+ Matayo 1 >
1 Kitabu kya lukholo lwa Yesu Kristu mwana ghwa Daudi, mwana ghwa Ibrahimu.
Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham.
2 Ibrahimu aj'hele tata ghwa Isaka, ni Isaka aj'hele tata ghwa Yakobo, ni Yakobo tata ghwa Yuda ni bhalongomunu.
Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya.
3 Yuda aj'hele tata ghwa Peresi ni Sera kwa Tamari, Peresi tata ghwa Hezeroni, ni Hezeroni tata ghwa Ramu.
Juda mụtara Perez na Zera site na Tama, Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram.
4 Ramu ajhele tata ghwa Aminadabu, Aminadabu tata ghwa Nashoni, ni Nashoni tata ghwa Salimoni.
Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn.
5 Salimoni ajhele tata ghwa Boazi kwa Rahabu, Boazi tata ghwa Obedi kwa Ruth, Obedi tata ghwa Yese,
Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi.
6 Yese ajhele tata ghwa mfalme Daudi. Daudi ajhele tata ghwa Sulemani kwa n'dala ghwa Uria.
Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya.
7 Sulemani ajhele tata ghwa Rehoboamu, Rehoboamu tata ghwa Abiya, Abiya tata ghwa Asa.
Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abija, Abija amụọ Esa.
8 Asa ajhele tata ghwa Yehoshafati, Yehoshafati tata ghwa Yoramu, ni Yoramu tata ghwa Uzia.
Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa.
9 Uzia ajhele tata ghwa Yothamu, Yothamu tata ghwa Ahazi, Ahazi tata ghwa Hezekia.
Ụzaịa mụrụ Jotam, Jọtam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya.
10 Hezekia ajhele tata ghwa Manase, Manase tata ghwa Amoni ni Amoni tata ghwa Yosia.
Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya.
11 Yosia ajhele tata ghwa Yekonia ni bhalongomunu bhwakati bhwa kutolibhwa kulota Babeli.
Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya.
12 Ni baada jha kutolibhwa kul'ota Babeli, Yekonia ajhele tata ghwa Shatieli, Shatieli ajhele kokho munu ni Zerubabeli.
Mgbe ha si Babilọn lọta Jekonaya mụrụ Shealtiel, Shealtiel amụọ Zerubabel.
13 Zerubabeli ajhele tata ghwa Abiudi, Abiudi tata ghwa Eliakimu, ni Eliakimu tata ghwa Azori.
Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakịm, Eliakịm amụọ Azoa.
14 Azori ajhele tata ghwa Zadoki, Zadoki tata ghwa Akimu, Akimu tata ghwa Eliudi.
Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akịm, Akịm amụọ Eliud.
15 Eliudi ajhele tata ghwa Elieza, Elieza tata ghwa Matani ni Matani tata ghwa Yakobo.
Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb.
16 Yakobo ajhele tata ghwa Yusufu n'gosi ghwa Mariamu, ambajhe kwa muene Yesu ahogoliki, j'haikutibhwa Kristu.
Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst.
17 Fizazi fyoha kuh'omela Ibrahimu hadi Daudi fyaj'hele fizazi kumi na nne, kuh'omela Daudi hadi kutolibhwa kulota Babeli fizazi kumi na nne, ni kuhomela kutolibhwa kulota Babeli hadi Kristu fizazi kumi na nne.
Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.
18 Kuhogoleka kwa Yesu Kristu kwajhele namna e'j'he. Ndebhuake, Mariamu, achumbilibhu ni Yusufu, lakini kabla bhakhona kubhonana, abhonekene kujha nu luleme kwa ngofo sya Roho Mtakatifu.
Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ.
19 Ngwanamunu Yusufu, aj'hele munu mwenye haki alondeghe lepi kun'haibisya hadharani. Aamuili kuleka uchumba bhwake kwa siri.
Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.
20 Bho ifikirira juu j'ha mambo agha, Malaika ghwa Bwana an'hidili mu ndoto, ajobhili, “Yusufu muana ghwa Daudi, usilili kun'tola Mariamu kama n'dalabhu, kwa ndabha luleme lwaaj'henabhu ni kwa bhuweza bhwa Roho Mtakatifu.
Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.
21 Ibetakuhogola mwana ghwa n'gosi ni ghwibeta kun'kuta lihina lyake Yesu, kwa ndabha ibetakubhaokola bhanu bhake ni dhambi syabhene.”
Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.”
22 Ghoha agha ghahomili kutimisibhwa k'hela kyaka nenebhu ni Bwana kwa nj'hela j'ha nabiii ajobhili,
Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị,
23 “Langai, bikira ibetakukabha luleme ni kuhogola muana n'gosi, na bhibetakun'kuta lihina lyake Imanueli”— maana ghiake, “K'yara pamonga natu.”
“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).
24 Yusufu aj'humuiki kuh'omela mulugono ni kubhomba kama malaika ghwa Bwana kyaan'jobhili na an'tolili kama n'dala.
Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya.
25 Hata nahu agonililepi naku mpaka bho akifunguili muana n'gosi ni kunkuta lihina lyake Yesu
Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.