< ಅರಣ್ಯಕಾಂಡ 2 >

1 ಯೆಹೋವ ದೇವರು ಮಾತನಾಡಿ ಮೋಶೆ ಮತ್ತು ಆರೋನನಿಗೆ ಹೇಳಿದ್ದೇನೆಂದರೆ:
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị ha,
2 “ಇಸ್ರಾಯೇಲರು ಒಬ್ಬೊಬ್ಬರಾಗಿ ಕುಟುಂಬಗಳ ಗುರುತುಗಳ ಪ್ರಕಾರ ತಮ್ಮ ತಮ್ಮ ದಂಡಿನ ಧ್ವಜಗಳ ಬಳಿಯಲ್ಲಿ ಇಳಿದುಕೊಳ್ಳಬೇಕು. ಅವರು ದೇವದರ್ಶನ ಗುಡಾರದ ಎದುರಿನಲ್ಲಿ ಸುತ್ತುಮುತ್ತಲೂ ಇಳಿದುಕೊಳ್ಳಬೇಕು.”
“Ụmụ Izrel ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute, nʼebe dịpụturu adịpụ site nʼụlọ nzute ahụ. Onye ọbụla ga-ama ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ọkọlọtọ ebo ya, ha na ihe ịrịbama nke ụlọ ha.”
3 ದೇವದರ್ಶನ ಗುಡಾರದ ಪೂರ್ವದಿಕ್ಕಿನಲ್ಲಿ, ಸೂರ್ಯೋದಯದ ಕಡೆಗೆ ಯೆಹೂದ ದಂಡಿನ ಧ್ವಜದ ಬಳಿಯಲ್ಲಿ ತಮ್ಮ ಸೈನ್ಯಗಳ ಪ್ರಕಾರ ಇಳಿದುಕೊಳ್ಳಬೇಕು. ಯೆಹೂದ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಅಮ್ಮೀನಾದಾಬನ ಮಗ ನಹಶೋನನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, usuu ndị agha ebo Juda, ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha ga-abụ Nashọn nwa Aminadab.
4 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 74,600 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ya dị puku iri asaa na anọ, na narị isii
5 ಅವರ ಬಳಿಯಲ್ಲಿ ಇಳಿದುಕೊಳ್ಳುವವರು ಇಸ್ಸಾಕಾರನ ಗೋತ್ರದವರು. ಇಸ್ಸಾಕಾರನ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಚೂವಾರನ ಮಗ ನೆತನೆಯೇಲ್ ಎಂಬ ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Isaka ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Netanel nwa Zua.
6 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 54,400 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ.
7 ಅವನ ಬಳಿಯಲ್ಲಿ ಇಳಿದುಕೊಳ್ಳುವವರು ಜೆಬುಲೂನ್ಯನ ಗೋತ್ರದವರು. ಜೆಬುಲೂನ್ಯನ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಹೇಲೋನನ ಮಗ ಎಲೀಯಾಬನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn.
8 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 57,400 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ.
9 ಯೆಹೂದನ ಪಾಳೆಯದಲ್ಲಿ ಎಣಿಸಲಾದ ಅವರ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 1,86,400 ಮಂದಿ. ಅವರು ಮೊದಲು ಹೊರಡತಕ್ಕವರು.
Ọnụọgụgụ ndị niile a gụkọtara ha na Juda nʼọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku asatọ na puku isii na narị anọ. Ha ga-ebu ụzọ bulie ije.
10 ದಕ್ಷಿಣ ದಿಕ್ಕಿನಲ್ಲಿ: ರೂಬೇನ್ ಕುಲದ ದಂಡಿಗೆ ಸೇರಿದವರು ಅವರವರ ಸೈನ್ಯಗಳ ಪ್ರಕಾರ ತಮ್ಮ ಡೇರೆಗಳನ್ನು ಹಾಕಿಕೊಳ್ಳಬೇಕು. ರೂಬೇನನ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಶೆದೇಯೂರನ ಮಗ ಎಲೀಚೂರನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Nʼakụkụ ndịda ka usuu ndị agha ebo Ruben ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Elizọ nwa Shedeua.
