< サムエル記Ⅰ 20 >

1 ダビデ、ラマのナヨテより逃きたりてヨナタンにいひけるは我何をなし何のあしき事あり汝の父のまへに何の罪を得てか彼わが命を求むる
Devid sitere na Naịọt nʼime Rema gbapụ ọsọ, chọta Jonatan, sị ya, “Ọ bụ gịnị ka m mere? Gịnị bụkwa ihe ọjọọ m mere? Olee ụzọ m si mejọọ nna gị, mere o ji na-achọsi ike ka ọ napụ m ndụ m?”
2 ヨナタンかれにいひけるは汝決て殺さるることあらじ視よわが父は事の大なるも小なるも我につげずしてなすことなしわが父なんぞこの事を我にかくさんやこの事しからず
Jonatan sịrị ya, “Nke a abụghị eziokwu. Ị gaghị anwụ! Ihe dị otu a adịghị nna m nʼobi, nʼihi na ọ na-agwa m ihe ọbụla ọ na-ezube ime, ọ bụladị ihe ukwu maọbụ ihe ntakịrị. Amakwaara m na ọ gaghị ezonarị m ihe dị otu a. Mba, ọ bụghị eziokwu.”
3 ダビデまた誓ひていひけるは汝の父必ずわが汝のまへに恩惠をうるを知る是をもてかれ思へらく恐らくはヨナタン悲むべければこの事をかれにしらしむべからずとしかれどもヱホバはいくまたなんぢの霊魂はいくわれは死をさること只一歩のみ
Devid ṅụrụ iyi sị, “Nna gị maara nke ọma na m anatala amara nʼebe ị nọ, nʼihi ya, o kwuola nʼime onwe ya sị, ‘Agaghị m agwa Jonatan, ka ọ ghara iwute ya.’ Ma eji m Onyenwe anyị na mkpụrụobi gị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụ naanị otu nzọ ụkwụ dị ugbu a nʼetiti mụ na ọnwụ.”
4 ヨナタン、ダビデにいひけるはなんぢの心なにをねがふか我爾のために之をなさんと
Jonatan sịrị Devid, “Ihe ọbụla ị chọrọ ka m mee, aga m emere gị ya.”
5 ダビデ、ヨナタンにいひけるは明日は月朔なれば我王とともに食につかざるべからず然ども我をゆるして去らしめ三日の晩まで野に隱るることをえさしめよ
Devid sịrị ya, “Lee echi ga-abụ mmemme ọnwa ọhụrụ, e kwesiri m iso eze rie nri. Ma hapụ m ka m ga zoo onwe m nʼọhịa tutu ruo uhuruchi nke nwanne echi.
6 若汝の父まことに我をもとめなば其時言へダビデ切に其邑ベテレヘムにはせゆかんことを我に請り其は彼處に全家の歳祭あればなりと
Ọ bụrụ na nna gị ajụọ ase m, sị ya, ‘Devid rịọsiri m arịrịọ ike ka m hapụ ya ka ọ gbaga Betlehem, bụ obodo ya, nʼihi a na-achụ aja nke dịrị agbụrụ ya kwa afọ.’
7 彼もし善しといはば僕やすからんされど彼もし甚しく怒らば彼の害をくはへんと決しを知れ
Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ọ dị mma,’ mgbe ahụ, udo ga-adịrị ohu gị. Ma ọ bụrụ na o wee iwe nke ukwuu, mara nʼezie na o zubere ime m ihe ọjọọ.
8 汝ヱホバのまへに僕と契約をむすびたれば願くは僕に恩をほどこせ然ど若我に惡き事あらば汝自ら我をころせ何ぞ我を汝の父に引ゆくべけんや
Ma gị onwe gị, meere ohu gị ebere, nʼihi na i meela ka o sooro gị baa nʼọgbụgba ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na ikpe mara m, gị onwe gị gbuo m. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji nyefee m nʼaka nna gị?”
9 ヨナタンいひけるは斯る事かならず汝にあらざれ我わが父の害を汝にくはへんと決るをしらば必ず之を汝につげん
Jonatan sịrị, “Agaghị m eme ya, lee, a sịkwa na m maara na nna m na-achọ igbu gị, ọ bụ na m agaghị agwa gị?”
