< サムエル記Ⅱ 21 >
1 ダビデの世に、年また年と三年、ききんがあったので、ダビデが主に尋ねたところ、主は言われた、「サウルとその家とに、血を流した罪がある。それはかつて彼がギベオンびとを殺したためである」。
Ụnwụ dara afọ atọ nʼoge Devid na-achị, afọ kwa afọ. Devid chọrọ ihu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụ maka Sọl na ọbara ụlọ ya kwafuru, nʼihi na o gburu ndị Gibiọn.”
2 そこで王はギベオンびとを召しよせた。ギベオンびとはイスラエルの子孫ではなく、アモリびとの残りであって、イスラエルの人々は彼らと誓いを立てて、その命を助けた。ところがサウルはイスラエルとユダの人々のために熱心であったので、彼らを殺そうとしたのである。
Eze kpọrọ ndị Gibiọn, gwa ha okwu. (Ndị Gibiọn abụghị ndị Izrel, kama ha bụ ndị fọdụrụ nʼime ndị Amọrait, ndị bi nʼala Kenan mgbe ụmụ Izrel batara. Mgbe ahụ ha batara, ndị Izrel ṅụrụ iyi nye ndị Gibiọn na ha agaghị egbu ha, ma Sọl sitere nʼịnụ ọkụ nke obi nʼihi Izrel na Juda chọọ ikpochapụ ha.)
3 それでダビデはギベオンびとに言った、「わたしはあなたがたのために、何をすればよいのですか。どんな償いをすれば、あなたがたは主の嗣業を祝福するのですか」。
Devid jụrụ ndị Gibiọn ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere unu? Gịnị ka m ga-eji kpuchie mmehie a e mere megide unu, ime ka unu gọzie ihe nketa Onyenwe anyị?”
4 ギベオンびとは彼に言った、「これはわれわれと、サウルまたはその家との間の金銀の問題ではありません。またイスラエルのうちのひとりでも、われわれが殺そうというのでもありません」。ダビデは言った、「わたしがあなたがたのために何をすればよいと言うのですか」。
Ndị Gibiọn zara ya sị, “Nsogbu anyị na Sọl na ndị ụlọ ya abụghị ihe a ga-eji ọlaọcha maọbụ ọlaedo mezie. Anyị achọkwaghị ka onye ọbụla nʼIzrel nwụọ nʼihi anyị.” Devid sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
5 かれらは王に言った、「われわれを滅ぼした人、われわれを滅ぼしてイスラエルの領域のどこにもおらせないようにと、たくらんだ人、
Ha zara eze sị, “Kwere ka anyị wezuga nwoke ahụ wetaara anyị mbibi na ịla nʼiyi, onye ahụ mere ka anyị ghara inwe ebe obibi ọbụla nʼala Izrel.
6 その人の子孫七人を引き渡してください。われわれは主の山にあるギベオンで、彼らを主の前に木にかけましょう」。王は言った、「引き渡しましょう」。
Ka akpọnye anyị ndị ikom asaa site nʼụmụ ya, ka anyị kwụgbuo ha nye Onyenwe anyị na Gibea Sọl, onye Onyenwe anyị họpụtara.” Eze zara sị, “Aga m akpọnye unu ha.”
7 しかし王はサウルの子ヨナタンの子であるメピボセテを惜しんだ。彼らの間、すなわちダビデとサウルの子ヨナタンとの間に、主をさして立てた誓いがあったからである。
Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu Onyenwe anyị.
8 王はアヤの娘リヅパがサウルに産んだふたりの子アルモニとメピボセテ、およびサウルの娘メラブがメホラびとバルジライの子アデリエルに産んだ五人の子を取って、
Ma eze kpọọrọ Amoni na Mefiboshet, ụmụ ndị ikom abụọ nke Rizpa, nwa nwanyị Aịa, bụ ndị ọ mụtaara Sọl. Nakwa ụmụ ndị ikom ise nke Merab nwa Sọl mụtara mgbe ọ bụ nwunye Adriel, nwa Bazilai onye Mehola.
9 彼らをギベオンびとの手に引き渡したので、ギベオンびとは彼らを山で主の前に木にかけた。彼ら七人は共に倒れた。彼らは刈入れの初めの日、すなわち大麦刈りの初めに殺された。
O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu Onyenwe anyị. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị.
