< 詩篇 144 >
1 ダビデの歌 わが岩なる主はほむべきかな。主は、いくさすることをわが手に教え、戦うことをわが指に教えられます。
Abụ Ọma nke Devid. Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m, onye na-ezi aka m abụọ ibu agha, na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.
2 主はわが岩、わが城、わが高きやぐら、わが救主、わが盾、わが寄り頼む者です。主はもろもろの民をおのれに従わせられます。
Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m, ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya, onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.
3 主よ、人は何ものなので、あなたはこれをかえりみ、人の子は何ものなので、これをみこころに、とめられるのですか。
O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya, gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi?
4 人は息にひとしく、その日は過ぎゆく影にひとしいのです。
Mmadụ dị ka otu nkuume; ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo.
5 主よ、あなたの天を垂れてくだり、山に触れて煙を出させてください。
O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata; metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.
6 いなずまを放って彼らを散らし、矢を放って彼らを打ち敗ってください。
Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile; gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha.
7 高い所からみ手を伸べて、わたしを救い、大水から、異邦人の手からわたしを助け出してください。
Site nʼelu setịpụ aka gị; gbapụta m, napụtakwa m site nʼoke osimiri, site nʼaka ndị si mba ọzọ,
8 彼らの口は偽りを言い、その右の手は偽りの右の手です。
ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.
9 神よ、わたしは新しい歌をあなたにむかって歌い、十弦の立琴にあわせてあなたをほめ歌います。
O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu;
10 あなたは王たちに勝利を与え、そのしもべダビデを救われます。
gị onye na-enye ndị eze mmeri, onye na-agbapụta ohu ya Devid. Site na mma agha dị njọ
11 わたしを残忍なつるぎから救い、異邦人の手から助け出してください。彼らの口は偽りを言い、その右の手は偽りの右の手です。
gbapụta m; napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.
12 われらのむすこたちはその若い時、よく育った草木のようです。われらの娘たちは宮の建物のために刻まれたすみの柱のようです。
Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha, ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma, ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị e ji achọ ụlọeze mma.
13 われらの倉は満ちて様々の物を備え、われらの羊は野でちよろずの子を産み、
Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri dị iche iche si nʼubi anyị. Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ, ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị;
14 われらの家畜はみごもって子を産むに誤ることなく、われらのちまたには悩みの叫びがありません。
igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ. A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile, a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ, akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile.
15 このような祝福をもつ民はさいわいです。主をおのが神とする民はさいわいです。
Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị; ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.