< 列王記Ⅰ 4 >
Ya mere Solomọn ghọrọ eze ndị Izrel niile.
Ndị a bụ aha ndịisi ọchịchị obodo eze Solomọn họpụtara inyere ya aka. Azaraya, nwa Zadọk bụ onye nchụaja.
3 シシヤの子エリホレフとアヒヤは書記官アヒルデの子ヨシヤパテは史官
Elihoref na Ahija, ụmụ ndị ikom Shisha, bụ ndị ode akwụkwọ. Jehoshafat, nwa Ahilud bụ onye na-edekọ akụkọ.
4 ヱホヤダの子ベナヤは軍の長ザドクとアビヤタルは祭司
Benaya, nwa Jehoiada bụ onyeisi agha ndị Izrel. Zadọk na Abịata, bụ ndị nchụaja.
5 ナタンの子アザリヤは代官の長ナタンの子ザブデは大臣にして王の友たり
Azaraya nwa Netan bụ onyeisi na-elekọta ndị na-ejere eze ozi. Zabud nwa Netan bụ onye nchụaja na onye ndụmọdụ nye eze.
6 アヒシヤルは宮内卿アブダの子アドニラムは徴募長なり
Ahisha, bụ onyeisi na-elekọta nʼụlọeze. Adoniram nwa Abda bụ onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye.
7 ソロモン又イスラエルの全地に十二の代官を置り其人々王と其家のために食物を備へたり即ち各一年に一月宛食物を備へたり
Eze Solomọn họpụtara ndị ikom iri na abụọ ndị o mere ndịisi ga-elekọta akụkụ iri na abụọ nke o mere ka Izrel dịrị. Mmadụ iri na abụọ ndị a nwekwa ọrụ iwetara eze ihe oriri. Nwoke ọbụla nʼime ha nwe iwetara eze na ezinaụlọ ya ihe oriri otu ọnwa nʼafọ.
Nke a bụ aha ndị ikom iri na abụọ ahụ. Ben-Hua, onye na-achị ala ugwu ugwu Ifrem.
9 マカヅとシヤラビムとベテシメシとエロンベテハナンにはベンデケル
Ben-Deka, onye na-achị Makaz, na Shaalbim na Bet-Shemesh, na Elọn Bethanan.
10 アルポテにはベンヘセデありシヨコとヘベルの全地とは彼擔任り
Ben-Hesed, onye na-achị Arubot, na Soko, na Ala Hefa niile.
11 ドルの高地の全部にはベンアヒナダブあり彼はソロモンの女タパテを妻とせり
Ben-Abinadab, onye na-achị ala elu elu Doa. Nwoke a lụrụ Tafat, nwa nwanyị Solomọn.
12 アルヒデの子バアナはタアナクとメギドとヱズレルの下にザルタナの邊にあるベテシヤンの全地とを擔任てベテシヤンよりアベルメホラにいたりヨクネアムの外にまで及ぶ
Baana, nwa Ahilud, onye na-achị Teanak, na Megido nʼakụkụ Bet-Shan niile, nke dị nʼakụkụ Zaretan na ndịda Jezril, sitekwa na Bet-Shan ruo Ebel-Mehola gafee ma ruokwa Jokmeam.
13 ギレアデのラモテにはベンゲベルあり彼はギレアデにあるマナセの子ヤイルの諸村を擔任ち又バシヤンなるアルゴブの地にある石垣と銅の關を有る大なる城六十を擔任り
Ben-Geba, onye na-achị Ramọt Gilead, na obodo niile nke ikwu Jaịa, nwa Manase nwere nʼime Gilead, na akụkụ Agob niile nke dị na Bashan, na iri obodo ukwu isii e ji mgbidi gbaa gburugburu, nke nwekwara mkpọrọ bronz e ji kpụọ ụzọ ya.
Ahinadab nwa Ido, onye na-achị Mahanaim.
15 ナフタリにはアヒマアズあり彼もソロモンの女バスマテを妻に娶れり
Ahimaaz, onye na-achị Naftalị (ọ lụkwara nwa nwanyị Solomọn a na-akpọ Basemat).
Baana nwa Hushaị, onye na-achị Asha na Alot.
Jehoshafat nwa Parua onye na-achị Isaka.
Shimei nwa Ela onye na-achị Benjamin.
19 アモリ人の王シホンの地およびバシヤンの王オグの地なるギレアデの地にはウリの子ゲベルあり其地にありし代官は唯彼一人のみ
Gebea nwa Uri, onye na-achị Gilead (ala Saịhọn eze ndị Amọrait, na nke Ọg eze Bashan). Naanị ya ka e doro dịka gọvanọ ala ahụ.
20 ユダとイスラエルの人は多くして濱の沙の多きがごとくなりしが飮食して樂めり
Nʼoge a, ndị Juda na Izrel bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ha na-eri na-aṅụ, na-emekwa onwe ha obi ụtọ.
