< 詩篇 68 >
1 聖歌隊の指揮者によってうたわせたダビデの歌、さんび 神よ、立ちあがって、その敵を散らし、神を憎む者をみ前から逃げ去らせてください。
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga.
2 煙の追いやられるように彼らを追いやり、ろうの火の前に溶けるように悪しき者を神の前に滅ぼしてください。
Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ, sikwa otu a chụsaa ha. Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ, ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke.
3 しかし正しい者を喜ばせ、神の前に喜び踊らせ、喜び楽しませてください。
Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ, ma ṅụrịa nʼihu Chineke; ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ.
4 神にむかって歌え、そのみ名をほめうたえ。雲に乗られる者にむかって歌声をあげよ。その名は主、そのみ前に喜び踊れ。
Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto, toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya, Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
5 その聖なるすまいにおられる神はみなしごの父、やもめの保護者である。
Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha, onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.
6 神は寄るべなき者に住むべき家を与え、めしゅうどを解いて幸福に導かれる。しかしそむく者はかわいた地に住む。
Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ, ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ.
7 神よ、あなたが民に先だち出て、荒野を進み行かれたとき、 (セラ)
Mgbe i buteere ndị gị ụzọ, O Chineke, mgbe i gabigara nʼala tọgbọrọ nʼefu, (Sela)
8 シナイの主なる神の前に、イスラエルの神なる神の前に、地は震い、天は雨を降らせました。
elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo, nʼihu Chineke, Onye Saịnaị, nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel.
9 神よ、あなたは豊かな雨を降らせて、疲れ衰えたあなたの嗣業の地を回復され、
I nyere mmiri ozuzo nʼebe ọ dị ukwuu, O Chineke, i tutere ihe nketa gị nke ike gwụrụ.
10 あなたの群れは、そのうちにすまいを得ました。神よ、あなたは恵みをもって貧しい者のために備えられました。
Ndị gị biri nʼime ya, site nʼoke akụnụba gị, O Chineke, ị rọpụtaara ndị ogbenye mkpa ha.
11 主は命令を下される。おとずれを携えた女たちの大いなる群れは言う、
Onyenwe anyị kpọsara okwu ahụ, ọnụọgụgụ ndị inyom kwusara ya bụ igwe dị ọtụtụ;
12 「もろもろの軍勢の王たちは逃げ去り、逃げ去った」と。家にとどまる女たちは獲物を分ける、
ndị eze na ndị agha ha ji ọsọ gbalaa; ndị mmadụ kere ihe a dọtara nʼagha, nʼime ọmụma ụlọ ikwu.
13 たとい彼らは羊のおりの中にとどまるとも。はとの翼は、しろがねをもっておおわれ、その羽はきらめくこがねをもっておおわれる。
Ọ bụladị mgbe ị na-arahụ ụra nʼetiti ọgba atụrụ, nku abụọ nke nduru m bụ ihe e ji ọlaọcha kpuchie, jirikwa ọlaedo nke na-enwuke kpuchie abụba ya.
14 全能者がかしこで王たちを散らされたとき、ザルモンに雪が降った。
Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a, ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon.
15 神の山、バシャンの山、峰かさなる山、バシャンの山よ。
Ugwu Bashan, ugwu mara mma nke ukwuu, ugwu Bashan, ugwu nwere nʼelu ya ọtụtụ ugwu dị iche iche.
16 峰かさなるもろもろの山よ、何ゆえ神がすまいにと望まれた山をねたみ見るのか。まことに主はとこしえにそこに住まわれる。
Gị ugwu nwere ọtụtụ ugwu, gịnị mere i ji ele anya site nʼekworo nʼugwu Chineke họọrọ ị bụ ebe ọ ga-anọ chịa, ebe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-ebi, ruo ebighị ebi?
17 主は神のいくさ車幾千万をもって、シナイから聖所に来られた。
Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha; ha dịkwa puku kwụrụ puku; Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya.
18 あなたはとりこを率い、人々のうちから、またそむく者のうちから贈り物をうけて、高い山に登られた。主なる神がそこに住まわれるためである。
Mgbe i rigoro gaa nʼelu, i duuru ndị a dọtara nʼagha; ị natara onyinye dị iche iche nʼaka ndị mmadụ, ọ bụladị nʼaka ndị na-enupu isi, ka gị, O Onyenwe anyị Chineke, biri nʼebe ahụ.