11 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 46,500 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise.
12 ಅವರ ಬಳಿಯಲ್ಲಿ ಇಳಿದುಕೊಳ್ಳುವವರು ಸಿಮೆಯೋನನ ಗೋತ್ರದವರು. ಸಿಮೆಯೋನನ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಚುರೀಷದ್ದೈಯನ ಮಗನಾದ ಶೆಲುಮೀಯೇಲನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Nʼakụkụ ha ka ebo Simiọn ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Shelumiel nwa Zurishadai.
13 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 59,300 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ.
14 ತರುವಾಯ ಗಾದ್ ಗೋತ್ರದವರು. ಗಾದನ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ದೆವುಯೇಲನ ಮಗ ಎಲ್ಯಾಸಾಫನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel.
15 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 45,650 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise.
16 ರೂಬೇನನ ಪಾಳೆಯದಲ್ಲಿ ಎಣಿಸಲಾದ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 1,51,450 ಮಂದಿ. ಇವರು ಎರಡನೆಯ ದಂಡಾಗಿ ಹೊರಡಬೇಕು.
Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ruben bikọrọ na ndịda ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na otu, na narị anọ na iri ise dịka usuu ndị agha ha si dị. Ebo atọ a bụ ndị na-eso ebo atọ nke mbụ ahụ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
17 ತರುವಾಯ ದೇವದರ್ಶನ ಗುಡಾರವೂ ಲೇವಿಯರ ಪಾಳೆಯವೂ ಪಾಳೆಯಗಳ ಮಧ್ಯದಲ್ಲಿ ಹೊರಡಬೇಕು. ಅವರು ಇಳಿದುಕೊಳ್ಳುವ ಪ್ರಕಾರವೇ, ತಮ್ಮ ತಮ್ಮ ಕಡೆಯಲ್ಲಿಯೂ ತಮ್ಮ ತಮ್ಮ ಧ್ವಜಗಳ ಪ್ರಕಾರವಾಗಿಯೂ ಹೊರಡಬೇಕು.
Ka ụlọ nzute na-azọli ije, ụlọ ikwu ndị Livayị ga-anọ nʼetiti ụlọ ikwu ndị ọzọ. Ha ga-ebili ije nʼusoro dịka ha si maa ụlọ ikwu ha. Ndị ọbụla nʼọnọdụ ha, nʼokpuru ọkọlọtọ nke na-akọwa ndị ha bụ.
18 ಎಫ್ರಾಯೀಮಿನವರ ಪಾಳೆಯದ ಧ್ವಜವು ಅವರ ಸೈನ್ಯಗಳ ಪ್ರಕಾರ ಪಶ್ಚಿಮದಲ್ಲಿರುವುದು: ಎಫ್ರಾಯೀಮನ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಅಮ್ಮೀಹೂದನ ಮಗ ಎಲೀಷಾಮಾನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ka ebo Ifrem ga-ama ụlọ ikwu ha dịka ọkọlọtọ ha si dị. Onyendu ha bụ Elishama nwa Amihud.
19 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 40,500 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ na narị ise.
20 ಅವರ ಬಳಿಯಲ್ಲಿ ಮನಸ್ಸೆ ಗೋತ್ರದವರು. ಮನಸ್ಸೆ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಪೆದಾಚೂರನ ಮಗ ಗಮಲಿಯೇಲನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Ebo Manase ga-amakwa ụlọ ikwu nʼakụkụ ha. Onyendu ha bụ Gamaliel nwa Pedazo.
21 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 32,200 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ.
22 ತರುವಾಯ ಬೆನ್ಯಾಮೀನ್ ಗೋತ್ರದವರು. ಬೆನ್ಯಾಮೀನನ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಗಿದ್ಯೋನಿಯ ಮಗ ಅಬೀದಾನನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Nʼakụkụ ha ka ebo Benjamin ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Abidan nwa Gidiọn.
23 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 35,400 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ.
