nʼihi ọnwụ ya. Ha liri ya nʼụlọ ya dị na Rema. Emesịa, Devid gara nʼọzara Paran biri nʼebe ahụ.
2 마온에 한 사람이 있는데 그 업이 갈멜에 있고 심히 부하여 양이 삼천이요 염소가 일천이므로 그가 갈멜에서 그 양털을 깎고 있었으니
Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel.
3 그 사람의 이름은 나발이요 그 아내의 이름은 아비가일이라 그 여자는 총명하고 용모가 아름다우나 남자는 완고하고 행사가 악하며 그는 갈멜 족속이었더라
Aha nwoke a bụ Nebal. Nwunye ya kwa, onye bụ nwanyị mara mma, na onye nwere akọnuche, ka a na-akpọ Abigel. Nwoke a nwere omume ọjọọ; ọ kwara obi nʼazụ, afọ takwara ya mmiri.
4 다윗이 광야에 있어서 나발이 자기 양털을 깎는다 함을 들은지라
Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya,
5 다윗이 이에 열 소년을 보내며 그 소년들에게 이르되 `너희는 갈멜로 올라가 나발에게 이르러 내 이름으로 그에게 문안하고
o zipụrụ ndị ikom iri sị ha. “Jekwurunụ Nebal nʼobodo Kamel, jụọ ya otu ihe si aga nʼaha m.
6 이같이 그 부하게 사는 자에게 이르기를 너는 평강하라, 네 집도 평강하라, 네 소유의 모든 것도 평강하라,
Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere.
7 네게 양털 깎는 자들이 있다 함을 이제 내가 들었노라 네 목자들이 우리와 함께 있었으나 우리가 그들을 상치 아니하였고 그들이 갈멜에 있는 동안에 그들의 것을 하나도 잃지 아니하였나니
“‘Anụla m na ị na-akpacha ajị igwe ewu na atụrụ gị. Oge ndị ọzụzụ atụrụ gị nọ nʼetiti anyị, anyị emejọghị ha, o nweghị ihe ọbụla funarịrị ha oge ahụ niile ha nọrọ nʼobodo Kamel.
8 네 소년들에게 물으면 그들이 네게 고하리라 그런즉 내 소년들로 네게 은혜를 얻게 하라 우리가 좋은 날에 왔은즉 네 손에 있는 대로 네 종들과 네 아들 다윗에게 주기를 원하노라 하더라' 하라
Jụọkwa ndị ikom gị, ha ga-agwa gị ma ihe m kwuru ọ bụ eziokwu. Ya mere gosi ụmụ okorobịa ndị a ihuọma, ebe ọ bụ na ha na-abịakwute gị nʼoge mmemme. Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a, na mụ bụ Devid nwa gị, ihe ọbụla aka gị ruru.’”
9 다윗의 소년들이 가서 다윗의 이름으로 이 모든 말을 나발에게 고하기를 마치매
Ụmụ okorobịa Devid zipụrụ bịarutere zie Nebal ozi Devid ziri ha. Ha nọgidekwara chere ka onye ha ọsịsa.
10 나발이 다윗의 사환들에게 대답하여 가로되 `다윗은 누구며 이새의 아들은 누구뇨 근일에 각기 주인에게서 억지로 떠나는 종이 많도다
Ma Nebal jụrụ ha sị, “Onye bụ Devid? Onye bụkwa nwa Jesi a? Ọtụtụ ndị ohu dị taa bụ ndị na-esi nʼaka nna ha ukwu na-agbapụ.
11 내가 어찌 내 떡과 물과 내 양털 깎는 자를 위하여 잡은 고기를 가져 어디로서인지 알지도 못하는 자들에게 주겠느냐?' 한지라
M ga-ewere achịcha m, na mmiri m, na anụ m gburu nʼihi ndị na-akpachara m ajị anụ nye ndị m na-amaghị ebe ha sị pụta?”
12 이에 다윗의 소년들이 돌이켜 자기 길로 행하여 돌아와서 이 모든 말로 그에게 고하매
Ndị ikom Devid tụgharịrị azụ laghachi ebe ha si bịa. Mgbe ha bịarutere, ha kọrọ akụkọ banyere okwu niile Nebal kwuru.
13 다윗이 자기 사람들에게 이르되 `너희는 각기 칼을 차라' 각기 칼을 차매 다윗도 자기 칼을 차고 사백명 가량은 데리고 올라가고 이백명은 소유물 곁에 있게 하니라
Devid sịrị ndị ikom ya, “Onye ọbụla nyara mma agha!” Ha mere ihe o kwuru. Devid nʼonwe ya nyanyekwara mma agha nke ya. Ihe dị ka narị ndị ikom anọ sooro Devid pụọ, ebe narị mmadụ abụọ ndị ọzọ nọdụrụ na-eche ụlọ ha nche.
14 소년중 하나가 나발의 아내 아비가일에게 고하여 가로되 `다윗이 우리 주인에게 문안하러 광야에서 사자들을 보내었거늘 주인이 그들을 수욕하였나이다
Ma otu nʼime ndị ikom Nebal gara kọọrọ Abigel, nwunye Nebal sị ya, “Lee, Devid esitela nʼọzara zite ndị ozi ka ha nye onyenwe anyị ekele ya, ma ọ kparịrị ha, baakwara ha mba.
15 우리가 들에 있어 그들과 상종할 동안에 그 사람들이 우리를 매우 선대하였으므로 우리가 상하거나 잃은 것이 없었으니
Ma ndị ikom ndị a mesoro anyị mmeso ọma, ha emejọghị anyị. Oge ahụ niile anyị nọ ha nso nʼọhịa ọ dịghị ihe funarịrị anyị.
16 우리가 양을 지키는 동안에 그들이 우리와 함께 있어 밤낮 우리에게 담이 되었음이라
Ehihie na abalị, ha bụụrụ anyị mgbidi, ichebe anyị na atụrụ anyị, mgbe ha na-akpa nri nʼakụkụ ebe ha nọ.
17 그런즉 이제 당신은 어떻게 할 것을 알아 생각하실지니 이는 다윗이 우리 주인과 주인의 온 집을 해하기로 결정하였음이니이다 주인은 불량한 사람이라 더불어 말할 수 없나이다'
Ọ dị mma ka ị mata ma marakwa ihe ị ga-eme ngwangwa; nʼihi nsogbu dị njọ nke na-aga ịdịrị nna anyị ukwu na ezinaụlọ ya niile. Nʼihi ọ bụ nwoke jọgburu onwe ya, na ọ dịghị onye pụrụ ịgwa ya okwu.”
18 아비가일이 급히 떡 이백 덩이와 포도주 두 가죽 부대와 잡아 준비한 양 다섯과 볶은 곡식 다섯 세아와 건포도 백송이와 무화과뭉치 이백을 취하여 나귀들에게 싣고
Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu.
19 소년들에게 이르되 `내 앞서 가라 나는 너희 뒤에 가리라' 하고 그 남편 나발에게는 고하지 아니하니라
Ọ sịrị ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, “Na-aganụ nʼihu, ana m abịa nʼazụ.” Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ na-aga ime.
20 아비가일이 나귀를 타고 산 유벽한 곳으로 좇아 내려가더니 다윗과 그의 사람들이 자기에게로 마주 내려오는 것을 만나니라
Mgbe ọ nọ nʼelu ịnyịnya ibu na-agbada ụzọ nke ugwu ahụ ọ hụrụ Devid na ndị agha ya ka ha na-abịa. O zutere ha
21 다윗이 이미 말하기를 `내가 이 자의 소유물을 광야에서 지켜 그 모든 것을 하나도 손실이 없게 한 것이 진실로 허사라 그가 악으로 나의 선을 갚는도다
ma Devid nọrịị na-ekwu na-asị, “Ọ bụ nʼefu ka anyị nyeere nwoke a aka. Anyị chebere igwe ewu na atụrụ ya nʼọzara; ọ dịkwaghị otu furu efu, ọ dịkwaghị otu nke e zuru ezu, ma o jirila ajọ omume kwụghachi m ihe ọma m meere ya.
22 내가 그에게 속한 모든 것 중 한 남자라도 아침까지 남겨두면 하나님은 다윗에게 벌을 내리시고 또 내리시기를 원하노라' 하였더라
Ka Chineke mesoo Devid mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ahapụ otu mkpụrụ nwoke ndụ nʼetiti ihe niile o nwere na-eku ume, mgbe chi echi bọrọ.”
23 아비가일이 다윗을 보고 급히 나귀에서 내려 다윗의 앞에 엎드려 그 얼굴을 땅에 대니라
Mgbe Abigel hụrụ Devid, o mere ngwangwa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịda, kpuo ihu nʼala, kpọọ isiala nye Devid.
