< Uluka 23 >
1 Vat anuu me sa wa tarsa wa hiri wa tonno, wa ēn Yeso ahira Bilatus.
Mgbe ahụ, ọha mmadụ ahụ niile biliri duru ya gakwuru Pailet.
2 Wa hiri me inna banga ayari, unu gusa “Ta kem unun geme unu hara umu ruba manu, agi kati wa nya ikirfi ima nyanga ba, unu gusa agi memani Asere, Ugomo”.
Ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị obodo anyị niile, na-egbochikwa ha ịtụ ụtụ isi nye Siza, ma na-ekwukwa na ya bụ Kraịst, Eze.”
3 Bilatus ma iki me “Ho mani Ugomo a Yahudawa?” Yeso makabirka me ma gu “Wa buka anime”.
Ya mere Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara ya sị, “Gị onwe gị kwuru otu a.”
4 Bilatus ma gun anu adandang aka tuma nan anuu gbardang, “Daki ma kem unun ugeme unu pilko ba.
Mgbe ahụ Pailet gwara ndịisi nchụaja na igwe mmadụ ahụ, “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m chọpụtara nwoke a mere.”
5 Wa gaawe unu gusa “Ma bunkurko anuu unu bezizi umeme vat uyahuda, matuba ugalili nanu aye abame.”
Ma ha gara nʼihu na-asị, “Ọ na-akpasu ọgbaaghara nʼala ndị Judịa niile site nʼozizi ya. Ọ malitere na Galili, ọ bịakwala ebe a ugbu a.”
6 Sa Bilatus ma kunna anime, ma iki nan unuu nuu Galili mani.
Mgbe Pailet nụrụ nke a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ bụ onye Galili?
7 Sa ma rusa unun maran atari ti Hiridua tini, ma tuburko Yeso u hana ahira Hiridus u Jerusalem ati yee me.
Mgbe ọ matara na o si nʼebe Herọd na-achị, o nyere iwu ka e dugara ya Herọd, onye nọkwa na Jerusalem mgbe ahụ.
8 Sa Hiridus ma ira Yeso, ma wu apuru arum, barki sa ma nyara u ira ume datti. Mamu kunna abanga ame, ma nyara ma iri imum ibiyau me sa ma wuza.
Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu, mgbe ọ hụrụ Jisọs nʼihi na ọ nọ na-achọ ịhụ ya anya nʼoge dị anya gara aga. Sitekwa nʼakụkọ ọ nụrụ banyere ya, o lere anya na ọ ga-arụ ọrụ ebube ụfọdụ.
9 Hiridus ma iki Yeso timum gbardang, Yeso ma game kabirka me.
Ya mere ọ jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ, ma ọ zaghị ya ihe ọbụla.
10 Unuu adandang aka tuma nan anuu nyerte wa hirri ummu ruba wa nya me ayari.
Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu guzo nʼebe ahụ gara nʼihu bosie ya ebubo ike.
11 Hiridus nan ana nikara nini kono (Ma'Soja) wa zogizi me wa wuzi me nibassa. Wa sukki me udibi udandang wa kurzo me ahira Bilatus.
Emesịa, Herọd na ndị agha ya jiri ya mee ihe ọchị, ma kwaakwa ya emo. Ha yikwasịrị ya uwe mwụda mara mma ma zighachikwara ya Pailet.
12 Barki Hiridus nan Bilatus wazin ruroni inna cece atiyee me (wazin inni erru atiyee ta dumo)
Nʼụbọchị ahụ ka Herọd na Pailet ghọrọ enyi, maka nʼoge gara aga ha bụ ndị iro.
13 Bilatus ma titi anuu adandang aka tuma nan Agomo dandang nan nigura na nuu.
Pailet kpọkọtara ndịisi nchụaja, na ndị ndu, na ndị mmadụ ndị ọzọ
14 Ma gun we “Ya aye nime unu nuu ugeme kasi unuu sa mazin nuwuza anun wa wuzi imum izenzen, irani ma iko me ashin, daki ma kem me inna bur imumme sa ya booni anicee numeba.
sị ha, “Unu kpọtaara m nwoke a dị ka otu onye nʼime ndị na-akpali ndị mmadụ inupu isi. Ajụọla m ya ajụjụ nʼihu unu ma achọpụtaghị m ihe ọbụla nke unu kwesiri iji boo ya ebubo.
15 Nan Hiridus sa ma kurzo me ahira aru ma ira me inna bur sa abari ahun me ba.
Ọ bụladị Herọd achọpụtaghị ihe ọjọọ ọbụla nʼaka ya, nke a mere o jiri kpụghachitere anyị ya. Leenụ, o nweghị ihe ọbụla o mere e kwesiri iji maa ya ikpe ọnwụ.
16 “Barki anime indi cobi me in ceki me”.