10 アヤの娘リヅパは荒布をとって、それを自分のために岩の上に敷き、刈入れの初めから、その人々の死体の上に天から雨が降るまで、昼は空の鳥が死体の上にこないようにし、夜は野の獣を近寄らせなかった。
Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha.
11 アヤの娘でサウルのめかけであったリヅパのしたことがダビデに聞えたので、
Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere,
12 ダビデは行ってサウルの骨とその子ヨナタンの骨を、ヤベシギレアデの人々の所から取ってきた。これはペリシテびとがサウルをギルボアで殺した日に、木にかけたベテシャンの広場から、彼らが盗んでいたものである。
ọ gara chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya Jonatan site nʼaka ndị nwe obodo Jebesh Gilead. Ha gara na nzuzo zuru ozu Sọl na Jonatan site nʼama dị na Bet-Shan, ebe ndị Filistia kwụbara ha, oge ha gburu Sọl na Gilboa.
13 ダビデはそこからサウルの骨と、その子ヨナタンの骨を携えて上った。また人々はそのかけられた者どもの骨を集めた。
Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu.
14 こうして彼らはサウルとその子ヨナタンの骨を、ベニヤミンの地のゼラにあるその父キシの墓に葬り、すべて王の命じたようにした。この後、神はその地のために、祈を聞かれた。
Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ.
15 ペリシテびとはまたイスラエルと戦争をした。ダビデはその家来たちと共に下ってペリシテびとと戦ったが、ダビデは疲れていた。
Emesịa, ndị Filistia busokwara Izrel agha ọzọ. Devid na ndị agha ya pụkwara ịlụso ha ọgụ. Nʼoge ha na-alụ ọgụ a, ike gwụrụ Devid nke ukwuu.
16 時にイシビベノブはダビデを殺そうと思った。イシビベノブは巨人の子孫で、そのやりは青銅で重さ三百シケルあり、彼は新しいつるぎを帯びていた。
Mgbe ahụ, Ishibi-Benob, otu onye agbụrụ Rafa, onye ịdị arọ nke bronz dị nʼọnụ ùbe ya ruru kilogram atọ na ọkara, onye jikwa mma agha ọhụrụ, bịaruru Devid nso chọọ igbu ya.
17 しかしゼルヤの子アビシャイはダビデを助けて、そのペリシテびとを撃ち殺した。そこでダビデの従者たちは彼に誓って言った、「あなたはわれわれと共に、重ねて戦争に出てはなりません。さもないと、あなたはイスラエルのともし火を消すでしょう」。
Ma Abishai nwa Zeruaya bịara nyere Devid aka, tigbuo onye Filistia ahụ. Site nʼoge ahụ, ndị ikom Devid ṅụrụ iyi sị ya, “Ị gaghị esokwa anyị gaa ibu agha ọzọ! Ka a ghara imenyụ oriọna Izrel.”
18 この後、再びゴブでペリシテびととの戦いがあった。時にホシャびとシベカイは巨人の子孫のひとりサフを殺した。
Mgbe oge gaturu, ha na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ na Gob. Nʼoge a, Sibekai, onye Husha, gburu Saf, otu nʼime ndị agbụrụ Rafa.
19 ここにまたゴブで、ペリシテびととの戦いがあったが、そこではベツレヘムびとヤレオレギムの子エルハナンは、ガテびとゴリアテを殺した。そのやりの柄は機の巻棒のようであった。
Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ na Gob, Elhanan nwa Jaịa onye Betlehem gburu nwanne Golaịat onye Gat, onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa.
20 またガテで再び戦いがあったが、そこにひとりの背の高い人があり、その手の指と足の指は六本ずつで、その数は合わせて二十四本であった。彼もまた巨人から生れた者であった。
Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa.
21 彼はイスラエルをののしったので、ダビデの兄弟シメアの子ヨナタンが彼を殺した。
Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimei, nwanne nwoke Devid, gburu ya.
22 これらの四人はガテで巨人から生れた者であったが、ダビデの手とその家来たちの手に倒れた。
Mmadụ anọ ndị a bụ ndị agbụrụ Rafa dị na Gat. Devid na ndị agha ya gburu ha niile.