< ヨシュア記 15 >

1 ユダの子孫の支派がその宗族にしたがひて籤にて獲たる地はエドムの境界に達し南の方ヂンの荒野にわたり南の極端に及ぶ
Ala ndị a ka e nyere ndị Juda dịka ikwu dị nʼebo ahụ si dị. Ikwu ọbụla ketara ala nke ha site nʼife nza. Ala Juda gbatịrị nnọọ ruo nʼoke ala Edọm, gbatịakwa ruo nʼọzara Zin, kwụsị nʼọnụ ọnụ ndịda ọzara a.
2 その南の境界は鹽海の極端なる南に向へる入海より起り
Nʼakụkụ ndịda, oke ala ha malitere nʼọnụ ọnụ ndịda osimiri Nnu.
3 アクラビムの坂の南にわたりてヂンに進みカデシバルネアの南より上りてヘヅロンに沿て進みアダルに上りゆきてカルカに環り
Site nʼebe akụkụ ndịda nrigo Akrabim, gafee ruo nʼọzara Zin, ma rigoo nʼakụkụ nke ndịda Kadesh Banea, gafee Hezrọn rigoruo na Aada, gba gburugburu gaa Kaka;
4 アズモンに進みてエジプトの河にまで達しその境界海にいたりて盡く汝らの南の境界は是の如くなるべし
site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda.
5 その東の境界は鹽海にしてヨルダンの河口に達す北の方の境界はヨルダンの河口なる入海より起り
Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan,
6 上りてベテホグラにいたりベテアラバの北をすぎ上りてルベン人ボハンの石に達し
gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba, rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben.
7 またアコルの谷よりデビルに上りて北におもむき河の南にあるアドミムの坂に對するギルガルに向ひすすみてエンシメシの水に達しエンロゲルにいたりて盡く
Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel.
8 又その境界はベニヒンノムの谷に沿てヱブス人の地すなはちヱルサレムの南の脇に上りゆきヒンノムの谷の西面に横はる山の嶺に上る是はレバイムの谷の北の極處にあり
Oke ala ahụ gbagoro Ndagwurugwu nke Ben Hinom, rukwaa nʼakụkụ ndịda Jebus nʼebe e wuru obodo Jerusalem. Oke ala ahụ sitekwara ebe ahụ gbagoo ruo nʼelu dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Hinom, na nsọtụ ugwu nke Ndagwurugwu Refaim.
9 而してその境界この山の嶺より延てネフトアの水の泉源にいたりエフロン山の邑々にわたりその境昇延てバアラにいたる是すなはちキリアテヤリムなり
Site nʼelu ugwu ebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị ruo na mmiri ime ala Neftoa, pụta site nʼebe ahụ ruo obodo niile dị nso ugwu Efrọn. Site nʼEfrọn, oke ala ahụ gbadara ruo Baala (nke aha ya ọzọ bụ Kiriat Jearim).
10 その境界バアラより西の方セイル山に環りヤリム山(すなはちケサロン)の北の脇をへてベテシメシに下りテムナに沿て進み
Oke ala ahụ mere dịka ọ ga-agba Baala gburugburu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site nʼebe ahụ pụta nʼugwu Sia, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼakụkụ ugwu Jearim (ya bụ Kesalon), gbatịa ruo na ndịda Bet-Shemesh, gafee ruo nʼọdịda anyanwụ oke ala Timna.
11 エクロンの北の脇にわたり延てシツケロンに至りバアラ山に進みヤブネルに達し海にいたりて盡く
O sikwara ebe ahụ ruo ndịda ugwu Ekrọn, tụgharịa ruo Shikerọn, gafee ya, ruo nʼugwu Baala, sitekwa nʼebe ahụ ruo Jabneel, oke ala ahụ kwụsịrị nʼosimiri.
12 また西の境界は大海にいたりその濱をもて限とすユダの子孫がその宗族にしたがひて獲たる地の四方の境界は是のごとし
Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Ndị a bụ oke ala gbara ndị Juda gburugburu dịka ikwu ha niile si dị.
13 ヨシユアそのヱホバに命ぜられしごとくヱフンネの子カレブにユダの子孫の中にてキリアテアルバすなはちヘブロンを與へてその分となさしむ
Dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị, Joshua nyere Kaleb nwa Jefune oke nʼetiti ndị Juda. O kenyere ya Kiriat Aaba, ya bụ, Hebrọn. Aaba bụ nna nna Anak.
14 アルバはアナクの父なりカレブかしこよりアナクの子三人を逐はらへり是すなはちアナクより出たるセシヤイ、アヒマンおよびタルマイなり
Kaleb sitere nʼobodo Hebrọn chụpụ ndị ikom atọ, bụ Sheshai, na Ahiman, na Talmai, ụmụ Anak nʼala ha.
15 而して彼かしこよりデビルの民の所に攻上れりデビルの名は元はキリアテセペルといふ
O si nʼebe ahụ bilie ịlụso ndị bi na Debịa ọgụ. Nke a na-akpọ Kiriat Sefa nʼoge mbụ.
16 カレブ言けらくキリアテセペルを撃てこれを取る者には我女子アクサを妻に與へんと
Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa, bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”
17 ケナズの子にしてカレブの弟なるオテニエルといふ者これを取ければカレブその女子アタサを之が妻に與へたり
Ya mere, Otniel, nwa Kenaz, nwa nwanne Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.
18 アクサ適く時田野をその父に求むべきことをオテニエルに勸め遂にみづから驢馬より下れりカレブこれに何を望むやと言ければ
Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”
19 答へて言ふ我に粧奩を與へよ汝われを南の地に遣なれば水泉をも我に與へよと乃ち上の泉と下の泉とをこれに與ふ
Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.
20 ユダの子孫の支派がその宗族にしたがひて獲たる產業は是のごとし
Nke a bụ ihe nketa ebo Juda dịka ikwu ha niile si dị.
21 ユダの子孫の支派が南においてエドムの境界の方に有るその遠き邑々は左のごとしカブジエル、エデル、ヤグル
Obodo niile nke ndị ebo Juda dị na Negev, nʼakụkụ ndịda nʼoke ala Edọm bụ ndị a: Kabzeel, Eda, Jaguo,
22 キナ、デモナ、アダダ、
Kina, Dimona, Adada,
23 ケデシ、ハゾル、イテナン、
Kedesh, Hazọ, Itnan,
24 ジフ、テレム、ベアロテ
Zif, Telem, Bealot,
25 ハゾルハダツタ、ケリオテヘヅロンすなはちハゾル
Hazọ Hadata, Keriọt Hezrọn (ya bụ Hazoa),
26 アマム、シマ、モラダ
Amam, Shema, na Molada,
27 ハザルガダ、ヘシモン、ベテパレテ
Haza Gada, Heshmọn, Bet-Pelet,
28 ハザルシユアル、ベエルシバ、ビジヨテヤ
Haza Shual, Bịasheba, Biziotịa,
29 バアラ、イヰム、エゼム
Baala, Iyim, Ezem,
30 エルトラデ、ケシル、ホルマ
Eltolad, Kesil, Homa,
31 チクラグ、マデマンナ、サンサンナ
Ziklag, Madmanna, Sansanna,
32 レバオテ、シルヒム、アイン、リンモン、その邑あはせて二十九ならびに之に屬る村々なり
Lebaot, Shilhim, Ain na Rimọn. Ọnụọgụgụ obodo ndị a dị iri abụọ na itoolu. Obodo nta ndị ọzọ gbara ha niile gburugburu.
33 平野にてはエシタオル、ゾラ、アシナ
Obodo niile ndị a dị na ndịda ugwu ka e nyekwara ebo Juda. Obodo ndị a bụ, Eshtaol, Zora, Ashna,
34 ザノア、エンガンニム、タップア、エナム
Zanoa, En-Ganim, Tapụọa, Enam,
35 ヤルムテ、アドラム、シヨコ、アゼカ
Jamut, Adulam, Soko, Azeka,
36 シヤアライム、アデタイム、ゲデラ、ゲデロタイム合せて十四邑ならびに之に屬る村々なり
Shaaraim, Aditaịm na Gedera (maọbụ Gederotaịm). Ha niile dị obodo iri na anọ. Obodo nta ndị ọzọ gbakwara ha gburugburu.
37 ゼナン、ハダシヤ、ミグダルガデ
Ebo Juda ketara Zenan, Hadasha, Migdal Gad,
38 デラン、ミヅバ、ヨクテル
Dilean, Mizpa, Jekteel,
39 ラキシ、ボヅカテ、エグロン
Lakish, Bozkat, Eglọn,
40 カボン、ラマム、キリテシ
Kabọn, Laamam, Kitlish,
41 ゲデロテ、ベテダゴン、ナアマ、マツケダ合せて十六邑ならびに之に屬る村々なり
Gederọt, Bet-Dagọn, Naama na Makeda. Obodo ndị a dị iri na isii, tinyekwara obodo nta ha. Ndị Juda ketakwara:
42 またリブナ、エテル、アシヤン
Libna, Eta, Ashan
43 イフタ、アシナ、ネジブ
Ifta, Ashna, Nezib,
44 ケイラ、アクジブ、マレシア合せて九邑ならびに之に屬ける村々なり
Keila, Akzib na Maresha. Ha niile dị obodo itoolu, tinyekwara obodo nta ha niile.
45 エクロンならびにその郷里および村々なり
Ha ketakwara Ekrọn, na obodo nta ya niile.
46 エクロンより海まで凡てアシドドの邊にある處々ならびに之につける村々なり
Ọ bụ ha nwekwa obodo niile dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Ekrọn, ndị dị nso nso Ashdọd, na obodo nta niile dị ha nso.
47 アシドドならびにその郷里および村々 ガザならびにその郷里および村々 エジプトの河および大海の濱にいたるまでの處々なり
Ma Ashdọd nʼonwe ya, na ụmụ obodo nta ya niile, na Gaza na obodo nta ya niile, ruo nʼiyi Ijipt, na ruo nʼoke osimiri Mediterenịa.
48 山地にてはシヤミル、ヤツテル、シヨコ
Ha nwetakwara ala ndị dị nʼugwu ugwu bụ, Shamia, Jatịa, Sokoh,
49 ダンナ、キリアテサンナすなはちデビル
Dana, Kiriat-Sana (ya bụ Debịa),
50 アナブ、エシテモ、アニム
Anab, Eshtemo, Anim,
51 ゴセン、ホロン、ギロ、合せて十一邑ならびに之に屬る村々なり
Goshen, Họlọn na Gailo, ha niile dị obodo iri na otu tinyere obodo nta ha niile.
52 アラブ、ドマ、エシヤン
Obodo ndị ọzọ bụ Arab, Duma, Eshan,
53 ヤニム、ベテタツプア、アペカ
Janim, Bet-Tapụọa, Afeka,
54 ホムタ、キリアテアルバすなはちヘブロン、デオルあはせて九邑ならびに之につける村々なり
Humta, Kiriat Aba nke bụ Hebrọn na Zior, obodo itoolu tinyere obodo nta ha niile.
55 マオン、カルメル、ジフ、ユダ
Maon, Kamel, Zif, Juta,
56 ヱズレル、ヨグテアム、ザノア
Jezril, na Jokdeam, Zanoa,
57 カイン、ギベア、テムナあはぜて十邑ならびに之に屬る村々なり
Kain, Gibea na Timna, obodo iri tinyere obodo nta ha niile.
58 ハルホル、ベテズル、ゲドル
Halhaul, Bet Zoa, Gedoa,
59 マアラテ、ベテアノテ、エルテコンあはせて六邑ならびに之に屬る村々なり
Maarat, Bet-Anot na Eltekọn, obodo isii tinyere obodo nta ha niile.
60 キリアテバアルすなはちキリアテヤリムおよびラバあはせて二邑ならびに之につける村々なり
Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim na Raba, obodo abụọ tinyere obodo nta ha niile.
61 荒野にてはベテアラバ、ミデン、セカカ
Obodo ha ndị dị nʼọzara bụ ndị a: Bet-Araba, Midin, Sekaka,
62 ニブシヤン鹽邑エングデあはせて六邑ならびに之につける村々なり
Nibshan, Obodo Nnu na En-Gedi, obodo isii tinyere obodo nta ha niile.
63 ヱルサレムの民ヱブス人はユダの子孫これを逐はらふことを得ざりき是をもてヱブス人は今日までユダの子孫とともにエルサレムに住ぬ
Ma ebo Juda enweghị ike ịchụpụ ndị Jebus bi nʼime Jerusalem; ruo taa ndị Jebus bi na Jerusalem, nʼetiti ụmụ Juda.

< ヨシュア記 15 >