21 ソロモンは河よりペリシテ人の地にいたるまでとエジプトの境に及ぶまでの諸國を治めたれば皆禮物を餽りてソロモンの一生の間事へたり
Ala niile Solomọn na-achị sitere nʼoke osimiri Yufretis ruo ala ndị Filistia, rukwaa nʼoke ala ndị Ijipt. Ndị niile a lụgburu nʼagha nʼobodo ndị a na-atụta ụtụ ha na-enye Solomọn. Ha nọgidekwara nʼokpuru Solomọn ụbọchị niile nke ndụ ya.
22 偖ソロモンの一日の食物は細麺三十石粗麺六十石
Ihe oriri a na-ewebata nʼụlọ Solomọn ụbọchị niile bụ otu narị bushel ụtụ ọka na iri bushel asatọ, na iri akpa ọka a kwọrọ akwọ isii,
23 肥牛十牧場の牛二十羊一百其外に牡鹿羚羊小鹿および肥たる禽あり
na ehi iri mara abụba, na iri ehi abụọ a zụrụ nʼebe a na-azụ anụ, na narị atụrụ na ewu. A gụnyeghị anụ ele na mgbada na oke ele na ọkụkọ ọma a na-ewebata.
24 其はソロモン河の此方をテフサよりガザまで盡く治めたればなり即ち河の此方の諸王を悉く統治たり彼は四方の臣僕より平安を得たりき
Nʼihi na ọ chịrị alaeze niile a ruo nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis, site na Tifsa ruo na Gaza. O nwekwara udo nʼakụkụ niile.
25 ソロモンの一生の間ユダとイスラエルはダンよりベエルシバに至るまで安然に各其葡萄樹の下と無花果樹の下に住り
Nʼoge ndụ Solomọn niile, Juda na Izrel site na Dan ruo Bịasheba bi nʼudo. Nwoke ọbụla nọ nʼokpuru osisi vaịnị na nʼokpuru osisi fiig nke ya.
Ọnụọgụgụ ụlọ a na-etinye ụgbọ agha ịnyịnya na-adọkpụ nke Solomọn nwere dị puku anọ. Ọnụọgụgụ ịnyịnya a na-agba agba o nwere dị puku iri na abụọ.
27 彼代官等各其月にソロモン王のためおよび總てソロモン王の席に來る者の爲に食を備へて缺るとこるなからしめたり
Nʼọnwa ọbụla, ndị ahụ a họpụtara ịchị Izrel na-ewetara eze Solomọn na ndị ụlọ ya ihe oriri. Ha adịghị ekwekwa ka otu ihe kọọ nʼụlọ ya.
28 又彼等各其職に循ひて馬および疾足の馬に食する大麥と蒭蕘を其馬の在る處に携へ來れり
Ha na-ewetakwa ọka balị na ahịhịa ọka nʼebe o kwesiri, maka ịnyịnya na-adọkpụ ụgbọ agha na ịnyịnya ụkwụ ọsọ ndị ọzọ dịka ihe ha ketara nʼụtụ si dị.
29 神ソロモンに智慧と聰明を甚だ多く賜ひ又廣大き心を賜ふ海濱の沙のごとし
Chineke nyere Solomọn amamihe, na uche nghọta, na mmụọ ịmụta ọtụtụ ihe nke bara ụba dịka aja dị nʼakụkụ osimiri.
30 ソロモンの智慧は東洋の人々の智慧とエジプトの諸の智慧よりも大なりき
Amamihe Solomọn dị ukwuu karịa amamihe ndị si ọwụwa anyanwụ. Nʼezie, ọ dị ukwuu karịakwa amamihe ndị maara ihe nʼIjipt.
31 彼は凡の人よりも賢くエズラ人エタンよりも又マホルの子なるヘマンとカルコルおよびダルダよりも賢くして其名四方の諸國に聞えたり
Ọ maara ihe karịa onye ọbụla, karịa Etan onye Ezra, na Heman, na Kalkol, na Dada, ụmụ ndị ikom Mahol. Ihe banyere ịdị ukwuu ya gbasara na mba niile gbara ha gburugburu.
Ọ tụrụ puku ilu atọ, deekwa abụ ọnụọgụgụ ha dị otu puku na ise.
33 彼又草木の事を論じてレバノンの香柏より墻に生る苔に迄及べり彼亦獣と鳥と匐行物と魚の事を論じたり
O kwuru okwu banyere osisi, site na osisi sida nke Lebanọn ruo nʼahịhịa hisọp nke na-eto na mgbidi aja, na ihe banyere ụmụ anụmanụ na anụ ufe, na anụ na-akpụgharị nʼala nakwa azụ.
34 諸の國の人々ソロモンの智慧を聽んとて來り天下の諸の王ソロモンの智慧を聞及びて人を遣はせり
Ndị eze niile dị nʼụwa bụ ndị bịara ịnụrụ banyere amamihe ya zitere ndị si na mba niile dị iche iche ịnụrụ okwu amamihe Solomọn.