< Uluka 3 >

1 Anyimo ani we ni kirau inti cibi ati gomo ti Kaisar Agusta, Bilatus Babunti inti gumna tu Yahudiya, Hiridus inti gomo to Galili, Uhenu umeme Filibus inti gomo tu Ituriya nan Tirakonitis, Lisaniyas inti gomo tu Abiliya.
Nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị Tiberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Pailet bụ onye na-achị Judịa, ebe Herọd bụkwa onye na-achị akụkụ Galili, ma nwanne ya nwoke bụ Filip na-achị akụkụ Iturịa na Trakona, Laisania bụkwa onye na-achị akụkụ Abilin,
2 Uganiya me Hanana nan kayata we wani ana dandang aka tuma ka Asere, tize ta Asere ti ē Yohanna usam uzakariya anyimo ani jaa.
mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara.
3 Ma haki vat ati hihira sa ta kete uraba urdu, unu bezizi utize ta Asere nan ubaptisma ubarka barki uvette ucaran.
Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
4 Kasi uyerte utize ti Ishaya unu kurzuzo utize ta Asere, “Ni Myiran unu tissa ani Jaa, 'Barkani unaa Asere, Barkani tinaa tumeme dret.
Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.
5 Kondi uya ugbangbang undi myinca, nan kondi niya nihoho nan nipana nidi tuu, nan ti naa ti mammangaran adi witti tini adi myinciza tinaa me sa tizin inti waa.
A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala. Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma, meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị.
6 Vat anuu wadi iri ubura wa Asere”.
Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’”
7 Yohana ma gun nigura nanuu me sa wa aye bati ma wuzi we ubaptisma “Shi ahana iwaa iti kono aveni magunan shi Isumi ucurnome iruba me sa I'eze?
Jọn sịrị igwe mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim sị, “Unu ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa?
8 Nyani ahana sa wazin in niruba ubarka, kati itubi ugusa “Tizin Ibrahim acoo uru, barki sa in boo shi Asere Madake ma kurzo apoo ageme ahana Ibrahim.
Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ.
9 Ana me amu wuna bitem atini ama titi barki anime vat utiti me sa wa game uyoo ahana wa ririn adi yori uni avetten anyimo uraa”.
Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.”
10 Nigura me niriaje unu igizo ume unu gusa “Nyanini tidi wuzi?”
Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?”
11 Ma kabirka ma gun we “De sa mazin tidibi tini tiree ma nya de sa ma zomen ba u'inde, de sa mazin ini mumyarce ma wuzi anime cangi.
Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.”
12 Anu kabsa Ikirfi imanyanga wa ē ma wuzi baptisma wa gun me “Unuu ubezizi, nyanini tidi wuzi?”
Ọ bụladị ndị ọna ụtụ bịakwara ka e mee ha baptizim. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, gịnị ka anyị kwesiri ime?”
13 Ma gun we “Kati ikabi ikirfi me sa iteki ige sa agunan shi ikabi ba”.
Ọ sịrị ha, “Unu anatala karịa otu unu kwesiri ịnata.”
14 Anani kara nini kono wa iki me, wa gu, “A haru naa? Ma gun we, “Kati iburri uye ikirfi innikara ba, nan i canni uye upilko sa ma taame ba Tonnoni ikirfi uppe ushi me”.
Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?” Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.”
15 Sa anuu waa zin nucanta uguna Yeso ma ē, konderi mameki ugamara me iruba anicee ni Yohana, nan memani Yeso.
Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ.
16 Yohana makabirka ma gun Vat uwe “Me inzi shi unu baptisma inmei uye ma eze sa ma teki nikara num, ma bari in soppi tizin ta kpattak ameme ba. Madi wuzi shi ubaptisma in Bibe ba Asere bilau nan uraa.
Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.
17 Upija utana wa alkana umeme uraa atari bati ma ori ma wuu ati kere tume Madi punsi mucini me unu raa sa uda bito ba”.
Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.”
18 Unu gbara kang, Yohana ma bezizi anuu abanga urunta.
O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma.
