< 詩篇 85 >

1 ヱホバよなんぢは御國にめぐみをそそぎたまへり なんぢヤコブの俘囚をかへしたまひき
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora. O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma; i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.
2 なんぢおのが民の不義をゆるしそのもろもろの罪をおほひたまひき (セラ)
I gbagharala ajọ omume ndị gị, kpuchikwaa mmehie ha niile. (Sela)
3 汝すべての怒をすてその烈しきいきどほりを遠けたまへり
Ị kwụsịla iwe oke iwe gị, I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.
4 われらのすくひの神よかへりきたり我儕にむかひて忿怒をやめたまへ
Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.
5 なんぢ永遠にわれらをいかり萬世にみいかりをひきのべたまふや
Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe: Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?
6 汝によりてなんぢの民の喜悦をえんが爲に我儕を活したまはざるか
Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?
7 ヱホバよなんぢの憐憫をわれらにしめし汝のすくひを我儕にあたへたまへ
O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide, nyekwa anyị nzọpụta gị.
8 わが神ヱホバのいたりたまふ事をきかん ヱホバはその民その聖徒に平和をかたりたまへばなり さればかれらは愚かなる行爲にふたたび歸るなかれ
Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.
9 實にそのすくひは神をおそるる者にちかし かくて榮光はわれらの國にとどまらん
Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.
10 あはれみと眞實とともにあひ義と平和とたがひに接吻せり
Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ.
11 まことは地よりはえ義は天よりみおろせり
Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.
12 ヱホバ善物をあたへたまへばわれらの國は物產をいださん
Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.
13 義はヱホバのまへにゆきヱホバのあゆみたまふ跡をわれに踏しめん
Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.

< 詩篇 85 >