< 箴言 知恵の泉 16 >

1 心に謀るところは人にあり 舌の答はヱホバより出づ
Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime, ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.
2 人の途はおのれの目にことごとく潔しと見ゆ 惟ヱホバ霊魂をはかりたまふ
Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.
3 なんぢの作爲をヱホバに託せよ さらば汝の謀るところ必ず成るべし
Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.
4 ヱホバはすべての物をおのおのその用のために造り 惡人をも惡き日のために造りたまへり
Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya, o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.
5 すべて心たかぶる者はヱホバに惡まれ 手に手をあはするとも罪をまぬかれじ
Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.
6 憐憫と眞實とによりて愆は贖はる ヱホバを畏るることによりて人惡を離る
Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.
7 ヱホバもし人の途を喜ばば その人の敵をも之と和がしむべし
Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.
8 義によりて得たるところの僅少なる物は不義によりて得たる多の資財にまさる
Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.
9 人は心におのれの途を考へはかる されどその歩履を導くものはヱホバなり
Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị, maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.
10 王のくちびるには神のさばきあり 審判するときその口あやまる可らず
Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta, ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.
11 公平の權衡と天秤とはヱホバのものなり 嚢にある分銅もことごとく彼の造りしものなり
Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị, ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.
12 惡をおこなふことは王の憎むところなり 是その位は公義によりて堅く立ばなり
Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị, nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.
13 義しき口唇は王によろこばる 彼等は正直をいふものを愛す
Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu, ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.
14 王の怒は死の使者のごとし 智慧ある人はこれをなだむ
Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ. Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.
15 王の面の光には生命あり その恩寵は春雨の雲のごとし
Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ, ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.
16 智慧を得るは金をうるよりも更に善らずや 聡明をうるは銀を得るよりも望まし
Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.
17 惡を離るるは直き人の路なり おのれの道を守るは霊魂を守るなり
Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ, ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.
18 驕傲は滅亡にさきだち誇る心は傾跌にさきだつ
Nganga na-eweta ịla nʼiyi, mpako na-ewetakwa ọdịda.
19 卑き者に交りて謙たるは驕ぶる者と偕にありて贈物をわかつに愈る
Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.
20 愼みて御言をおこなふ者は益をうべし ヱホバに倚頼むものは福なり
Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma, onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
21 心に智慧あれば哲者と稱へらる くちびる甘ければ人の知識をます
A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere. Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.
22 明哲はこれを持つものに生命の泉となる 愚なる者をいましむる者はおのれの痴是なり
Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya, ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.
23 智慧ある者の心はおのれの口ををしへ 又おのれの口唇に知識をます
Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya, egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.
24 こころよき言は蜂蜜のごとくにして 霊魂に甘く骨に良薬となる
Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.
25 人の自から見て正しとする途にして その終はつひに死にいたる途となるものあり
Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
26 労をるものは飮食のために骨をる 是その口おのれに迫ればなり
Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ; agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.
27 邪曲なる人は惡を掘る その口唇には烈しき火のごときものあり
Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ, egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.
28 いつはる者はあらそひを起し つけぐちする者は朋友を離れしむ
Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu; ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.
29 強暴人は沃の鄰をいざなひ 之を善らざる途にみちびく
Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha, na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.
30 その目を閉て惡を謀り その口唇を蹙めて惡事を成遂ぐ
Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ, onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.
31 白髪は榮の冠弁なり 義しき途にてこれを見ん
Isi awọ bụ okpueze nke mara mma, a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.
32 怒を遅くする者は勇士に愈り おのれの心を治むる者は城を攻取る者に愈る
Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.
33 人は籤をひく されど事をさだむるは全くヱホバにあり
A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.

< 箴言 知恵の泉 16 >