10 ダビデ、ヨナタンにいひけるは若し汝の父荒々しく汝にこたふる時は誰か其事を我に告ぐべきや
Devid jụrụ ya, “Onye ga-agwa m ma ọ bụrụ na nna gị aza gị okwu ike ike?”
11 ヨナタン、ダビデにいひけるは來れ我ら野にいでゆかんと倶に野にいでゆけり
Jonatan sịrị ya, “Bịa ka anyị pụọ gaa nʼọhịa.” Ya mere, ha abụọ pụrụ jee nʼọhịa.
12 しかしてヨナタン、ダビデにいひけるはイスラエルの神ヱホバよ明日か明後日の今ごろ我わが父を窺ひて事のダビデのために善きを見ながら人を汝に遣はして告しらさずばヱホバ、ヨナタンに斯なしまた重て斯くなしたまへ
Jonatan gwara Devid sị, “Eji m aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwe nkwa na-asị gị, nʼoge ugbu a echi, maọbụ nwanne echi, aga m akpanyere nna m ụka banyere gị, meekwa ka ị mata ihe ọ na-eche banyere gị. Ọ bụrụ na obi dị ya mma nʼebe ị nọ, aga m eme ka ị mata.
13 されど若しわが父汝に害をくはへんと欲せば我これを告げしらせて汝をにがし汝を安らかにさらしめん願くはヱホバわが父とともに坐せしごとく汝とともにいませ
Ma ọ bụrụ na nna m na-achọ imerụ gị ahụ, ka Onyenwe anyị mesoo Jonatan mmeso, otu ọbụla o si dị njọ, ma ọ bụrụ na m abịaghị gwa gị, zilaga gị ka ị laa nʼudo. Ka Onyenwe anyị nọnyere gị dịka o si nọnyere nna m.
14 汝只わが生るあひだヱホバの恩を我にしめして死ざらしむるのみならず
Chetakwa, i ghaghị igosi m ịhụnanya na obi ebere Onyenwe anyị, ma ọ bụrụ na m anwụọ.
15 ヱホバがダビデの敵を悉く地の表より絶ちさりたまふ時にもまた汝わが家を永く汝の恩にはなれしむるなかれ
E wezugakwala ịhụnanya gị na obi ebere gị site nʼebe ezinaụlọ m dị, ọ bụladị mgbe Onyenwe anyị bipụchara ndị iro Devid niile site nʼelu ụwa.”
16 かくヨナタン、ダビデの家と契約をむすぶヱホバ之に關てダビデの敵を討したまへり
Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị kpee ndị iro Devid niile ikpe.”
17 しかしてヨナタンふたたびダビデに誓はしむかれを愛すればなり即ちおのれの生命を愛するごとく彼を愛せり
Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya.
18 またヨナタン、ダビデにいひけるは明日は月朔なるが汝の座空かるべければ汝求めらるべし
Mgbe ahụ, Jonatan sịrị Devid, “Echi bụ mmemme ọnwa ọhụrụ. A ga-ele anya gị, nʼihi na ọnọdụ gị ga-atọgbọrọ nʼefu.
19 汝三日とどまりて速かに下り嘗てかの事の日に隱れたるところに至りてエゼルの石の傍に居るべし
Nwanne echi ya, nʼoge uhuruchi, gaa nʼebe ahụ i zoro onwe gị mgbe nsogbu a malitere, chere nʼebe ahụ, nʼakụkụ nkume Ezel.
20 我的を射るごとくして其石の側に三本の矢をはなたん
Aga m abịa gbaa àkụ atọ nʼakụkụ ya dịka a ga-asị na o nwere ihe m chọrọ iji ụta m gbata.
21 しかしてゆきて矢をたづねよといひて僮子をつかはすべし我もし故に僮子に視よ矢は汝の此旁にあり其を取と曰ばなんぢきたるべしヱホバは生く汝安くして何もなかるべければなり
Emesịa, aga m ezipu otu nwantakịrị sị ya, ‘Gaa chọta àkụ ndị ahụ.’ Ọ bụrụ na ị nụ ka m na-agwa ya okwu sị, ‘Lee àkụ ndị a dị nʼakụkụ azụ gị, chita ha ebe a,’ mgbe ahụ, pụta nʼihi, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, udo dịrị gị, egwu ọbụla adịghị.