19 Yohana ma gbarika ugomo Hiridus sa ma wuza anya nan unee uhenu me, Hiruduya, nan ukasu uti mum sa Hiridus ma wuza.
Ma Eze Herọd, onye ọ tara ụta maka Herodịas nwunye nwanne ya nwoke, nakwa maka ihe ọjọọ dị iche iche ndị o mere,
20 Ma kurima kinkin ma wuu aka kurso Yohana akura anirere.
tụkwasịkwara ihe nʼelu ihe ndị a niile, site na ịtụnye Jọn nʼụlọ mkpọrọ.
21 Sa awuza anuu ubaptisma awuzi Yeso ubaptisma cangi, sa ma zin biringara Aseseri apokino.
Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere.
22 Bibe ba Asere bilau bituu me kasi uhurbe, nimyiran ni Aseseri “Hu vana mani, de sa inkunna me. In kunna urunta ume”.
Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
23 Yeso maa tubi katuma a tiwe akuru ataru. Maa zi vana (kasi basa me) Isubu vana u Lawi
Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef, onye bụ nwa Heli;
24 Vana u Matat, vana a lawi, vana u Malki, vana u Yanna, vana u Isubu,
Heli abụrụ nwa Matat, nwa Livayị, nwa Meliki, nwa Janayi, nwa Josef;
25 Vana Umatatiya, vana u Amos, vana u Nahum, vana Hasli, vana Najjaya
nwa Matatiyas, nwa Emọs, nwa Nehum, nwa Esili, nwa Nagayị;
26 Vana u Maata, vana u Matatiya, vana u Shumeya, vana a Yuseka, vana u Yoda,
nwa Maat, nwa Matatiyas, nwa Semein, nwa Josek, nwa Joda;
27 vana Yowana, vana u Resa, vana u Zarubabila, vana u Shiyaltiyel, vana u Niri,
nwa Joanan, nwa Resa, nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, nwa Neri;
28 vana u Malki, vana u Addi, vana u Kosama, vana u Almadama, vana u Er,
nwa Meliki, nwa Adi, nwa Kosam, nwa Elmadam, nwa Er,
29 vana u Yosi, vana u Alyeza, vana u Yorima, vana u Matat, vana u Lawi
nwa Joshua, nwa Elieza, nwa Jorim, nwa Matat, nwa Livayị;
30 vana u Saminu, vana u Yahuda, vana u Isubu, vana u Yuhana, vana u Aliyakima,
nwa Simiọn, nwa Juda, nwa Josef, nwa Jonam, nwa Eliakịm;
31 vana u Malaya, vana u Mainana, vana u Matata, vana u Natan, vana u Dauda,
nwa Melea, nwa Mena, nwa Matata, nwa Netan, nwa Devid;
32 vana u Yesse, vana u Obida, vana u Bo'aza, vana u Salmo, vana u Nashon,
nwa Jesi, nwa Obed, nwa Boaz, nwa Salmọn, nwa Nashọn;
33 vana u Amminadab, vana u Adimi, vana u Arama, vana u Hezruna, vana u Feresa, vana u Yahuda,
nwa Aminadab, nwa Ram, nwa Hezrọn, nwa Perez, nwa Juda;
34 vana u Yakubu, vana u Ishaku, vanu Ibrahim, vanu Tera, vanu Nahor,
nwa Jekọb, nwa Aịzik, nwa Ebraham, nwa Tera, nwa Nahọ;
35 vanu Serug, vanu Reyu, vanu Feleg, vanu Abiru, vanu Shela,
nwa Serug, nwa Reu, nwa Peleg, nwa Eba, nwa Shela;
36 vana u Kainana, vana u Arfakshada, vana u Shem, vana u Nuhu, vana u Lamek,
nwa Kenan, nwa Aafaksad, nwa Shem, nwa Noa, nwa Lamek;
37 vana u Metusela, vana u Anuhu, vana u Yaret, vana u Mahalel, vana u Kainana,
nwa Metusela, nwa Enọk, nwa Jared, nwa Mahalalel, nwa Kenan;
38 vana u Enosh, vana u Shitu, vana u Adamu, vana Asere.
nwa Enọsh, nwa Set, nwa Adam, nwa Chineke.

< Uluka 3 >