< サムエル記Ⅱ 23 >

1 これはダビデの最後の言葉である。エッサイの子ダビデの託宣、すなわち高く挙げられた人、ヤコブの神に油を注がれた人、イスラエルの良き歌びとの託宣。
Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru: “Okwu pụrụ iche si nʼọnụ Devid, nwa Jesi, ihe si nʼọnụ nwoke ahụ Chineke Onye kachasị ihe niile elu buliri elu. Nwoke ahụ onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ, onye bụ ọka nʼịbụ abụ nʼala Izrel.
2 「主の霊はわたしによって語る、その言葉はわたしの舌の上にある。
“Mmụọ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ m, okwu ya dịkwa m nʼire.
3 イスラエルの神は語られた、イスラエルの岩はわたしに言われた、『人を正しく治める者、神を恐れて、治める者は、
Chineke Izrel kwuru okwu, Oke nkume Izrel sịrị m, ‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume, mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke.
4 朝の光のように、雲のない朝に、輝きでる太陽のように、地に若草を芽ばえさせる雨のように人に臨む』。
Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị. Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’
5 まことに、わが家はそのように、神と共にあるではないか。それは、神が、よろず備わって確かなとこしえの契約をわたしと結ばれたからだ。どうして彼はわたしの救と願いを、皆なしとげられぬことがあろうか。
“Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ. Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya, Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile. Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke. Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile.
6 しかし、よこしまな人は、いばらのようで、手をもって取ることができないゆえ、みな共に捨てられるであろう。
Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu, nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta.
7 これに触れようとする人は鉄や、やりの柄をもって武装する、彼らはことごとく火で焼かれるであろう」。
Onye ọbụla metụrụ ogwu aka, bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe. A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.”
8 ダビデの勇士たちの名は次のとおりである。タクモンびとヨセブ・バッセベテはかの三人のうちの長であったが、彼はいちじに八百人に向かって、やりをふるい、それを殺した。
Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere: Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
9 彼の次はアホアびとドドの子エレアザルであって、三勇士のひとりである。彼は、戦おうとしてそこに集まったペリシテびとに向かって戦いをいどみ、イスラエルの人々が退いた時、ダビデと共にいたが、
Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha. Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ,
10 立ってペリシテびとを撃ち、ついに手が疲れ、手がつるぎに着いて離れないほどになった。その日、主は大いなる勝利を与えられた。民は彼のあとに帰ってきて、ただ殺された者をはぎ取るばかりであった。
ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. Onyenwe anyị nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ.
11 彼の次はハラルびとアゲの子シャンマであった。ある時、ペリシテびとはレヒに集まった。そこに一面にレンズ豆を作った地所があった。民はペリシテびとの前から逃げたが、
Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ.
12 彼はその地所の中に立って、これを防ぎ、ペリシテびとを殺した。そして主は大いなる救を与えられた。
Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
13 三十人の長たちのうちの三人は下って行って刈入れのころに、アドラムのほら穴にいるダビデのもとにきた。時にペリシテびとの一隊はレパイムの谷に陣を取っていた。
Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
14 その時ダビデは要害におり、ペリシテびとの先陣はベツレヘムにあったが、
Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha Filistia dị na Betlehem.
15 ダビデは、せつに望んで、「だれかベツレヘムの門のかたわらにある井戸の水をわたしに飲ませてくれるとよいのだが」と言った。
Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”
16 そこでその三人の勇士たちはペリシテびとの陣を突き通って、ベツレヘムの門のかたわらにある井戸の水を汲み取って、ダビデのもとに携えてきた。しかしダビデはそれを飲もうとはせず、主の前にそれを注いで、
Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.
17 言った、「主よ、わたしは断じて飲むことをいたしません。いのちをかけて行った人々の血を、どうしてわたしは飲むことができましょう」。こうして彼はそれを飲もうとはしなかった。三勇士はこれらのことを行った。
Ọ sịrị, “Ya bụrụ m ihe arụ, Onyenwe anyị, na m ga-eme nke a. Nke a ọ bụghị ọbara ndị ikom a, ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
18 ゼルヤの子ヨアブの兄弟アビシャイは三十人の長であった。彼は三百人に向かって、やりをふるい、それを殺した。そして、彼は三人と共に名を得た。
Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.
19 彼は三十人のうち最も尊ばれた者で、彼らの長となった。しかし、かの三人には及ばなかった。
Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
20 エホヤダの子ベナヤはカブジエル出身の勇士であって、多くのてがらを立てた。彼はモアブのアリエルのふたりの子を撃ち殺した。彼はまた雪の日に下っていって、穴の中でししを撃ち殺した。
Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.
21 彼はまた姿のうるわしいエジプトびとを撃ち殺した。そのエジプトびとは手にやりを持っていたが、ベナヤはつえをとってその所に下っていき、エジプトびとの手からやりをもぎとって、そのやりをもって殺した。
O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya
22 エホヤダの子ベナヤはこれらの事をして三勇士と共に名を得た。
Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ.
23 彼は三十人のうちに有名であったが、かの三人には及ばなかった。ダビデは彼を侍衛の長とした。
A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
24 三十人のうちにあったのは、ヨアブの兄弟アサヘル。ベツレヘム出身のドドの子エルハナン。
Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ: Asahel, nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo, onye Betlehem
25 ハロデ出身のシャンマ。ハロデ出身のエリカ。
Shama, onye Harod, Elika, onye Harod,
26 パルテびとヘレヅ。テコア出身のイッケシの子イラ。
Helez onye Palti, Ira, nwa Ikesh, onye Tekoa,
27 アナトテ出身のアビエゼル。ホシャびとメブンナイ。
Abieza, onye Anatot, Mebunai, onye Husha,
28 アホアびとザルモン。ネトパ出身のマハライ。
Zalmon, onye Ahohi, Maharai, onye Netofa,
29 ネトパ出身のバアナの子ヘレブ。ベニヤミンびとのギベアから出たリバイの子イッタイ。
Heled, nwa Baana, onye Netofa, Itai, nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin,
30 ピラトンのベナヤ。ガアシの谷出身のヒダイ。
Benaya, onye Piraton, Hidaị, nke si nʼakụkụ iyi dị na Gaash,
31 アルバテびとアビアルボン。バホリム出身のアズマウテ。
Abi-Albon, onye Arba, Azmavet, onye Bahurim
32 シャルボン出身のエリヤバ。ヤセンの子たち。ヨナタン。
Eliaba, onye Shaalbon, Ụmụ Jashen, Jonatan
33 ハラルびとシャンマ。ハラルびとシャラルの子アヒアム。
nwa Shama, onye Hara Ahiam, nwa Shara nke Hara,
34 マアカ出身のアハスバイの子エリペレテ。ギロ出身のアヒトペルの子エリアム。
Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka, Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo,
35 カルメル出身のヘヅロ。アルバびとパアライ。
Hezro, onye Kamel, Paraị, onye Aaba,
36 ゾバ出身のナタンの子イガル。ガドびとバニ。
Igal nwa Netan, onye Zoba, nwa Hagri,
37 アンモンびとゼレク。ゼルヤの子ヨアブの武器を執る者、ベエロテ出身のナハライ。
Zelek, onye Amọn, Naharai, onye Beerọt, onye na-ebu ihe agha Joab nwa Zeruaya,
38 イテルびとイラ。イテルびとガレブ。
Ira, onye Itra, Gareb, onye Itra
39 ヘテびとウリヤ。合わせて三十七人である。
na Ụraya, onye Het. Ha niile dị iri ndị ikom atọ na asaa.

< サムエル記Ⅱ 23 >