< ホセア書 11 >

1 イスラエルの幼かりしとき我これを愛しぬ我わが子をエジプトより呼いだしたり
“Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya, ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.
2 かれらは呼るるに隨ひていよいよその呼者に遠ざかり且もろもろのバアルに犠牲をささげ雕たる偶像に香を焚り
Ma dịka m na-akpọ ha, otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ. Ha chụrụ Baal aja, surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche.
3 われエフライムに歩むことををしへ彼等をわが腕にのせて抱けり然どかれらは我にいやされたるを知ず
Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije, ejidere m ha nʼaka m abụọ, ma ha amaghị na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya.
4 われ人にもちゐる索すなはち愛のつなをもて彼等をひけり我がかれらを待ふは軛をその腮より擧のくるもののごとくにして彼等に食物をあたへたり
Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere, na ịhụnanya duo ya. Adịrị m ha dịka onye nʼebuli ibu arọ site nʼolu ha, ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ.
5 かれらはエジプトの地にかへらじ然どかれらがヱホバに歸らざるによりてアッスリヤ人その王とならん
“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt, Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha, nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m?
6 劍かれらの諸邑にまはりゆきてその關門をこぼち彼らをその謀計の故によりて滅さん
Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile, ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa, ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile.
7 わが民はともすれば我にはなれんとする心あり人これを招きて上に在るものに屬しめんとすれども身をおこすもの一人だになし
Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m. Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu, ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla.
8 エフライムよ我いかで汝をすてんやイスラエルよ我いかで汝をわたさんや我いかで汝をアデマのごとくせんや爭でなんぢをゼボイムのごとく爲んやわが心わが衷にかはりて我の愛憐ことごとく燃おこれり
“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem? M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel? M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma? M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim? Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m; ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka.
9 我わが烈しき震怒をほどこすことをせじ我かさねてエフライムを滅すことをせじ我は人にあらず神なればなり我は汝のうちにいます聖者なりいかりをもて臨まじ
Agaghị m emezu iwe ọkụ m maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ. Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ. Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu. Agaghị m emegidekwa obodo ha.
10 かれらは獅子の吼るごとくに聲を出したまふヱホバに隨ひて歩まんヱホバ聲を出したまへば子等は西より急ぎ來らん
Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị. Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm. Mgbe ọ gbọrọ ụja, ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya.
11 かれらエジプトより鳥のごとくアッスリヤより鴿のごとくに急ぎ來らん我かれらをその家々に住はしむべし是ヱホバの聖言なり
Dịka igwe nnụnụ ka ha ga-ama jijiji bịa site nʼIjipt, dịka nduru ka ha ga-efelata site nʼAsịrịa. Aga m eme ka ha biri nʼụlọ ha ọzọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
12 エフライムは謊言をもてイスラエルの家は詐僞をもて我を圍めりユダは神と信ある聖者とに屬きみつかずみ漂蕩をれり
Ifrem e jirila okwu ụgha gbaa m gburugburu, ezinaụlọ Izrel e jirila aghụghọ na-emeso m omume, ma Juda nọsịrị ike nʼekweghị nchịkọta nʼebe Chineke nọ, ọbụladị megide Onye Nsọ ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi.

< ホセア書 11 >