24 ಎಫ್ರಾಯೀಮನ ಪಾಳೆಯದಲ್ಲಿ ಎಣಿಸಲಾದ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 1,08,100 ಮಂದಿ. ಇವರು ಮೂರನೆಯವರಾಗಿ ಹೊರಡತಕ್ಕವರು.
Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ifrem bikọrọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, puku asatọ na narị mmadụ. Ha niile na-esokwa nʼazụ ndị Livayị na ụlọ nzute ahụ. Ndị a bụ ndị na-eso nʼọnọdụ nke atọ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.
25 ದಾನನ ದಂಡಿನ ಧ್ವಜವು ಅವರವರ ಸೈನ್ಯಗಳ ಪ್ರಕಾರವಾಗಿ ಉತ್ತರದಲ್ಲಿರುವರು: ದಾನನ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಅಮ್ಮೀಷದ್ದೈಯನ ಮಗ ಅಹೀಗೆಜೆರನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Ebo Dan na usuu ndị agha ha ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ elu elu nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai
26 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 62,700 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ha dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa.
27 ಅವರ ಬಳಿಯಲ್ಲಿ ಇಳಿದುಕೊಳ್ಳುವವರು ಆಶೇರ್ ಗೋತ್ರದವರು. ಆಶೇರನ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಒಕ್ರಾನನ ಮಗ ಪಗೀಯೇಲನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Nʼakụkụ ha ka ebo Asha ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Pagịel nwa Okran.
28 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 41,500 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise.
29 ತರುವಾಯ ನಫ್ತಾಲಿ ಗೋತ್ರದವರು. ನಫ್ತಾಲಿ ಮಕ್ಕಳಿಗೆ ಏನಾನನ ಮಗ ಅಹೀರನು ಸೈನ್ಯಾಧಿಪತಿ.
Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan.
30 ಅವನ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 53,400 ಮಂದಿ.
Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ.
31 ದಾನನ ಪಾಳೆಯದಲ್ಲಿ ಎಣಿಸಲಾದ ಸೈನಿಕರ ಸಂಖ್ಯೆ 1,57,600 ಮಂದಿ. ಅವರು ತಮ್ಮ ಧ್ವಜಗಳ ಪ್ರಕಾರ ಕಡೆಯ ದಂಡಾಗಿ ಹೊರಡತಕ್ಕದ್ದು.
Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii. Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.
32 ಇಸ್ರಾಯೇಲರಲ್ಲಿ ತಮ್ಮ ಕುಟುಂಬಗಳ ಪ್ರಕಾರವಾಗಿ ಎಣಿಕೆಯಾದವರು ಇವರೇ. ಪಾಳೆಯದೊಳಗೆ ಅವರವರ ಸೈನ್ಯಗಳ ಪ್ರಕಾರ ಎಣಿಕೆಯಾದವರ ಸಂಖ್ಯೆ 6,03,550 ಮಂದಿ.
Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise nʼọnụọgụgụ.
33 ಯೆಹೋವ ದೇವರು ಮೋಶೆಗೆ ಆಜ್ಞಾಪಿಸಿದ ಪ್ರಕಾರ ಲೇವಿಯರು ಇಸ್ರಾಯೇಲರೊಳಗೆ ಎಣಿಕೆಯಾಗಲಿಲ್ಲ.
Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
34 ಯೆಹೋವ ದೇವರು ಮೋಶೆಗೆ ಆಜ್ಞಾಪಿಸಿದಂತೆಯೇ ಇಸ್ರಾಯೇಲರು ಎಲ್ಲವನ್ನೂ ಮಾಡಿದರು. ಹಾಗೆಯೇ ತಮ್ಮ ಧ್ವಜಗಳ ಪ್ರಕಾರವೂ ತಮ್ಮ ತಮ್ಮ ವಂಶಗಳ ಪ್ರಕಾರವೂ ತಮ್ಮ ಕುಟುಂಬಗಳ ಪ್ರಕಾರವೂ ಪಾಳೆಯವನ್ನು ಹಾಕಿಕೊಳ್ಳುತ್ತಾ ಮುಂದುವರಿಯುತ್ತಿದ್ದರು.
Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị.

< ಅರಣ್ಯಕಾಂಡ 2 >