< 歴代誌Ⅰ 17 >

1 さてダビデは自分の家に住むようになったとき、預言者ナタンに言った、「見よ、わたしは香柏の家に住んでいるが、主の契約の箱は天幕のうちにある」。
Mgbe Devid nọsara ahụ nʼụlọeze ya, ọ sịrị Netan onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị nʼokpuru ụlọ ikwu.”
2 ナタンはダビデに言った、「神があなたとともにおられるから、すべてあなたの心にあるところを行いなさい」。
Netan zaghachiri Devid, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi, mee ya, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.”
3 その夜、神の言葉がナタンに臨んで言った、
Ma nʼabalị ahụ, okwu Chineke rutere Netan ntị, na-asị,
4 「行ってわたしのしもべダビデに告げよ、『主はこう言われる、わたしの住む家を建ててはならない。
“Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Gị onwe gị agaghị ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi,
5 わたしはイスラエルを導き上った日から今日まで、家に住まわず、天幕から天幕に、幕屋から幕屋に移ったのである。
nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta Izrel ruo taa. Kama e sitela m nʼotu ọmụma ụlọ ikwu baa na nke ọzọ, sitekwa nʼotu ebe obibi gaa ebe nke ọzọ.
6 わたしがすべてのイスラエルと共に歩んだすべての所で、わたしの民を牧することを命じたイスラエルのさばきづかさのひとりに、ひと言でも、「どうしてあなたがたは、わたしのために香柏の家を建てないのか」と言ったことがあるだろうか』と。
Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ndu ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?”’
7 それゆえ今あなたは、わたしのしもべダビデにこう言いなさい、『万軍の主はこう仰せられる、「わたしはあなたを牧場から、羊に従っている所から取って、わたしの民イスラエルの君とし、
“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị, mee gị onye na-achị ndị m Izrel.
8 あなたがどこへ行くにもあなたと共におり、あなたのすべての敵をあなたの前から断ち去った。わたしはまた地の上の大いなる者の名のような名をあなたに得させよう。
Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa.
9 そしてわたしはわが民イスラエルのために一つの所を定めて、彼らを植えつけ、彼らを自分の所に住ませ、重ねて動くことのないようにしよう。
Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha, ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,
10 また前のように、すなわちわたしがわが民イスラエルの上にさばきづかさを立てた時からこのかたのように、悪い人が重ねてこれを荒すことはないであろう。わたしはまたあなたのもろもろの敵を征服する。かつわたしは主があなたのために家を建てられることを告げる。
dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m eme ka ndị iro gị niile nọrọ nʼokpuru gị. “‘Ana m ekwupụtara gị na Onyenwe anyị ga-ewuru gị ụlọ.
11 あなたの日が満ち、あなたの先祖たちの所へ行かねばならぬとき、わたしはあなたの子、すなわちあなたの子らのひとりを、あなたのあとに立てて、その王国を堅くする。
Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe ị gakwuru ndị nna nna gị ha, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, ọ ga-abụ otu nʼime ụmụ ndị ị mụrụ. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.
12 彼はわたしのために家を建てるであろう。わたしは長く彼の位を堅くする。
Ọ bụ ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ, aga m emekwa ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
13 わたしは彼の父となり、彼はわたしの子となる。わたしは、わたしのいつくしみを、あなたのさきにあった者から取り去ったように、彼からは取り去らない。
Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna, ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Agaghị m ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m mere onye bu gị ụzọ chịa.
14 かえって、わたしは彼を長くわたしの家に、わたしの王国にすえおく。彼の位はとこしえに堅く立つであろう』」。
Aga m eme ka ọ chịa ụlọ m na nʼalaeze m ruo mgbe ebighị ebi. A ga-emekwa ka ocheeze ya bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’”
15 ナタンはすべてこれらの言葉のように、またすべてこの幻のようにダビデに語った。
Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị.
16 そこで、ダビデ王は、はいって主の前に座して言った、「主なる神よ、わたしがだれ、わたしの家がなんであるので、あなたはこれまでわたしを導かれたのですか。
Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onyenwe anyị Chineke, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a?
17 神よ、これはあなたの目には小さな事です。主なる神よ、あなたはしもべの家について、はるか後の事を語って、きたるべき代々のことを示されました。
O Chineke m, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị, ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị. Ma gị onwe gị Onyenwe anyị Chineke na-ele m anya dịka a ga-asị na m bụ onye ọnọdụ ya dị elu karịchasịa nke ụmụ mmadụ niile.
18 しもべの名誉については、ダビデはこの上あなたに何を申しあげることができましょう。あなたはしもべを知っておられるからです。
“Gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị, nʼihi nsọpụrụ i nyere ohu gị? Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma,
19 主よ、あなたはしもべのために、またあなたの心にしたがって、このもろもろの大いなる事をなし、すべての大いなる事を知らされました。
O Onyenwe anyị, nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ọ mata nkwa ndị a niile dị ukwuu.
20 主よ、われわれがすべて耳に聞いた所によれば、あなたのようなものはなく、またあなたのほかに神はありません。
“Onyenwe anyị, ọ dịghị onye dịka gị, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.
21 また地上のどの国民が、あなたの民イスラエルのようでありましょうか。これは神が行って、自分のためにあがなって民とし、エジプトからあなたがあがない出されたあなたの民の前から国々の民を追い払い、大いなる恐るべき事を行って、名を得られたものではありませんか。
Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa ndị Chineke ha gara ịgbapụtara onwe ya ka ọ bụrụ otu ndị, na iji mere onwe gị aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt?
22 あなたはあなたの民イスラエルを長くあなたの民とされました。主よ、あなたは彼らの神となられたのです。
I mere ka ndị gị Izrel bụrụ ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha.
23 それゆえ主よ、あなたがしもべと、しもべの家について語られた言葉を長く堅くして、あなたの言われたとおりにしてください。
“Ma ugbu a, Onyenwe anyị, mee ka nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya bụrụ nke ga-eguzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị,
24 そうすればあなたの名はとこしえに堅くされ、あがめられて、『イスラエルの神、万軍の主はイスラエルの神である』と言われ、またあなたのしもべダビデの家はあなたの前に堅く立つことができるでしょう。
ka o nwee ike guzosie ike. Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke na-achị Izrel, bụ Chineke Izrel.’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị Devid guzosie ike nʼihu gị.
25 わが神よ、あなたは彼のために家を建てると、しもべに示されました。それゆえ、しもべはあなたの前に祈る勇気を得ました。
“Gị onwe gị, Chineke m, e kpugheerela ohu gị na ị ga-ewuru ya ụlọ. Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere.
26 主よ、あなたは神にいまし、この良き事をしもべに約束されました。
Gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Chineke. I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a.
27 それゆえどうぞいま、しもべの家を祝福し、あなたの前に長く続かせてくださるように。主よ、あなたの祝福されるものは長く祝福を受けるからです」。
Ugbu a, ọ masịrị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ime ka ọ dịrị na-aga nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi na gị Onyenwe anyị, agọziela ya. Ọ ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”

< 歴代誌Ⅰ 17 >