22 されど若し我少年に視よ矢は汝の彼旁にありといはば汝さるべしヱホバ汝をさらしめたまふなり
Ma ọ bụrụ na m agwa nwantakịrị ahụ okwu sị ya, ‘Lee, àkụ ahụ dị nʼihu gị,’ ọ pụtara na ị ghaghị isi nʼebe a pụọ, nʼihi na Onyenwe anyị ezipụla gị.
23 汝と我とかたれることについては願はくはヱホバ恒に汝と我との間にいませと
Ma ihe banyere okwu ahụ anyị kwuru, cheta na Onyenwe anyị bụ onye akaebe, nʼetiti mụ na gị ruo mgbe ebighị ebi.”
24 ダビデ即ち野にかくれぬ偖月朔になりければ王坐して食に就く
Ya mere, Devid gara zoo onwe ya nʼọhịa. Mgbe oge mmemme ọnwa ọhụrụ ruru, eze Sọl nọdụrụ ala iri nri.
25 即ち王は常のごとく壁によりて座を占むヨナタン立あがりアブネル、サウルの側に坐すダビデの座はなむし
Ọ nọdụrụ ọdụ nʼakụkụ aja ụlọ, bụ ebe ọ dị mbụ anọ, na ncherita ihu Jonatan. Abna nọdụrụ nʼakụkụ Sọl, ma oche Devid na-anọ enweghị onye nọ ya.
26 されど其日にはサウル何をも曰ざりき其は何事か彼におこりしならん彼きよからず定て潔からずと思ひたればなり
Sọl ekwughị ihe ọbụla banyere ya nʼụbọchị ahụ, nʼihi na o chere na ọ dị ihe ndaba mere, nke tinyere Devid nʼọnọdụ adịghị ọcha. Sọl kwuru nʼobi ya sị, “E, ọ ghaghị ịbụ ihe kpatara ya.”
27 明日すなはち月の二日におよびてダビデの座なほ虚しサウル其子ヨナタンにいひけるは何ゆゑにヱサイの子は昨日も今日も食に來らざるや
Ma nʼechi ya, bụ abalị nke abụọ nke ọnwa ọhụrụ, ọnọdụ Devid tọgbọrọ nʼefu ọzọ. Mgbe ahụ, Sọl sịrị nwa ya Jonatan, “Gịnị mere nwa Jesi abịaghị iso rie nri, ma ụnyaahụ ma taa?”
28 ヨナタン、サウルにこたへけるはダビデ切にベテレヘムにゆかんことを我にこひて曰けるは
Jonatan zara sị, “Devid rịọrọ sị m nye ya ike ka ọ gaa Betlehem.
29 ねがはくは我をゆるしてゆかしめよわが家邑にて祭をなすによりわが兄我にきたることを命ぜり故に我もし汝のまへにめぐみをえたるならばねがはくは我をゆるして去しめ兄弟をみることを得さしめよと是故にかれは王の席に來らざるなり
Ọ sịrị m, ‘Kwere ka m gaa nʼihi na ndị ezinaụlọ anyị nwere aja mmemme ha na-eme nʼobodo. Nwanne m nwoke nyere m iwu sị m na m aghaghị ịbịa. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼebe ị nọ, biko kwere ka m gaa hụ ụmụnne m.’ Ọ bụ nke a mere ọ bịaghị na tebul eze.”
30 サウル、ヨナタンにむかひて怒りを發しかれにいひけるは汝は曲り且悖れる婦の子なり我あに汝がヱサイの子を簡みて汝の身をはづかしめまた汝の母の膚を辱しむることを知ざらんや
Iwe were Sọl nke ukwuu. Ọ gwara Jonatan okwu nʼiwe sị ya, “Gị nwa nke nwanyị na-enupu isi, nke uche ya gbagọrọ agbagọ. Ị na-eche na m amaghị na i dịnyere nwa Jesi si otu a wetara onwe gị na nne gị ihe ihere?
31 ヱサイの子の此世にながらふるあひだは汝と汝の位固くたつを得ず是故に今人をつかはして彼をわが許に引きたれ彼は死ぬべき者なり
Nʼihi na ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ nʼụwa a, ọnọdụ gị na alaeze gị agaghị eguzosi ike. Ugbu a, pụọ, zipụ ozi kpọtara m ya ka m gbuo ya!”
