< エペソ人への手紙 6 >
1 子たる者よ、なんぢら主にありて兩親に順へ、これ正しき事なり。
Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị.
2 『なんぢの父 母を敬へ(これ約束を加へたる誡命の首なり)
“Sọpụrụ nne gị na nna gị,” nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya.
3 さらばなんぢ幸福を得、また地の上に壽 長からん』
“Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa.”
4 父たる者よ、汝らの子供を怒らすな、ただ主の薫陶と訓戒とをもて育てよ。
Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
5 僕たる者よ、キリストに從ふごとく畏れをののき、眞心をもて肉につける主人に從へ。
Ndị bụ ohu ruberenụ ndị nwee unu isi. Jirinụ nsọpụrụ na egwu na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ.
6 人を喜ばする者の如く、ただ目の前の事のみを勤めず、キリストの僕のごとく心より神の御旨をおこなひ、
Ruberenụ ha isi, ọ bụghị naanị ka unu nata ihuọma ha mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama dị ka ndị ohu Kraịst, ndị na-eme uche Chineke site nʼobi ha.
7 人に事ふる如くせず、主に事ふるごとく快くつかへよ。
Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị mmadụ.
8 そは奴隷にもあれ、自主にもあれ、各自おこなふ善き業によりて主より其の報を受くることを汝ら知ればなり。
Nʼihi na unu maara na Onyenwe anyị ga-akwụghachi onye ọbụla maka ihe ọma ọbụla ha mere, ma ha bụ ohu maọbụ ndị nweere onwe ha.
9 主人たる者よ、汝らも僕に對し斯く行ひて威嚇を止めよ、そは彼らと汝らとの主は天に在して、偏り視たまふことなきを汝ら知ればなり。
Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nʼụzọ dị otu a. Abarala ha mba, nʼihi na ị matara na unu nwere naanị otu Nna ukwu nọ nʼeluigwe. Ile mmadụ anya nʼihu adịghịkwa nʼebe ọ nọ.
10 終に言はん、汝ら主にありて其の大能の勢威に頼りて強かれ。
Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu.
11 惡魔の術に向ひて立ち得んために、神の武具をもて鎧ふべし。
Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu.
12 我らは血肉と戰ふにあらず、政治・權威、この世の暗黒を掌どるもの、天の處にある惡の靈と戰ふなり。 (aiōn )
Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe. (aiōn )
13 この故に神の武具を執れ、汝ら惡しき日に遭ひて仇に立ちむかひ、凡ての事を成就して立ち得んためなり。
Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ.
14 汝ら立つに誠を帶として腰に結び、正義を胸當として胸に當て、
Meenụ ka eziokwu dịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike, ezi omume bụrụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu.
Werenụ njikere nke ikwusa oziọma nke udo yikwasị dị ka akpụkpọ nʼụkwụ unu.
16 この他なほ信仰の盾を執れ、之をもて惡しき者の凡ての火矢を消すことを得ん。
Mgbe niile, unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ àkụ niile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nʼebe unu nọ.
17 また救の冑および御靈の劍、すなはち神の言を執れ。
Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.
18 常にさまざまの祈と願とをなし、御靈によりて祈り、また目を覺して凡ての聖徒のためにも願ひて倦まざれ。
Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile.
19 又わが口を開くとき言を賜はり、憚らずして福音の奧義を示し、
Na-echetakwanụ m nʼekpere, ka e nye m ike nke mkwuwa okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma na-atụghị egwu ọbụla,
20 語るべき所を憚らず語り得るように、我がためにも祈れ、我はこの福音のために使者となりて鎖に繋がれたり。
nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Kperenụ m ekpere ka m kwupụta ya nʼatụghị egwu ọbụla dị ka m kwesiri ikwu.
21 愛する兄弟、主に在りて忠實なる役者テキコ、我が情況わが爲す所のことを、具に汝らに知らせん。
Ugbu a, iji mee ka unu mara otu m dị na ihe m na-eme, Taịkikọs, nwanna m hụrụ nʼanya na nwaodibo kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị ga-akọrọ unu ihe niile.
22 われ彼を遣すは、我が事を汝らに知らせて、汝らの心を慰めしめん爲なり。
Ana m ezitere ya unu nʼihi nke a, ka o mee ka unu mata ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa unu ume.
23 願はくは父なる神および主イエス・キリストより賜ふ平安と、信仰に伴へる愛と、兄弟たちに在らんことを。
Ka udo na ịhụnanya, tinyere okwukwe nke sitere na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịịrị unu ụmụnna.
24 願はくは朽ちぬ愛をもて我らの主イエス・キリストを愛する凡ての者に御惠あらんことを。
Ka amara dịnyere ndị niile ji ịhụnanya na-adịghị anwụ anwụ hụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼanya.