< Genesis 22 >

1 Napasamak a kalpasan dagitoy a banbanag ket pinadas ti Dios ni Abraham. Kinunana kenkuana, “Abraham!” Kinuna ni Abraham, “Adtoyak.”
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.”
2 Ket kinuna ti Dios, “Alaem ti anakmo, ti kakaisuna nga anakmo, a dungdungoem, ni Isaac, ket mapankayo idiay daga ti Moria. Idatonmo isuna a kas daton a mapuoran iti maysa kadagiti bantay sadiay, nga ibagakto kenka.”
Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.”
3 Isu a nasapa a bimmangon ni Abraham iti bigbigat, insaganana ti asnona, ken nangikuyog iti dua nga agtutubo a lalaki nga adipenna, kasta met ni Isaac nga anakna. Nangputed iti kayo para iti daton a mapuoran, ket nagdaliasatda iti lugar nga imbaga ti Dios kenkuana.
Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya.
4 Iti maikatlo nga aldaw, timmangad ni Abraham ket nakitana ti lugar iti adayo.
Nʼụbọchị nke atọ, Ebraham lepụrụ anya hụ ebe ahụ nʼebe dị anya.
5 Imbaga ni Abraham kadagiti agtutubo a lallaki nga adipenna, agbatikayo ditoy a kaduayo ti asno, ket mapanak ken ti ubing idiay. Agdayawkami ket subliandakayonto.
Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.”
6 Ket innala ni Abraham ti kayo para iti daton a mapuoran ket impabaklay kenni Isaac a putotna. Innalana ti beggang ken ti kutsilyo; ket napanda a dua.
Ebraham boro nwa ya nwoke Aịzik ukwu nkụ ahụ e ji achụ aja nsure ọkụ nʼisi, ma ya onwe ya jidere ọkụ na mma.
7 Nagsao ni Isaac kenni Abraham nga amana ket kinunana, “Ama,” ket kinunana, “Adtoyak, anakko.” Kinunana, ''Kitaem, adda ditoy ti beggang ken ti kayo, ngem ayanna ti kordero a para iti daton a mapuoran?”
Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?”
8 Kinuna ni Abraham, “Mangipaayto ti Dios iti kordero a para iti daton a mapuoran, anakko. “Isu nga intuloyda a dua iti napan.
Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha.
9 Idi nakagtengda iti lugar nga imbaga ti Dios kenkuana, nangbangon ni Abraham iti altar sadiay ket imparabawna ti kayo iti daytoy. Kalpasanna, pinungona ni Isaac nga anakna, ket impaiddana iti altar, iti rabaw ti kayo.
Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ.
10 Ginaw-at ni Abraham ti kutsilyo tapno patayenna ti anakna.
Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke.
11 Kalpasanna, inawagan isuna ti anghel ni Yahweh manipud langit a kinunana, ''Abraham, Abraham!” ket kinunana, “Adtoyak.”
Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.”
12 Kinunana, “Saanmo a sagiden ti ubing a lalaki, wenno agaramid iti aniaman a banag a mangdangran kenkuana, ta ita, ammokon nga agbutengka iti Dios, gapu ta saanmo nga impaidam ti anakmo a kakaisuna manipud kaniak.”
Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.”
13 Timmangad ni Abraham ket pagammoan, iti likudanna ket adda kalakian a karnero a naisalat dagiti sarana iti narukbos a kayo. Napan ni Abraham ket innalana ti kalakian a karnero ket indatonna a kas daton a mapuoran imbes a ti anakna a lalaki.
Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke.
14 Isu a pinanaganan ni Abraham dayta a lugar iti “Isabet ni Yahweh'' ket maibagbaga agingga iti daytoy nga aldaw, “Iti rabaw ti bantay ni Yahweh, maisabetto.”
Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “Onyenwe anyị ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu Onyenwe anyị, a ga-arọpụta.”
15 Inawagan ti anghel ni Yahweh ni Abraham iti maikadua a daras manipud langit
Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ,
16 ket kinunana - daytoy ket sasao a nagtaud kenni Yahweh, “Sinapataak iti bagik a gapu ta inaramidmo daytoy a banag, ken saanmo nga impaidam ti kakaisuna nga anakmo a lalaki,
sị, “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja,
17 pudno a bendisionankannto ken paaduekto ti kaputotam a kas iti kaadu dagiti bituen sadi langit, ken kas iti darat iti igid ti baybay; ken tagikuaento ti kaputotam ti ruangan dagiti kabusorda.
aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.
18 Babaen kadagiti kaputotam ket mabendisionanto amin a nasion ditoy daga, gapu ta nagtulnogka iti timekko.”
Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”
19 Nagsubli ngarud ni Abraham iti ayan dagiti agtutubo nga adipenna, ket pimmanawda ken nagkukuyogda a napan idiay Beerseba, ket nagnaed isuna idiay Beerseba.
Emesịa, Ebraham laghachikwuru ndị na-ejere ya ozi. Ha niile laghachikwara Bịasheba. Ebraham birikwara na Bịasheba.
20 Napasamak a kalpasan dagitoy a banbanag ket naipadamag kenni Abraham, “Naganak met ni Milka, para iti kabsatmo a ni Nahor.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, e ziri Ebraham ozi si ya, “Lee, Milka ya onwe ya amụkwaarala nwanne gị nwoke bụ Nahọ, ụmụ ndị ikom.
21 Isuda ket ni Uz nga inauna, ni Buz a kabsatna a lalaki, ni Kemuel nga ama ni Aram,
Aha ha bụ Uz, onye bụ ọkpara, na Buz nwanne ya, Kemuel bụ (nna Aram),
22 ni Kesed, ni Hazo, ni Pildas, ni Jidlap ken ni Betuel.
Kesed, Hazọ, Pildash, Jidlaf na Betuel.”
23 Ni Betuel ti ama ni Rebecca. Dagitoy dagiti walo nga inyanak ni Milka kenni Nahor, a kabsat a lalaki ni Abraham.
Betuel mụrụ Ribeka. Milka mụtaara Nahọ, nwanne Ebraham ụmụ ndị ikom asatọ ndị a.
24 Inyanak met ti inkabbalayna nga agnagan iti Reuma, da Teba, Taaz ken Maaca.
Iko ya nwanyị, onye aha ya bụ Reuma, mụkwaara ya ụmụ ndị ikom. Ha bụ Teba, Gaham, Tahash na Maaka.

< Genesis 22 >