< Deuteronomio 34 >
1 Simmang-at ni Moises idiay Bantay Nebo manipud iti patad ti Moab, iti tapaw iti Pisga, a ballasiw ti Jerico. Ket impakita kenkuana ni Yahweh dagiti amin a daga ti Galaad inggana iti Dan,
Mgbe ahụ, Mosis sitere na mbara ala Moab rigoruo nʼelu nʼugwu Nebo, ruo nʼelu Pisga, nke dị na ncherita ihu Jeriko. Nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ala ahụ niile anya site na Gilead ruo Dan;
2 ken amin a Neptali, ken ti daga ti Efraim ken ti Manases, ken amin a daga ti Juda, agingga iti akin laud a baybay, ken ti Negev,
ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa.
3 ken iti patad iti tanap ti Jerico, ti Siudad dagiti Palma, inngana idiay Zoar.
Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa.
4 Kinuna ni Yahweh kenkuana, “Daytoy ti daga nga inkarik kada Abraham, Isaac, ken Jacob, kinunana, ‘Itedkonto daytoy kadagiti kaputotam.’ Pinalubosanka a mangkita iti daytoy babaen kadagiti matam, ngem saankanto a mapan idiay.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’ Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”
5 Isu a natay ni Moises nga adipen ni Yahweh idiay daga ti Moab, kas inkari ti sao ni Yahweh.
Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru.
6 Intabon isuna ni Yahweh iti tanap iti daga ti Moab a kasupadi ti Bet-Peor, ngem awan ti makaammo no sadino ti ayan ti tanemna inggana kadagitoy nga aldaw.
Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị.
7 Agtawen ti 120 ni Moises idi natay isuna; saan a nakudrep ti matana, wenno kimmapsut ti bagina.
Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma.
8 Nagladingit dagiti tattao ti Israel para kenni Moises iti tallo pulo nga aldaw kadagiti tanap ti Moab, ket nalpasen dagiti aldaw a panagladingit para kenni Moises.
Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị.
9 Napnoan iti espiritu ti kinasirib ni Josue nga anak ni Nun, ta impatay ni Moises dagiti imana kenkuana. Dimngeg dagiti tattao ti Israel kenkuana ket inaramidda ti imbilin ni Yahweh kenni Moises.
Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe, nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis.
10 Awanen ti timmaud a profeta iti Israel a kas kenni Moises, nga am-ammo ni Yahweh iti rupan-rupa.
Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis, onye ya na Onyenwe anyị kparịtara ụka ihu na ihu,
11 Awan a pulos ti aniaman a profeta a kas kenkuana kadagiti amin a pagilasinan ken nakakaskasdaaw nga imbaga ni Yahweh kenkuana nga aramidenna iti daga ti Egipto, kenni Paraon, ken kadagiti amin nga adipenna, ken amin a dagana.
onye mere ihe ịrịbama ndị a niile, rụọkwa ọrụ ebube niile nke Onyenwe anyị ziri ya ka o mee nʼIjipt, nʼihu Fero, na ndị ozi ya niile, nakwa nʼala ahụ niile.
12 Awan a pulos ti aniaman a profeta a kas kenkuana kadagiti amin a naindaklan, nakabutbuteng nga aramid nga inaramid ni Moises iti imatang ti entero nga Israel.
Nʼihi na o nwebekwaghị onye ọzọ gosirila ike dị oke egwu, maọbụ rụọ ọrụ dị oke egwu ụdị nke Mosis rụrụ nʼihu ndị Izrel niile.