32 ヨナタン父サウルに對へていひけるは彼なにによりて殺さるべきか何をなしたるやと
Jonatan jụrụ nna ya Sọl sị, “Gịnị ka o mere? Nʼihi gịnị ka a ga-eji mee ka ọ nwụọ?”
33 ここにおいてサウル、ヨナタンを撃んとて投槍をさしあげたりヨナタンすなはち其父のダビデを殺さんと決しをしれり
Ma Sọl tụrụ ùbe o ji nʼaka ya ka o jiri ya tugbuo Jonatan, ma Jonatan zere ya. Nke a mere ka Jonatan mata nʼezie na nna ya na-achọ igbu Devid.
34 かくてヨナタン烈しく怒りて席を立ち月の二日には食をなさざりき其は其父のダビデをはづかしめしによりてダビデのために憂へたればなり
Jonatan si na tebul ahụ bilie nʼoke iwe pụọ, o righịkwa nri nʼụbọchị nke abụọ nke mmemme ahụ, nʼihi na omume ihere nna ya mesoro Devid wutere ya hie nne.
35 翌朝ヨナタン一小童子を從がヘダビデと約せし時刻に野にいでゆき
Nʼụtụtụ echi ya, dịka ha kara aka, Jonatan gara nʼọhịa, ya na nwantakịrị nwoke so gaa.
36 童にいひけるは走りて我はなつ矢をたづねよと童子はしる時ヨナタン矢を彼のさきに發てり
Ọ sịrị nwantakịrị nwoke ahụ, “Gbara ọsọ gaa chọta àkụ ndị ahụ niile m na-agba.” Mgbe nwantakịrị ahụ na-agba ọsọ na-aga, Jonatan gbapụrụ àkụ, gbafee ya nʼihu nwantakịrị ahụ.
37 童子がヨナタンの發ちたる矢のところにいたれる時ヨナタン童子のうしろに呼はりていふ矢は汝のさきにあるにあらずや
Mgbe nwokorobịa ahụ na-ejeru nso ebe àkụ ahụ Jonatan gbara dị, Jonatan kpọkuru ya sị ya, “Àkụ ahụ dị nʼihu gị.”
38 ヨナタンまた童子のうしろによばはりていひけるは速かにせよ急げ止まるなかれとヨナタンの童子矢をひろひあつめて其主人のもとにかへる
Mgbe ahụ, o tiri mkpu sị, “Mee ngwangwa! Gawa ọsịịsọ! Eguzokwala!” Nwokorobịa ahụ chịkọtara àkụ ndị ahụ niile gbaghachikwute nna ya ukwu.
39 されど童子は何をも知ざりき只ヨナタンとダビデ其事をしりたるのみ
Ma nwantakịrị nwoke ahụ aghọtaghị ihe Jonatan mere; ma Jonatan na Devid maara ihe gara.
40 かくてヨナタン其武器を童子に授ていひけるは往けこれを邑に携へよと
Jonatan nyere nwokorobịa ahụ ụta ya na àkụ ndị ahụ ka ọ chighachi ha nʼobodo.
41 童子すなはち往けり時にダビデ石の傍より立ちあがり地にふして三たび拝せりしかしてふたり互に接吻してたがひに哭くダビデ殊にはなはだし
Mgbe nwokorobịa ahụ lara, Devid biliri site nʼakụkụ ndịda nkume ahụ ebe o zoro onwe kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala ugboro atọ, nʼihu Jonatan. Ha suritere onwe ha ọnụ, bekọkwaa akwa. Ma Devid kwara akwa karịa.
42 ヨナタン、ダビデにいひけるは安じて往け我ら二人ともにヱホバの名に誓ひて願くはヱホバ恒に我と汝のあひだに坐し我が子孫と汝の子孫のあひだにいませといへりとダビデすなはちたちて去るヨナタン邑にいりぬ
Nʼikpeazụ, Jonatan gwara Devid okwu sị, “Gaa nʼudo, nʼihi na anyị ejirila aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi ịbụ enyi nʼetiti onwe anyị, na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ onye akaebe nʼebe mụ na gị, na nʼebe ụmụ ụmụ m, na ụmụ ụmụ gị nọ ruo mgbe ebighị ebi.’” Ha kewara. Devid malitere ịpụ, ma Jonatan tụgharịrị baa nʼobodo.

< サムエル記Ⅰ 20 >