24 그가 다윗의 발에 엎드려 가로되 `내 주여! 청컨대 이 죄악을 나 곧 내게로 돌리시고 여종으로 주의 귀에 말하게 하시고 이 여종의 말을 들으소서
Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, sị, “Ka ajọ omume ahụ dịkwasị nʼisi ohu gị, onyenwe m. Biko, kwere ka ohu gị gwa gị okwu, gekwaa ntị nʼihe ohu gị nwere ikwu.
25 원하옵나니 내 주는 이 불량한 사람 나발을 개의치 마옵소서 그 이름이 그에게 적당하니 그 이름이 나발이라 그는 미련한 자니이다 여종은 내 주의 보내신 소년들을 보지 못하였나이다
Nebal bụ nwoke nwere obi ọjọọ, biko ka onyenwe m ghara ịgụ ihe ọbụla o kwuru nʼihe. Ọ bụ onye nzuzu, dịka aha ya na-egosi. Aha ya pụtara nzuzu, nzuzu na-esokwa ya. Ma ahụghị m ndị ozi ahụ i zitere, nʼezie ohu gị ahụghị ndị ikom onyenwe m zitere.
26 내 주여 여호와께서 사시고 내 주도 살아계시거니와 내 주의 손으로 피를 흘려 친히 보수하시는 일을 여호와께서 막으셨으니 내 주의 원수들과 내 주를 해하려 하는자들은 나발과 같이 되기를 원하나이다
Ugbu a, onyenwe m, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ ma gị onwe gị na-adịkwa ndụ, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbochiri gị ka ị ghara ịba nʼikpe ọmụma nke igbu mmadụ, na iji aka gị bọrọ onwe gị ọbọ, ka ndụ ndị iro gị na ndị niile na-achọ ime onyenwe m ihe ọjọọ, dịka Nebal.
27 여종이 내 주에게 가져온 이 예물로 내 주를 좇는 이 소년들에게 주게 하시고
Ma kwerekwa ka onyinye a, nke ohu gị nwanyị wetaara nna m ukwu, bụrụ nke a ga-enye ndị ikom na-eso gị.
28 주의 여종의 허물을 사하여 주옵소서! 여호와께서 반드시 내 주를 위하여 든든한 집을 세우시리니 이는 내 주께서 여호와의 싸움을 싸우심이요 내 주의 일생에 내 주에게서 악한 일을 찾을 수 없음이니이다
“Biko, gbaghara njehie ohu gị nwanyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị aghaghị imere onyenwe m alaeze nke ga-adịgide, nʼihi na ọ bụ agha Onyenwe anyị ka ị na-alụ, agaghị ahụta ajọ omume nʼime gị ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
29 사람이 일어나서 내 주를 쫓아 내 주의 생명을 찾을지라도 내 주의 생명은 내 주의 하나님 여호와와 함께 생명싸개 속에 싸였을 것이요 내 주의 원수들의 생명은 물매로 던지듯 여호와께서 그것을 던지시리이다
Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ị na-achụ gị ịnapụ gị ndụ gị, ma ndụ onyenwe m ga-abụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị ga-ekechi na ngwungwu ndị dị ndụ. Ma ndụ ndị iro gị ka ọ ga-atụfu dịka nkume esi nʼakpa e ji efe ebe.
30 여호와께서 내 주에 대하여 하신 말씀대로 모든 선을 내 주에게 행하사 내 주를 이스라엘의 지도자로 세우신 때에
Mgbe Onyenwe anyị mezuru nye onyenwe m ihe ọma niile nke o kwere na nkwa, meekwa ya onyendu ndị Izrel,
31 내 주께서 무죄한 피를 흘리셨다든지 내 주께서 친히 보수하셨다든지 함을 인하여 슬퍼하실 것도 없고 내 주의 마음에 걸리는 것도 없으시리니 다만 여호와께서 내 주를 후대하신 때에 원컨대 내 주의 여종을 생각하소서'
onyenwe m agaghị enwe akọnuche nke ga na-esogbu ya nʼihi na o ji aka ya bọọrọ onwe ya ọbọ, maọbụ nke iwufu ọbara. Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara onyenwe m nke ọma, chetakwa ohu gị nwanyị.”
32 다윗이 아비가일에게 이르되 `오늘날 너를 보내어 나를 영접케 하신 이스라엘의 하나님 여호와를 찬송할지로다!
Devid zara Abigel sị ya, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel onye zitere gị taa ka ị bịa zute m.
