< Genesis 5 >

1 Daytoy ti listaan dagiti kaputotan ni Adan. Iti aldaw a pinarsua ti Dios ti tao, inaramidna ida a kalanglangana.
Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.
2 Pinarsuana ida a lalaki ken babai. Binendisionanna ida ken pinanagananna ida iti tao, idi naparsuana ida.
O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.
3 Idi nagbiag ni Adan iti 130 a tawen, naaddaan isuna iti putot a lalaki a kalanglangana, a kaas-aspingna, ket pinanagananna daytoy iti Set.
Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set.
4 Kalpasan iti pannakaipasngay ni Set, nagbiag pay ni Adan iti 800 a tawen. Naaddaan isuna iti adu pay nga annak a lallaki ken babbai.
Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
5 Nagbiag ni Adan iti 930 a tawen, ket kalpasanna, natay.
Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.
6 Idi nadanon ni Set iti 105 a tawen, naaddaan isuna iti putot ket isu ni Enos.
Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh,
7 Kalpasan iti pannakaipasngay ni Enos, nagbiag pay ni Set iti 807 a tawen, ken naaddaan isuna iti adu pay nga annak a lallaki ken babbai.
Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
8 Nagbiag ni Set iti 912 a tawen, ket kalpasanna, natay.
Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ.
9 Idi nadanon ni Enos iti 90 a tawen, naaddaan isuna iti putot ket isu ni Kenan.
Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan.
10 Kalpasan iti pannakaipasngay ni Kenan, nagbiag pay ni Enos iti 815 a tawen. Naaddaan isuna iti adu pay nga annak a lallaki ken babbai.
Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
11 Nagbiag ni Enos iti 905 a tawen, ket kalpasanna, natay.
Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise.
12 Idi nadanon ni Kenan iti 70 a tawen, naaddaan isuna iti putot ket isuni Mahalalel.
Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel.
13 Kalpasan iti pannakaiyanak ni Mahalalel, nagbiag pay isuna iti 840 a tawen. Naaddaan isuna iti adu pay nga annak a lallaki ken babbai.
Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
14 Nagbiag ni Kenan iti 910 a tawen, ket kalpasanna, natay.
Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.
15 Idi nadanon ni Mahalalel iti 65 a tawen, naaddaan isuna iti putot ket isu ni Jared.
Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared.
16 Kalpasan iti pannakaiyanak ni Jared, nagbiag pay ni Mahalalel iti 830 a tawen. Naaddaan isuna iti adu pay nga annak a lallaki ken babbai.
Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
17 Nagbiag ni Mahalalel iti 895 a tawen, ket kalpasanna, natay.
Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise.
18 Idi nadanon ni Jared iti 162 a tawen, naaddaan isuna iti putot ket isu ni Enoc.
Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk.
19 Kalpasan iti pannakaipasngay ni Enoc, nagbiag pay ni Jared iti 800 a tawen. Naaddaan isuna iti adu pay nga annak a lallaki ken babbai.
Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
20 Nagbiag ni Jared iti 962 a tawen, ket kalpasanna, natay.
Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ.
21 Idi nadanon ni Enoc iti 65 a tawen, naaddaan isuna iti putot ket isu ni Metusalem.
Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela.
22 Nagna ni Enoc a kaduana ti Dios iti 300 a tawen kalpasan iti pannakaipasngay ni Metusalem. Naaddaan isuna iti adu pay nga annak a lallaki ken babbai.
Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
23 Nagbiag ni Enoc iti 365 a tawen.
Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.
24 Nagna ni Enoch a kaduana ti Dios, ket kalpasanna, nagpukaw, ta innala isuna ti Dios.
Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
25 Idi nadanon ni Metusalem iti 187 a tawen, pinutotna ni Lamek.
Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.
26 Kalpasan iti pannakaipasngay ni Lamek, nagbiag pay ni Metusalem iti 782 a tawen. Naaddaan isuna iti adu pay nga annak a lallaki ken babbai.
Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
27 Nagbiag ni Metusalem iti 969 tawen, ket kalpasanna, natay.
Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.
28 Idi nadanon ni Lamek iti 182 a tawen, naaddaan isuna iti putot a lalaki.
Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke.
29 Pinanagananna daytoy iti Noe, kinunana, “Mangiyegto daytoy iti inana manipud iti panagtrabahotayo ken kadagiti nadagsen a trabaho dagiti imatayo, nga isu iti masapul nga aramidentayo gapu iti daga nga inlunod ni Yaweh.
Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.”
30 Nagbiag ni Lamek iti 595 a tawen kalpasan iti pannakaipasngay ni Noe. Naaddaan isuna iti adu pay nga annak a lallaki ken babbai.
Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
31 Nagbiag ni Lamek iti 777 a tawen. Kalpasanna ket natay.
Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.
32 Kalpasan a nagbiag ni Noe iti 500 a tawen naaddaan isuna kadagiti annak a ni Sem, Ham ken Jafet.
Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.

< Genesis 5 >