< 箴言 知恵の泉 21 >
1 王の心はヱホバの手の中にありて恰かも水の流れのごとし 彼その聖旨のままに之を導きたまふ
Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma.
2 人の道はおのれの目に正しとみゆ されどヱホバは人の心をはかりたまふ
Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile.
3 正義と公平を行ふは犠牲よりも愈りてヱホバに悦ばる
Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja.
Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie.
5 勤めはたらく者の圖るところは遂にその身を豊裕ならしめ 凡てさわがしく急ぐ者は貧乏をいたす
Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru, dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ.
6 虚偽の舌をもて財を得るは吹はらはるる雲烟のごとし 之を求むる者は死を求むるなり
Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide, ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ.
7 惡者の残虐は自己を亡す これ義しきを行ふことを好まさればなり
Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma, ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi.
Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ, ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi.
9 相争ふ婦と偕に室に居らんよりは屋蓋の隅にをるはよし
Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
10 惡者の霊魂は惡をねがふ その鄰も彼にあはれみ見られず
Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ; ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere.
11 あざけるもの罰をうくれば拙者は智慧を得 ちゑあるもの教をうくれば知識を得
Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe, ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma.
12 義しき神は惡者の家をみとめて惡者を滅亡に投いれたまふ
Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi.
13 耳を掩ひて貧者の呼ぶ聲をきかざる者は おのれ自ら呼ぶときもまた聴れざるべし
Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye, ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya.
14 潜なる饋物は忿恨をなだめ 懐中の賄賂は烈しき瞋恚をやはらぐ
Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ, otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ.
15 公義を行ふことは義者の喜樂にして 惡を行ふものの敗壊なり
Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi, ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe.
16 さとりの道を離るる人は死し者の集会の中にをらん
Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ.
17 宴樂を好むものは貧人となり 酒と膏とを好むものは富をいたさじ
Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa; ịṅụ mmanya na oke oriri abụghị ụzọ esi akpata akụ.
18 惡者は義者のあがなひとなり 悸れる者は直き者に代る
Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume, onye aghụghọ ga-abụkwa ihe mgbapụta maka onye ndụ ya ziri ezi.
19 争ひ怒る婦と偕にをらんよりは荒野に居るはよし
Ọ ka mma ibi nʼọzara karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu.
20 智慧ある者の家には貴き寳と膏とあり 愚なる人は之を呑つくす
Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya, ma onye nzuzu na-eloda ihe niile nʼọnụ ya.
21 正義と憐憫と追求むる者は生命と正義と尊貴とを得べし
Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya ga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu.
22 智慧ある者は強者の城にのぼりて その堅く頼むところを倒す
Onye maara ihe nwere ike megide obodo ndị dike, kwatuokwa ebe ewusiri ike nke ha tụkwasịrị obi ha.
23 口と舌とを守る者はその霊魂を守りて患難に遇せじ
Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya na-egbochiri onwe ya ọdachi.
24 高ぶり驕る者を嘲笑者となづく これ驕者を逞しくして行ふものなり
Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya. Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile.
25 惰者の情慾はおのれの身を殺す 是はその手を肯て働かせざればなり
Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.
26 人は終日しきりに慾を図る されど義者は與へて吝まず
Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa, ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke.
27 惡者の献物は憎まる 況て惡き事のために献ぐる者をや
Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ.
28 虚偽の證人は滅さる 然れど聴く人は恒にいふべし
Onyeama ụgha ga-ala nʼiyi, ma onye ọbụla na-ege ya ntị ka a ga-ebibi ruo ebighị ebi.
Ndị ajọ omume na-ebi ndụ atụghị egwu, ma ndị omume ha ziri ezi na-atụgharị uche nʼụzọ ha niile.
30 ヱホバにむかひては智慧も明哲も謀賂もなすところなし
O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla, nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị.
31 戦闘の日のために馬を備ふ されど勝利はヱホバによる
E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha, maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.