33 또 네 지혜를 칭찬할지며 또 네게 복이 있을지로다! 오늘날 내가 피를 흘릴 것과 친히 보수하는 것을 네가 막았느니라
Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ.
34 나를 막아 너를 해하지 않게 하신 이스라엘의 하나님 여호와의 사심으로 맹세하노니 네가 급히 와서 나를 영접지 아니하였더면 밝는 아침에는 과연 나발에게 한 남자도 남겨두지 아니하였으리라'
Ma ọ bụghị otu a, dịka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel na-adị ndụ, bụ onye jidere m site nʼimerụ gị ahụ, ọ bụrụ na ị pụtaghị ngwa izute m, ọ dịghị otu nwoke gaara adị ndụ nʼụlọ Nebal nʼìhè ụtụtụ echi.”
35 다윗이 그가 가져온 것을 그의 손에서 받고 그에게 이르되 `네 집으로 평안히 올라가라 내가 네 말을 듣고 네 청을 허락하노라'
Devid naara ya ihe ndị ahụ niile o wetara sị ya, “Laghachi nʼụlọ gị nʼudo. Anụla m ihe i kwuru ma meekwa ihe ị rịọrọ.”
36 아비가일이 나발에게로 돌아오니 그가 왕의 잔치 같은 잔치를 그집에 배설하고 대취하여 마음에 기뻐하므로 아비가일이 밝는 아침까지는 다소간 말하지 아니하다가
Mgbe Abigel batara nʼụlọ, o jekwuru Nebal ebe ọ nọ nʼoriri ọ kpọrọ, oriri dịka oriri a na-enwe nʼụlọeze. Ọ ṅụọkwala mmanya ṅụbigakwa ya oke; nʼihi ya ọ gwaghị ya ihe ọbụla tutu ruo nʼụtụtụ.
37 아침에 나발이 포도주가 깬 후에 그 아내가 그에게 이 일을 고하매 그가 낙담하여 몸이 돌과 같이 되었더니
Nʼụtụtụ, mgbe mmanya pụrụ Nebal nʼanya, nwunye ya gwara ya ihe ndị a niile. Nke a mere ka obi ya nwụọ, ka ọ tọgbọrọ dịka nkume.
38 한 열흘 후에 여호와께서 나발을 치시매 그가 죽으니라
Mgbe abalị iri gafere, Onyenwe anyị tiri Nebal ihe otiti, nke mere ka ọ nwụọ.
39 다윗이 나발의 죽었다 함을 듣고 가로되 `나발에게 당한 나의 욕을 신설하사 종으로 악한 일을 하지 않게 하신 여호와를 찬송할지로다! 여호와께서 나발의 악행을 그 머리에 돌리셨도다' 하니라 다윗이 아비가일로 자기 아내를 삼으려고 보내어 그에게 말하게 하매
Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye kpechitere m okwu m megide Nebal nʼihi nlelị anya o leliri m. O gbochiela ohu ya site nʼime ihe ezighị ezi, ma kwụghachi Nebal ụgwọ mmehie ya.” Mgbe ahụ Devid zigara ndị ozi ka ha gaa jụọ Abigel ma ọ ga-ekwe ị ghọọ nwunye ya.
40 다윗의 사환들이 갈멜에 가서 아비가일에게 이르러 그에게 일러 가로되 `다윗이 당신을 아내로 삼고자 하여 우리를 당신께 보내더이다'
Ndị ozi Devid bịakwutere Abigel na Kamel zie ya ozi sị, “Devid zitere anyị bịakwute gị ịlụta gị ka ị ghọọ nwunye ya.”
41 그가 일어나 몸을 굽혀 얼굴을 땅에 대고 가로되 `내 주의 여종은 내 주의 사환들의 발 씻길 종이니이다' 하고
Abigel kpuru ihu nʼala sị ya, “Lee ohu gị nwanyị, ejikeere m ijere gị ozi, na ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi.”
42 급히 일어나서 나귀를 타고 따르는 처녀 다섯과 함께 다윗의 사자들을 따라가서 다윗의 아내가 되니라
Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid.
43 다윗이 또 이스르엘 아히노암을 취하였더니 그들 두 사람이 자기 아내가 되니라
Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam, onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya.
44 사울이 그 딸 다윗의 아내 미갈을 갈림에 사는 라이스의 아들 발디에게 주었더라
Nʼoge a, Sọl ewerela nwa ya nwanyị Mikal, onye bụ nwunye Devid kpọnye Palti, nwa Laish, onye obodo Galim, dịka nwunye.

< 사무엘상 25 >