< 詩篇 3 >

1 ダビデその子アブサロムを避しときのうた ヱホバよ我にあたする者のいかに蔓延れるや 我にさからびて起りたつもの多し
Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ. O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.
2 わが霊魂をあげつらひて かれは神にすくはるることなしといふ者ぞおほき (セラ)
Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị, “Chineke agaghị azọpụta ya.” (Sela)
3 されどヱホバよ なんぢは我をかこめる盾わが榮わが首をもたげ給ふものなり
Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m; I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.
4 われ聲をあげてヱホバによばはればその聖山より我にこたへたまふ (セラ)
Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. (Sela)
5 われ臥していね また目さめたり ヱホバわれを支へたまへばなり
Edinara m ala, hie ụra, ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.
6 われをかこみて立かまへたる干萬の人をも我はおそれじ
A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu, agaghị m atụ egwu ọbụla.
7 ヱホバよねがはくは起たまへ わが神よわれを救ひたまへ なんぢ曩にわがすべての仇の頬骨をうち惡きものの歯ををりたまへり
Bilie Onyenwe anyị! Zọpụta m Chineke m! Tie ndị iro m niile aka nʼagba; tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.
8 救はヱホバにあり ねがはくは恩恵なんぢの民のうへに在んことを (セラ)
Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa. Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. (Sela)

< 詩篇 3 >