19 日々にわれらの荷を負われる主はほむべきかな。神はわれらの救である。 (セラ)
Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị, Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. (Sela)
20 われらの神は救の神である。死からのがれ得るのは主なる神による。
Chineke anyị bụ Chineke na-azọpụta; mgbapụta pụọ nʼọnwụ na-esite nʼaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
21 神はその敵のこうべを打ち砕き、おのがとがの中に歩む者の毛深い頭のいただきを打ち砕かれる。
Nʼezie, Chineke ga-egwepịa isi ndị iro ya niile, isi ndị niile na-aga nʼihu ibi ndụ mmehie.
22 主は言われた、「わたしはバシャンから彼らを携え帰り、海の深い所から彼らを携え帰る。
Onyenwe anyị kwuru sị, “Aga m esite na Bashan kpọlata ha, aga m adọpụta ha site nʼebe omimi nke osimiri,
23 あなたはその足を彼らの血に浸し、あなたの犬の舌はその分け前を敵から得るであろう」と。
ka unu nwee ike saa ụkwụ unu nʼime ọbara ndị iro unu, ka ire nkịta unu niile ketakwa oke nke ha.”
24 神よ、人々はあなたのこうごうしい行列を見た。わが神、わが王の、聖所に進み行かれるのを見た。
O Chineke, ahụla igwe ahịrị mmadụ ndị na-eso gị, bụ igwe ahịrị mmadụ nke so Chineke m, na Eze m na-aba nʼebe nsọ ahụ.
25 歌う者は前に行き、琴をひく者はあとになり、おとめらはその間にあって手鼓を打って言う、
Ndị na-abụ abụ nọ nʼihu, ndị na-eti egwu, na-eso ha nʼazụ; ụmụ agbọghọ na-akpọ ụbọ sokwa ha.
26 「大いなる集会で神をほめよ。イスラエルの源から出た者よ、主をほめまつれ」と。
Too Chineke nʼetiti nzukọ ukwuu ahụ; toonu Onyenwe anyị nʼetiti nzukọ ụmụ Izrel.
27 そこに彼らを導く年若いベニヤミンがおり、その群れの中にユダの君たちがおり、ゼブルンの君たち、ナフタリの君たちがいる。
Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha, lekwaa igwe ụmụ ndị eze Juda na nke Zebụlọn na Naftalị.
28 神よ、あなたの大能を奮い起してください。われらのために事をなされた神よ、あなたの力をお示しください。
O Chineke, kpọlite ike gị; mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ.
29 エルサレムにあるあなたの宮のために、王たちはあなたに贈り物をささげるでしょう。
Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem, ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche.
30 葦の中に住む獣、もろもろの民の子牛を率いる雄牛の群れをいましめてください。みつぎ物をむさぼる者たちを足の下に踏みつけ、戦いを好むもろもろの民を散らしてください。
Baara anụ ọhịa ahụ zoro nʼetiti riidi mba, igwe oke ehi nọ nʼetiti ụmụ ehi nke mba niile. Site na nweda nʼala, ka o wetara gị ogbe ọlaọcha. Chụsasịa mba niile, bụ ndị na-enwe mmasị nʼibu agha.
31 青銅をエジプトから持ちきたらせ、エチオピヤには急いでその手を神に伸べさせてください。
Ndị nnọchi anya obodo, ga-esite nʼIjipt bịa, Kush ga-etinye onwe ya nʼokpuru Chineke.
32 地のもろもろの国よ、神にむかって歌え、主をほめうたえ。 (セラ)
Bụkuo Chineke abụ, unu alaeze niile nke ụwa, bụkuo Onyenwe anyị abụ otuto, (Sela)
33 いにしえからの天の天に乗られる主にむかってほめうたえ。見よ、主はみ声を出し、力あるみ声を出される。
Bụọ abụ nye onye na-agba ịnyịnya nʼeluigwe, e, ọ bụladị eluigwe nke dịrị site na mgbe ochie, onye olu ike ya dịka egbe eluigwe.
34 力を神に帰せよ。その威光はイスラエルの上にあり、その力は雲の中にある。
Kwusaa ike Chineke, onye ịdị ukwuu nke ịma mma ya na-ekpuchi Izrel, onye ike ya dị nʼeluigwe.
35 神はその聖所で恐るべく、イスラエルの神はその民に力と勢いとを与えられる。神はほむべきかな。
O Chineke, ị dị oke egwu nʼime ụlọnsọ gị; Chineke nke Izrel na-enye ndị ya ume na ike. Toonu Chineke!