< Ester 10 >
1 Kalpasanna, nangituyang ni Ari Ahasuero iti panagbuis kadagiti daga ken kadagiti daga iti igid ti baybay.
Eze bụ Ahasuerọs na-anakọta ụtụ site nʼaka ndị niile bi nʼalaeze ya tutu ruo nʼọnụ mmiri osimiri ebe alaeze ahụ sọtụrụ.
2 Amin dagiti nagun-od ti pannakabalinna ken kinamaingelna, agraman ti pakasaritaan ti kinatan-ok ni Mardokeo, isu a nangitan-okan kenkuana ti ari, naisurat dagitoy Iti Libro dagiti Cronicas dagiti Ari ti Media ken Persia.
Ma ọrụ ukwu na ọrụ niile ọ rụrụ, ya na ihe niile gbasara ịdị ukwuu nke Mọdekai, na ugwu niile eze nyere ya, ha niile ka e dere nʼime akwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Midia na Peshịa mere nʼoge ọchịchị ha.
3 Ni Mardokeo a Judio ti maikadua iti saad ni Ari Ahasuero. Natan-ok isuna kadagiti Judio ken nalatak kadagiti adu a kakabsatna a Judio, gapu ta kinalikagumanna ti pagsayaatan dagiti tattaona, ken nagsao para iti kinatalna dagiti amin a tattaona.
Mọdekai, onye Juu, bụ onye na-esote eze Ahasuerọs nʼọkwa. Ọ bụ onye dị ukwuu nʼetiti ndị Juu, na onye ndị Juu ibe ya na-asọpụkwara, nʼihi na ọ na-elenye anya nʼihe gbasara udo ndị Juu. Ọ bụkwa onye na-ekwuchite ọnụ nʼihe banyere ọdịmma nke ndị Juu niile.