< 出エジプト記 28 >

1 またイスラエルの人々のうちから、あなたの兄弟アロンとその子たち、すなわちアロンとアロンの子ナダブ、アビウ、エレアザル、イタマルとをあなたのもとにこさせ、祭司としてわたしに仕えさせ、
“Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel kpọbata nwanne gị nwoke Erọn, ya na ụmụ ya ndị ikom, bụ Nadab, na Abihu, na Elieza na Itama. Ka ha jeere m ozi dịka ndị nchụaja.
2 またあなたの兄弟アロンのために聖なる衣服を作って、彼に栄えと麗しきをもたせなければならない。
Meere Erọn nwanne gị nwoke uwe nsọ, nke ga-enye ya ugwu na nsọpụrụ.
3 あなたはすべて心に知恵ある者、すなわち、わたしが知恵の霊を満たした者たちに語って、アロンの衣服を作らせ、アロンを聖別し、祭司としてわたしに仕えさせなければならない。
Gwa ndị niile nwere onyinye ǹka nʼịdụ akwa, bụ ndị m nyere amamihe nʼihe ndị a, sị ha dụọrọ Erọn uwe pụrụ iche, nke e ji edo ya nsọ, ime ya onye na-ejere m ozi dịka onye nchụaja.
4 彼らの作るべき衣服は次のとおりである。すなわち胸当、エポデ、衣、市松模様の服、帽子、帯である。彼らはあなたの兄弟アロンとその子たちとのために聖なる衣服を作り、祭司としてわたしに仕えさせなければならない。
Nke a bụ ụdị uwe ha ga-adụ: Ihe mgbochi obi, efọọd, uwe ime ahụ akpara akpa na-enweghị aka na uwe mwụda buru ibu, na uwe ime ahụ nke tụrụ agwa agwa na akwa a na-atụhị nʼisi na nke a na-eke nʼukwu. Ha ga-adụrụ Erọn nwanne gị nwoke na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a dị nsọ. Ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
5 彼らは金糸、青糸、紫糸、緋糸、亜麻の撚糸を受け取らなければならない。
Ka ha jiri ogho ọlaedo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha dụọ ha.
6 そして彼らは金糸、青糸、紫糸、緋糸、亜麻の撚糸を用い、巧みなわざをもってエポデを作らなければならない。
“Weere ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
7 これに二つの肩ひもを付け、その両端を、これに付けなければならない。
Ọ ga-enwe akwa nʼubu ya abụọ nke e ji ejikọta ọnụ nkuku ya abụọ, ka e nwe ike na-ekechisi ya ike.
8 エポデの上で、これをつかねる帯は、同じきれでエポデの作りのように、金糸、青糸、紫糸、緋糸、亜麻の撚糸で作らなければならない。
Ihe okike nke ukwu ahụ nke onye ǹka kpaziri nke ọma ga-adị ka ya. Ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
9 あなたは二つの縞めのうを取って、その上にイスラエルの子たちの名を刻まなければならない。
“Were nkume ọniks abụọ, gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu ya,
10 すなわち、その名六つを一つの石に、残りの名六つを他の石に、彼らの生れた順に刻まなければならない。
nʼusoro dịka e si mụọ ha, isii nʼelu otu nkume, isii fọdụrụ na nkume nke ọzọ.
11 宝石に彫刻する人が印を彫刻するように、イスラエルの子たちの名をその二つの石に刻み、それを金の編細工にはめ、
Gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu nkume abụọ ndị ahụ, dịka onye ǹka si egbunye akara na nkume. Mgbe ahụ, hịọnye nkume ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo ahụ a kpara akpa,
12 この二つの石をエポデの肩ひもにつけて、イスラエルの子たちの記念の石としなければならない。こうしてアロンは主の前でその両肩に彼らの名を負うて記念としなければならない。
jikọta ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel. Erọn ga-ebukwa aha ndị a nʼelu ubu ya abụọ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị.
13 あなたはまた金の編細工を作らなければならない。
Ị ga-eji ọlaedo mee ihe ịchọ mma a tụrụ atụ.
14 そして二つの純金の鎖を、ひも細工にねじて作り、そのひもの鎖をかの編細工につけなければならない。
Jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ eriri a tụhịkọtara dịka ụdọ, jikọta eriri ọlaedo ahụ na ihe ịchọ mma ndị ahụ.
15 あなたはまたさばきの胸当を巧みなわざをもって作り、これをエポデの作りのように作らなければならない。すなわち金糸、青糸、紫糸、緋糸、亜麻の撚糸で、これを作らなければならない。
“Ị ga-adụ ihe mgbochi obi nke ikpe, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Mee ya dịka efọọd ahụ: jiri ogho edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee ya.
16 これは二つに折って四角にし、長さは一指当り、幅も一指当りとしなければならない。
Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara, nke apịajiri ụzọ abụọ.
17 またその中に宝石を四列にはめ込まなければならない。すなわち紅玉髄、貴かんらん石、水晶の列を第一列とし、
Mgbe ahụ, hịọnye nʼelu ya ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa. Ụdị ga-adị nʼahịrị nke mbụ bụ, nkume kanelian, krisolaịt na beril,
18 第二列は、ざくろ石、るり、赤縞めのう。
nʼahịrị nke abụọ, ga-abụ nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
19 第三列は黄水晶、めのう、紫水晶。
Nʼahịrị nke atọ ga-abụ nkume jasint, ageeti na ametisiti.
20 第四列は黄碧玉、縞めのう、碧玉であって、これらを金の編細工の中にはめ込まなければならない。
Nʼahịrị nke anọ, ga-abụ nkume topaazi, ọniks na jaspa. Hịọnye ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa.
21 その宝石はイスラエルの子らの名に従い、その名とひとしく十二とし、おのおの印の彫刻のように十二の部族のためにその名を刻まなければならない。
Ha niile ga-adị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
22 またひも細工にねじた純金の鎖を胸当につけなければならない。
“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi.
23 また、胸当のために金の環二つを作り、胸当の両端にその二つの環をつけ、
Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo abụọ, dụnye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ.
24 かの二筋の金のひもを胸当の端の二つの環につけなければならない。
Dụnye ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ,
25 ただし、その二筋のひもの他の両端をかの二つの編細工につけ、エポデの肩ひもにつけて、前にくるようにしなければならない。
were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa, konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya.
26 あなたはまた二つの金の環を作って、これを胸当の両端につけなければならない。すなわちエポデに接する内側の縁にこれをつけなければならない。
Ị ga-emekwa mgbaaka ọlaedo, konye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ.
27 また二つの金の環を作って、これをエポデの二つの肩ひもの下の部分につけ、前の方で、そのつなぎ目に近く、エポデの帯の上の方にあるようにしなければならない。
Ị ga-akpụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konye ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe nʼihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara ya, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.
28 胸当は青ひもをもって、その環をエポデの環に結びつけ、エポデの帯の上の方にあるようにしなければならない。こうして胸当がエポデから離れないようにしなければならない。
A ga-eji eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọtaa ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ ghara ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ.
29 アロンが聖所にはいる時は、さばきの胸当にあるイスラエルの子たちの名をその胸に置き、主の前に常に覚えとしなければならない。
“Nʼụzọ dị otu a, mgbe ọbụla Erọn banyere nʼEbe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu obi ya, nʼelu ihe mgbochi obi nke ikpe ahụ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile.
30 あなたはさばきの胸当にウリムとトンミムを入れて、アロンが主の前にいたる時、その胸の上にあるようにしなければならない。こうしてアロンは主の前に常にイスラエルの子たちのさばきを、その胸に置かなければならない。
Ị ga-etinyekwa nʼime ihe mgbochi obi ahụ ụmụ nkume abụọ e ji ajụta ase nke bụ Urim na Tumim. Ha ga-adị nʼelu obi Erọn mgbe ọbụla ọ gara nʼihu Onyenwe anyị. Otu a kwa, Erọn ga-ebukwa ihe e ji ajụta ase banyere ndị Izrel nʼelu obi ya mgbe niile, nʼihu Onyenwe anyị.
31 あなたはまた、エポデに属する上服をすべて青地で作らなければならない。
“Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ị ga-eji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ.
32 頭を通す口を、そのまん中に設け、その口の周囲には、よろいのえりのように織物の縁をつけて、ほころびないようにし、
Ọ ga-enwe oghere nʼetiti ya ebe a ga-esi na-etinye isi. A ga-enwe ihe ọkpụkpa gburugburu oghere a dịka nke olu uwe agha, ime ka o sie ike, ghara ịdọka.
