< 역대상 24 >

1 아론 자손의 반차가 이러하니라 아론의 아들들은 나답과 아비후와 엘르아살과 이다말이라
Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha: Ụmụ ndị ikom Erọn bụ Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
2 나답과 아비후가 그 아비보다 먼저 죽고 아들이 없으므로 엘르아살과 이다말이 제사장의 직분을 행하였더라
Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja.
3 다윗이 엘르아살의 자손 사독과 이다말의 자손 아히멜렉으로 더불어 저희를 나누어 각각 그 섬기는 직무를 맡겼는데
Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a.
4 엘르아살의 자손 중에 족장이 이다말의 자손보다 많으므로 나눈 것이 이러하니 엘르아살 자손의 족장이 십륙이요 이다말 자손은 그 열조의 집을 따라 여덟이라
Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ.
5 이에 제비 뽑아 피차에 차등이 없이 나누었으니 이는 성소의 일을 다스리는 자가 엘르아살의 자손 중에도 있고 이다말의 자손 중에도 있음이라
E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama.
6 레위 사람 느다넬의 아들 서기관 스마야가 왕과 방백과 제사장 사독과 아비아달의 아들 아히멜렉과 및 제사장과 레위 사람의 족장 앞에서 그 이름을 기록하여 엘르아살의 자손 중에서 한 집을 취하고 이다말의 자손 중에서 한 집을 취하였으니
Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ.
7 첫째로 제비뽑힌 자는 여호야립이요 둘째는 여다야요
Nza nke mbụ mara Jehoiarib nke abụọ a maa Jedaya
8 세째는 하림이요 네째는 스오림이요
nke atọ, Harim nke anọ, Seorim
9 다섯째는 말기야요 여섯째는 미야민이요
nke ise, Malkija nke isii, Mijamin
10 일곱째는 학고스요 여덟째는 아비야요
nke asaa, Hakoz nke asatọ, Abija
11 아홉째는 예수아요 열째는 스가냐요
nke itoolu, Jeshua nke iri, Shekanaya
12 열 한째는 엘리아십이요 열 둘째는 야김이요
nke iri na otu, Eliashib nke iri na abụọ, Jakim
13 열 세째는 훔바요 열 네째는 예세브압이요
nke iri na atọ, Hupa nke iri na anọ, Jeshebeab
14 열 다섯째는 빌가요 열 여섯째는 임멜이요
nke iri na ise, Bilga nke iri na isii, Imea
15 열 일곱째는 헤실이요 열 여덟째는 합비세스요
nke iri na asaa, Hezia nke iri na asatọ, Hapizez
16 열 아홉째는 브다히야요 스무째는 여헤스겔이요
nke iri na itoolu, Petahaya nke iri abụọ, Jehezkel
17 스물 한째는 야긴이요 스물 둘째는 가물이요
nke iri abụọ na otu, Jakin nke iri abụọ na abụọ, Gamul
18 스물 세째는 들라야요 스물 네째는 마아시야라
nke iri abụọ na atọ, Delaya nke iri abụọ na anọ, Maazaya.
19 이와 같은 반차로 여호와의 전에 들어가서 이스라엘 하나님 여호와께서 저희 조상 아론에게 명하신 규례대로 수종들었더라
Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu.
20 레위 자손 중에 남은 자는 이러하니 아므람의 아들 중에는 수바엘이요 수바엘의 아들 중에는 예드야며
Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị: Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel. Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia.
21 르하뱌에게 이르러는 그 아들 중에 족장 잇시야요
Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.
22 이스할의 아들 중에는 슬로못이요 슬로못의 아들중에는 야핫이요
Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot. Sitekwa nʼụmụ Shelomot a họpụtaara Jahat.
23 헤브론의 아들들은 장자 여리야와 둘째 아마랴와 세째 야하시엘과 네째 여가므암이요
Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara Jeraya, nwa mbụ ya, Amaraya nwa nke abụọ ya, Jahaziel nwa nke atọ ya na Jekameam nwa nke anọ ya.
24 웃시엘의 아들은 미가요 미가의 아들중에는 사밀이요
A họpụtara Maịka nwa Uziel, sitekwa nʼụmụ Maịka họpụta Shamia.
25 미가의 아우는 잇시야라 잇시야의 아들 중에는 스가랴며
A họpụtara nwanne Maịka nke nwoke aha ya bụ Ishaya, sitekwa nʼụmụ Ishaya họpụta Zekaraya.
26 므라리의 아들은 마흘리와 무시요 야아시야의 아들은 브노니
Site nʼụmụ Merari e nwere Mahali na Mushi. A họpụtakwara Beno nwa Jaazia.
27 므라리의 자손 야아시야에게서 난 자는 브노와 소함과 삭굴과 이브리요
Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a: Beno, Shoham, Zakua na Ibri.
28 마흘리의 아들 중에는 엘르아살이니 엘르아살은 무자하며
Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke.
29 기스에게 이르러는 그 아들 여라므엘이요
Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel.
30 무시의 아들은 마흘리와 에델과 여리못이니 이는 다 그 족속대로 기록한 레위 자손이라
Site nʼụmụ Mushi, a họpụtara Mahali, na Eda na Jerimot. Ndị a niile bụ ndị Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị.
31 이 여러 사람도 다윗 왕과 사독과 아히멜렉과 및 제사장과 레위 족장 앞에서 그 형제 아론 자손처럼 제비 뽑혔으니 장자의 종가와 그 아우의 종가가 다름이 없더라
Dịka e mere mgbe a na-ahọpụta ụmụ Erọn, e ji ife nza kenye ha niile ọrụ ha kwesiri ịrụ nʼotu nʼotu, onye ukwu ha na onye nta ha. E mere ya nʼihu eze Devid, na Zadọk, na Ahimelek, na ndịisi ezinaụlọ ndị nchụaja na ndị Livayị niile. Mgbe a na-efe nza a, e mesoro ndị ikom niile otu mmeso, ma okenye ha ma ndị na-etolite etolite.

< 역대상 24 >