Ya mere aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.”
17 Bilatus maka nya a Yahudawa unun inde anyimo ande sa wa rani akura ani rere uganiya idin keterewa.
Ma ọ dị mkpa na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ nʼoge mmemme.
18 Wa meki tihunu vat uwe unu gusa “Ceki unuu geme u nyan duru Barabas”.
Ma igwe mmadụ ahụ tiri mkpu nʼotu olu sị, “Gbuo nwoke a, hapụrụ anyị Barabas.”
19 Barabas unuu me sa aka korso me udenge uni rere sa ma guri ahira ahun unuu.
(Onye a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara dapụtara nʼobodo ahụ, nakwa nʼihi igbu mmadụ.)
20 Bilatus ma kuri ma buki we tize uguna ma ceki Yeso.
Dị ka ọ gbalịsịrị ike ịhapụ Jisọs, Pailet gwakwara ha okwu ọzọ.
21 Wa wuu tihunu wa gu “Gankirka me, Gankirka me”.
Ma ha niile tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!”
22 Ma gun we uku taru, “Barki nyani, a ya bur ani unuu geme ma wuza shi? Daki makemme unu pilko sa wa bari ahume ba. Barki anime imma Cobo me indi ceki me”.
Ọ sịrị ha na nke ugboro atọ, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ nwoke a mere? O nweghị ihe ọbụla m chọpụtara nʼaka ya kwesiri iwetara ya ọnwụ. Ya mere aga m ata ya ahụhụ, hapụ ya.”
23 Wa game inti myiran inna za, unu nyara a nyawe me wa gankirka me. Tihunu tuweme tihunguko iruba i Bilatus.
Ma ha nọgidere na-eti mkpu nʼoke olu ka a kpọgide ya nʼobe, nʼikpeazụ olu iti mkpu ha karịrị.
24 Abinime Bilatus ma nya we me.
Ya mere Pailet kpebiri imere ha ihe ha chọrọ.
25 Ma ceki Barnabas sa maa guri ahira ahun unuu. Ma nyawe Yeso sa wa nyara.
Ọ hapụrụ nwoke ahụ ha chọrọ nke a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara na igbu mmadụ, ma nyefee ha Jisọs nʼaka.
26 Sa wa haka nan me, wa gurna nan Siman unanuu Sayirin, ma zeze usuro ani pin, wa canni me ukunti ugankirka ma tarsi Yeso.
Dị ka ha duu ya na-aga, ha jidere Saimọn onye Sirini bụ onye si nʼime otu obodo nta na-alọbata; ha boro ya obe ahụ, manye ya ka o buru ya na-eso Jisọs na-azụ.
27 Unu hem unu gura nanuu nan nanee intisso nan tihunu, unu tarsa ume.
Igwe mmadụ dị ukwuu soro ya tinyekwara ụmụ nwanyị bụ ndị tiri mkpu akwa ma ruokwara ya ụjụ.
28 Yeso ma gamirka ma gu “Acaa anu Jerusalem, kati ishinime ba, sooni acee ashi nan na hana ashi.
Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụada Jerusalem, unu eberela m akwa, kama beerenụ onwe unu na ụmụ unu.
29 Irani barki, tiyee tieze sa wadi gu, 'Ani ruba irum wani anuu zattu yozo, nan tipuru sa daki ta yozo nan na hene sa daki a hamza ba.
Nʼihi na oge na-abịa mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzị na-adịrị ụmụ nwanyị aga, akpanwa ndị na-amụghị nwa, na ara ndị na-enweghị onye ṅụrụ ha.’
30 Abini me wadi tubi ugusan na pana 'Rizo aharu', nan napoo, 'Impon duru',
Mgbe ahụ, “‘ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Dakwasị anyị!” Sịkwa, ugwu nta, “Kpuchite anyị!”’
31 Ingi awuza matiti mazu aname, nyanini idi kem mage sa mawaa?”
Ya mere, ọ bụrụ na ha mee ọhịa otu a mgbe ahịhịa dị ndụ dị na ya, gịnị ga-emekwanụ mgbe ọ kpọrọ nkụ?”
32 Ukassu anuu, akari waree wazi nigome nan me tantu kahuname.
Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya.
33 Sa wa aye ahirame sa atisa “Ukunkuwa”, Wa gankirka me nan akari waree unuu inde atari tinanre unuu inde atari tinangure.
Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
34 Yeso ma gu “Acoo, vette ucara uwemen, barki sa wa taawe imume sa wazin unuwuza ba”. Wa acece tirunga tumeme in bizawazawa.
Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha.
35 Anuu wa turi unu hirame, agomo unu wuza ume nibassa, unu gusa “Ma bursa aye ca ma buri nice nume, ingi memani Ugomo Asere nan Asere sa a Zauka”.
Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.”
36 Anani kara nini kono (Ma Soja) wa meki uhaza upuru ume unu wuza ume nibassa, unu ninza ume mei magbarara.
Ndị agha bịakwara chịa ya ọchị. Ha nyere ya mmanya gbara ụka,
37 Unu gusa, “Ingi homan Ugomo wa Yahudawa, bura nicee nuwe”.
ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.”
38 U'ira warani ame “Ugomo wa Yahudawa mazigeneme”.
Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ: Onye a bụ Eze ndị Juu.
39 Uye anyimo akarime mazogeme sa agankirka we nan me unu gusa “Inzo homani Ugomo Asere? Bura nicee nuwe nan haru”.
Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.”
40 Unuu kureme ma tarika me, magu “Uda kunna we biyau ba Asere ba, tunsa imun inde ini ya kem shi?
Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya.
41 Haru tiraa abame rep, barki ucara urun. Unuu ugeme daki ma cara imum ninba”.
Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”
42 Ma gu, “Yeso, ringinmi anyimo ati Gomo tuweme”.
Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.”
43 Yeso ma gunme “Kadundura ma gunan huu, kani udizi nan mi akura Asere.”
Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.”
44 Inna tii uwui (Azumu kirau in anaree) ahira abee Uhana uniyee.
Mgbe ọ na-eru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile ruo elekere atọ nke ehihie.
45 Masaa mu wui ma inpino. Ugebtu udenge unigurame ujanika atii.
Nʼihi na anyanwụ kwụsịrị inye ihe ya. Akwa mgbochi dị nʼụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ.
46 Inna soo, inni nyiran nidandang Yeso ma gu, “Acoo, ma nya Bibe bum atari tuwe”. Sa ma buka anime ma wii.
Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Nna, nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” Mgbe o kwusiri nke a, o kubiri ume.
47 Sa una nikara nini kono (Usoja U Romawa) ma ira imumme sa ya cukuno anime ma gu “Kadundura unuu geme ma zome ma dini ba”.
Mgbe ọchịagha na-achị otu narị ndị agha hụrụ ihe merenụ, o nyere Chineke otuto ma kwuokwa sị, “Nʼezie nwoke a bụ onye ezi omume.”
48 Vat nigura nanbu sa wa aye bati iri imumme sa awuza, wa kuri unu tira igiri.
Mgbe igwe mmadụ niile gbakọtara ilere anya hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼụlọ ha na-eti aka nʼobi.
49 Vat ande sa wa rusa me, nan anee me sa wa tarsa me usuro u Galili, wa tonno pit, unu hira utimumme.
Ma ndị niile maara onye ọ bụ, tinyekwara ụmụ nwanyị ndị soro ya si Galili bịa, guzokwara nʼebe dị anya na-ele ihe ndị a.
50 Russani, uru nun maa rani unaniza Isubu, de sa maa rani anyimo anuu hirra. Unuu uririn mani ini ruba ubenki.
O nwere otu nwoke aha ya bụ Josef, onye so nʼotu ndịisi ụlọ nzukọ. Ọ bụ ezigbo mmadụ na onye aka ya kwụ ọtọ.
51 Unuu ugeme daki ma hem ini mumme sa anuu hirra wa wuza ba nan bi wuzawuza buweme ba. Mee unanuu Yahuda mani ani pin nu Arimatiya mazin nunyara uti Gomo ta Asere.
Ọ kwadoghị mkpebi ha na omume ha. Onye sitere Arimatia, nʼotu obodo ndị Juu, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke.
52 Unuu me makem Bilatus, ma iki ikizi Yeso.
Nwoke a gakwuru Pailet rịọọ ka e bunye ya ahụ Jisọs.
53 Ma tuzo ini, ma impi ini unu malti uririn, ma ka natta a ire ican upuru uni poo, sa daki amuwuna ire ikizin ba.
Ya mere, o budatara ya fụchie ya nʼakwa ọcha linin, tinye ya nʼili e gwuru nʼọgba nkume, nke a na-etinyebeghị mmadụ na mbụ.
54 Uwui ubibarabara bini nan Asabar a ezi.
Ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe maka ụbọchị izuike nke na-abịa nso.
55 Anee me sa wa tarsi Yeso usuro U Galili, wa tarsi waka ira ican me nan nuvati me.
Ndị nwanyị ahụ sitere Galili soro ya hụrụ ili ahụ, hụkwa otu e si nibe ahụ ya nʼime ya.
56 Wa kuri, waka nyara uturari nan mani munya urunta. Wa venke unu wui wa sabar kasi udungara U Musa.
Emesịa ha laghachiri ga kwadoo mmanụ otite nke e tinyere ọtụtụ ụda. Nʼụbọchị izuike ha zukwara ike dịka ọ dị nʼiwu.