33 そのすそには青糸、紫糸、緋糸で、ざくろを作り、そのすその周囲につけ、また周囲に金の鈴をざくろの間々につけなければならない。
Nʼọnụ ala ala uwe ahụ gburugburu, ị ga-akpanye ihe ọkpụkpa oyiyi mkpụrụ pomegranet. Ọ bụ ogho nke na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie ka ị ga-eji. Ị ga-akpanyekwa ataṅụ ọlaedo nʼetiti ha.
34 すなわち金の鈴にざくろ、また金の鈴にざくろと、上服のすその周囲につけなければならない。
Nʼọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, a ga-adụnye otu ataṅụ ọlaedo, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, gbaa gburugburu.
35 アロンは務の時、これを着なければならない。彼が聖所にはいって主の前にいたる時、また出る時、その音が聞えて、彼は死を免れるであろう。
Mgbe ọbụla Erọn na-eje ozi ya, ọ ghaghị iyi ya. Aga na anụ mgbịrịgba ataṅụ ahụ ka ọ na-akụ, mgbe ọ banyere nʼEbe Nsọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị, na mgbe o si nʼebe ahụ na-apụta, ka ọ ghara ịnwụ.
36 あなたはまた純金の板を造り、印の彫刻のように、その上に『主に聖なる者』と刻み、
“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee efere ntakịrị, gbunye akara dị otu a nʼelu ya: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
37 これを青ひもで帽子に付け、それが帽子の前の方に来るようにしなければならない。
Kenye eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ; ọ ga-adị nʼihu akwa ike nʼisi ahụ.
38 これはアロンの額にあり、そしてアロンはイスラエルの人々がささげる聖なる物、すなわち彼らのもろもろの聖なる供え物についての罪の責めを負うであろう。これは主の前にそれらの受けいれられるため、常にアロンの額になければならない。
Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn. Ọ ga-ebukwa ikpe ọmụma metụtara njehie gbasara ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel doro nsọ, na onyinye ha niile. Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn mgbe niile, ka ha bụrụ ndị Onyenwe anyị ga-anabata.
39 あなたは亜麻糸で市松模様に下服を織り、亜麻布で、ずきんを作り、また、帯を色とりどりに織って作らなければならない。
“Jiri ezi akwa ọcha kpaa uwe ime ahụ. Werekwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi ahụ. Ihe ike nʼukwu ahụ ga-abụ ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma.
40 あなたはまたアロンの子たちのために下服を作り、彼らのために帯を作り、彼らのために、ずきんを作って、彼らに栄えと麗しきをもたせなければならない。
Meekwara ụmụ ndị ikom Erọn uwe ime ahụ, ihe ike nʼukwu na akwa ike nʼisi, inye ha ugwu na nsọpụrụ.
41 そしてあなたはこれをあなたの兄弟アロンおよび彼と共にいるその子たちに着せ、彼らに油を注ぎ、彼らを職に任じ、彼らを聖別し、祭司として、わたしに仕えさせなければならない。
Mgbe i yinyekwasịrị Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a, tee ha mmanụ, doo ha nsọ. Chee ha nʼihu m ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
42 また、彼らのために、その隠し所をおおう亜麻布のしたばきを作り、腰からももに届くようにしなければならない。
“Meekwara ha uwe ụkwụ nke eji akwa ọcha mee, maka ikpuchi anụ ahụ ha. Ọ ga-esite nʼukwu ruo nʼikpere.
43 アロンとその子たちは会見の幕屋にはいる時、あるいは聖所で務をするために祭壇に近づく時に、これを着なければならない。そうすれば、彼らは罪を得て死ぬことはないであろう。これは彼と彼の後の子孫とのための永久の定めでなければならない。
Erọn na ụmụ ya ndị ikom aghaghị iyi ha mgbe niile ha ga-aba nʼime ụlọ nzute, maọbụ mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja ije ozi nʼEbe Nsọ. Ka ha ghara imeta ihe ikpe ọmụma, ma nwụọ. “Nke a ga-abụ iwu na ụkpụrụ ebighị ebi, nke ga-adịrị Erọn na ụmụ ụmụ ya.

< 出エジプト記 28 >